Go to full page →

Nduhie Kachasị Nduhie Niile OdU 86

Dịka ihe ngosi lara elu karịa bụ nke nduhie, Setan na onwe ya ga-apụta ihe dịka Kraịst. Nzukọ Chineke kwenyere oge nile na ọbịbịa abụa nke Jisọs bụ ebe mgbam ọsọ olile anya ahụ dị ngọzi. N’oge ahụ, onye nduhie uku ahụ ga-eme ka ndị mmadụ kwenye na Kraịst na onwe Ya abịawo. Setan ga-egosipụta onwe ya dịka Eze na-enwu ihe karịa ihe anya mmadụ pụrụ ịnagide, dịka ụzọ Jọn jiri kọwa ụdịdị nke Ọkpara Chineke n’ime nkpughe (Nkpughe 1:13-15). OdU 86.2

Ebube nke na-ekpuchi ya karịrị ihe anya mmadụ pụrụ ịnwụ anwụ hụtụrụla. Iti mkpu nke mmeri ga-ada ụda ebe nile sị “Kraịst abịaghachiwo”. Ụmụ mmadụ ga-akpọ isi n’ala nye ya. Ọ ga-eweli aka ya elu ma gọzie ha. Olu ya dị nwayọ ma jupụta na ụda ụtọ. Site na ụda olu ya jupụtara na ebere, ọ ga-ekwupụta ụfọdụ n’ime eziokwu nke Onye Nzọpụta kwuru na Baịbụlụ. Ọ ga-agwọ ọrịa dị iche iche, ma tụnyere ọnọdụ ya ịdịka Kraịst, ọ ga-asịkwa na ya emewo ka ụbọchị Sọnde bụrụ ụbọchị izu ike. Ọ ga-ekwu sị na ndị nile na-edebe Sabat nke ụbọchị nke asaa na-ekwulụ aha ya. Nke a bụ ebe nduhie tara akpụ. Ihe ka na ọnụọgụgụ ga-ege ntị nabata nduhie dị otu a, ma we sị, nke a bụ “ikike uku nke Chineke” (Ọlụ Ndị Ozi 8:10). OdU 86.3