Go to full page →

Ita Ụta Nke Nmehie OdU 53

Nzọ-ụkwụ mbụ nke dị n’idozi agbata madụ na Chineke bụ ima nmehie ikpe n’obi. “Nmehie bụ nmebi-iwu.” “Site n’iwu ka a nāmara nmehie.” lJọn 3:4; Ndị Rom 3:20, N’ụzọ imara njehie ya, onye nmehie aghaghi inwale omume ya site n’enyo nke Chineke nke nēgosi izu-oke nke ezi-agwa ma nyerekwa ya aka ileta ntụpọ nile nke onwe ya. OdU 53.2

Iwu ahụ nēkpuhere madụ nmehie ya, kama ọ dịghị eweta nmezi ihe. Ọ nēkwupụta na ọnwụ bụ òkè nke onye nmebi iwu. Naamị ozi-ọma nke Kraist pụrụ ime ka o nwere onwe ya site n’ọmụma-ikpe ma-ọbụ nmerụ nke nmehie. Ọ ghaghị ichegharikuru Chineke onye e mebiworo iwu Ya ma nwekwa okwukwe n’ime Kraist, site n’ọlụ ndozi nke ọbara ya. Site otua nweta “mgbaghara nmehie nile nke e mehieworo n’oge gara-aga” (Ndị Rom 3:25) ma bụrụkwa nwa nke Chineke. OdU 53.3