Isi Nke 12—Ndị N’eso Ụzọ Kraist
N‘ike dị ukuu ndị n’eso ụzọ ya kwusara onye-nzọpụta ahụ a kpọgburu nke sikwa n’ọnwụ bilie. Ha gwọrọ ndị ọria, ọbụna onye nke daworo ngwọrọ mgbe niile ka e weghachiri na ọnọdụ zuru oke, wee sorokwa ha banye n’ime ụlọ nsọ, na eje ije na a wulikwa elu n’etọkwa Chineke n’iru ọha madụ nille. Akụkọ a gbasara, ndị madụ wee malite ịgbakọ gburu-gburu ndị n’eso ụzọ Jisọs. ọtụtụ gbakọrọ n’otu ebe, n’ihe iju-anya banyere ọgwụwọ ahụ nke a lụworo.NUA 78.2
Mgbe Jisọs nwụrụ ndị isi nchụ-àjà chere na ọdịghị ihe iribe-àmà ọzọ a g’ahụ n’etiti ha, na ọgbaghara niile g’anwụ, na ndị madụ g’alaghachikwa na omenàlà ha. Kama, lee! N’etiti ha kwa, ndị n’eso ụzọ ya n’alụkwa ọlụ-ebube, nke mere na ndị madụ jupụtara n’ihe-itunanaya, n’elekwa ha anya nke n’enweghị ọnụ okwu. A kpọgịdewori Jisọs n’elu obe, ma o juru ha anya ebe ndị n’eso ụzọ ya sitere nweta ike nka. Mgbe o n’adị ndụ ha chere na ọ n’enye ndị n’eso ụzọ ya ike; ma mgbe Jisọs nwụrụ, ha lere anya na ihe iribama ndị ahụ g’agwụsị. Pita matara iju-anya ha, wee sị ha, unu ndị-ikom nke Izrel, gịnị mere unu ji nwe ihe iju-anya na nka? M’ọbụ gịnị mere unu n’elegịde anyị anya otua, dịka a gasi na ọbụ n’ike m’ọbụ ịdị-nsọ nke onweanyị ka anyị mere nwoke a ka o jee ije? Chineke nke Abraham, na nke Azik, na nke Jekob, bụ Chineke nke Nna anyị ha nyere Ọkpara ya otuto bụ Jisọs, onye unu nyefeworo ma gọnarikwa ya n’iru Pailet, mgbe o kpebiri itọpụ ya. Kama unu gọnarịrị onye nsọ ahụ, na onye ezi-omume ahụ, ma họrọ ka a tọpụrụ unu onye ogbu madụ, wee gbuekwa Eze onyenwe ndụ, bụ onye Chineke meworo ka O si na ndị nwụrụ-anwụ bilie, nke anyị onwe-anyị bụkwa ndị àmà ya. Pita gwara ha na ọ bụ okwukwe e kwere na Jisọs kpatara ọgwụgọo a zuru-oke nye nwoke a dara ngwọrọ na mbụ.NUA 79.1
Ndị isi nchụ-àjà na ndị okenye apụghị inagịde okwu ndịa. Ha jidere ndị n’eso ụzọ ya ma tinye ha n’ụlọ nkpọrọ. Kama ọtụtụ igwe madụ chegharịrị, ma kwerekwa na nbilite n’ọnwụ na nrigo n’eluigwe nke Kraist, site n’inụ naanị otu nkparite ụka n’ọnụ ndị n’eso ụzọ ya. Nka nyere ndị isi nchụ-àjà na ndị okenye nsogbu n’obi. Ha gburu Jisọs ka uche ndị madụ tụgharia n’ebe ha onwe ha nọ; kama okwu a adiwọkwa njọ ugbua karịa na mbụ. Ndị n’eso ụzọ Jisọs n’ebo ha ebubo na mbara na ọ bụ ha gburu Ọkpara nke Chineke, ma ha a pụghị imata ụsọtụ nke ihe ndịa, m’ọbụ ka ndị madụ g’esi ele ha anya. Ọ g’adi ha ezi-mma igbusi ndị n’eso ụzọ Jisọs kama ha anwaghị ime nka n’ihi ha n’atụ ụjọ ka ndị madụ ghara itụ ha nkume. Ha kpọrọ ndị n’eso ụzọ ya, e wee kute ha n’iru ndị nzukọ. Ọbụna ndị ahụ ji ọnụ-ọkụ n’obi tisie mkpu ike ka a ghọọ onye Ezi omume ahụ ọbara nọkwa n’ebe ahụ. Ha a nụwọkwarị ngọnari nke Pita gọnarịrị Jisọs n’ụjọ, site n’ikpọ-iyi na idu-isi, mgbe a n’ebo ya ebubo na ọ bụ otu n’ime ndị n’eso ụzọ Jisọs. Ha chekubere ikwanye Pita ụjọ; kama Pita a buruwo onye chegharịrị echegharị ugbua. Ohere ka e nyere Pita ugbua ibuli Jisọs elu. Ọ gọnariwo ya na mbụ; kama ugbua ọ pụrụ iwezuga ntụpọ ahụ nke omume ụjọ na ngọnarị ya kpatara, ma nye áhà ahụ otuto bụ nke ọ gọnariworo. Ọdịghịkwa ụjọ nke adịghị-ike n’achị achị n’ime ndụ Pita mgbe ahụ; kama site na nkwuwa-okwu dị nsọ, na ike nke Mụo-nsọ, o jiri anya-ike kwupụtara ha na Ọ bụ n’áhà Jisọs Kraist nke Nazaret, onye ha kpọgburu, onye Chineke kulitekwara site na ndị nwụrụ-anwụ, Ọ bụkwa site na ya ka nwoke nka n’eguzo n’iru unu n’izu oke. Nka bụ nkume ahụ nke unu ndị n’ewu ụlọ jụrụ, nke ghọkwara isi-nkuku ụlọ. Ọdịghịkwa nzọpụta dị n’ebe ọzọ; n’ihi na ọdịghị áhà ọzọ dị n’okpụrụ eluigwe e nyeworo n’etiti madụ, nke a g’esite na ya zọpụta anyị.NUA 80.1
Ndị madụ ahụ nwere ihe iju-anya na oke nkwụwa-okwu nke Pita na Jọn. Ha hụtara ha dịka ndị ha na Jisọs nọworo; n’ihi na ịdị ukuu ha, na omume anya-ike ha ka a pụrụ iji tunyere nke Jisọs mgbe ndị gburu ya n’akpagbu Ya. Site n’otu ile anya nke nwụte na iri-uju, Jisọs baara Pita mba mgbe ọ gọnarisịrị ya, ma ugbua ka ọ n’ekwupụta onye-nwe ya, Pita natara ngọzi dịka onyinye nnọyere nke Jisọs, a gbajuru ya site n’ike nke Mụo-nsọ.NUA 81.1
Ndị isi nchu-àjà a nwaghị anwa igosi ikpọ asị ha nwere n’ebe ndị n’eso ụzọ ya dị. Ha nyere ha iwu ka ha pụa n’otu akụkụ site n’ọgbakọ ahụ ha wee rurite ụka n’ime onwe ha, n’asi, gịnị ka anyị g’eme ndị ikom ndịa? N’ihi na n’ezie ihe iriba-àmà tụrụ n’anya ka ha meworo n’ụzọ pụtara ihe nye ndị nile bi na Jerusalem, nke anyị n’apụghịkwa ịgọnarị. Ha tụrụ ụjọ ikwe ka ọlụ-ọma nka gbasaa. Ọbụrụ na ọ g’agbasa, ike ha ga efunarị ha, a g’elekwa ha anya na ọ bụ ha gburu Jisọs. Naanị ihe ha jisịrị ike mee bụ ibara ha mba, na inye ha iwu ka ha ghara ikwusakwa n’áhà nke Jisọs m’ọbụghị otua na ha g’anwụ. Kama Pita ji anya-ike kwue sị na ha ga- ekwu naanị ihe ha hụworo ma nụkwa.NUA 81.2
Site n’ike nke Jisọs ndị n’eso ụzọ ya nọgịdere na agwọ onye ọbụla nwere ihe-otiti na ndị ọria niile e kuteere ha. Nka sogburu ndị-isi nchụ-àjà na ndị okenye, na ndị niile jikọtara aka na ha. Ọtụtụ madụ n’etinyekwa áhà ha n’anarakwa ọkọlọtọ nke onye-nzọpụta ahụ a kpọgburu, nke bilikwara ma laakwa n’eluigwe. Ha kpọchibidoro ndị-ozi ahụ n’ụlọ-nkpọrọ, na olileanya na aghara ndịa g’ebilata. Ekwensu ñụrịrị, ndị mụọ ọjọọ ya ñụkwara ọñụ nmeri; kama ndị mụọ-ozi nke Chineke ka e zipụrụ imeghe ụzọ ụlọ-mkpọrọ, ma, na imegịde atụmatụ nke onye isi nchụ-àjà na ndị okenye, wee gwa ha ka ha banye n’ụlọ nsọ ma kwusaa okwu niile nke ndụa. Nzukọ ahụ gbakọrọ wee zipụ ozi ka a kpọta ndị-nkpọrọ ahụ. Ndị isi nke ụlọ-nkpọrọ ahụ meghere ọnụ-ụzọ niile nke ụlọ mkpọrọ ahụ; kama ndị mkpọrọ ahụ ha n’achọ a nọghịkwa n’ebe ahụ. Ha wee laghachikuru ndị nchụ-àjà na ndị okenye, wee gwa ha, na o bụ ezie na ha hụrụ ụlọ nkpọrọ ka a gbachiri ya nke oma, na ọbụna ndị nche ka ha nọkwa n’eche ọnụ-ụzọ ndịa nche, nke oma; kama mgbe anyị megheworo ụzọ ọdịghịkwa onye ọbụla anyị hụrụ nime ya. Mgbe ahụ ka otu onye batara wee gwa ha, si, lee ndị ahụ unu tinyere n’ụlọ-nkpọrọ n’eguzokwa n’ụlọ-nsọ, n’ezikwa ndị madụ ihe. Mgbe ahụ ka onye-isi agha na ndị-ìsì jere, wee kuru ha bia n’udo; n’ihi na ha tụrụ egwu ndị madụ ka a ghara itu ha nkume. Ma mgbe ha kuuru ha bia, ha chere ha n’iru nzukọ ahụ; na onye-isi ndị nchụ-àjà jụrụ ha ajụjụ si, ọbụ anyị e nyeghị unu iwu ka unu ghara izi ihe n’áhà nka? Ma lee, Jerusalem e jupụtawo n’ozizi unu, ma unu na achọkwa iweta ọbara nwoke a n’isi anyị.NUA 82.1
Ha bụ ndị iru abụa, n’ahụkwa otuto madụ n’anya karị ihụ Chineke n’anya. Obi ha sikwara ike, na ọbụna olu ebube ukuu ahụ nke ndị-ozi lụrụ bụ naanị ikpasu ha iwe. Ha matara na ọbụrụ na ndị n’eso ụzọ ya n’ekwusa Jisọs, nkpọgbu a kpọgburu ya, nbilite n’ọnwụ ya na nlaghachi o laghachiri n’eluigwe, nka ga arụgịdesi omụma-ikpe ike narụ ha, ma kpọkwa ha ndị gburu ya. Ha adịghịkwa na njikere ugbua ịnakwere ọbara Jisọs, dịka mgbe ahụ ha tisịrị mkpu-ike si; ka ọbara ya dị n’isi anyị, na n’isi ụmụ anyịkwa.NUA 83.1
Ndị ozi ahụ ji nkwụwa-okwu kọwapụta na ha kwesịrị iña Chineke ntị karịa madụ. Pita sịrị, Chineke nke Nna anyị ha kpọlitere Jisọs, onye unu gburu ma kwụbakwa n’osisi. Ọ bụkwa Ya ka Chineke buliworo elu site n’aka nri ya ịbụ Onye-eze na Onye-nzọpụta, n’ilụ nchegharị nye Izrel, na ngbaghara nmehie niile. Ma anyị bụkwa ndị-àmà ihe ndịa niile, ọ bụkwa otu aka ahụ n’ebe Mụo-nsọ dị onye Chineke nyeworo ndị niile n’ege Ya ntị. Mgbe ahụ ka a kpasuru ndị ogbu-madụ ahụ iwe nke ukuu. Ha chọkwara itinye aka ha nọbara ọzọ site n’igbu ndị-ozi ahụ. Mgbe ha n’atu ụkpụrụ ime nka, ka e zipụrụ otu mụọ-ozi site n’ebe Chineke nọ biakuru Gamaliel, ikpali obi ya ka ọ dụa onye-isi nchụ-àjà na ndị-ọchịchị ọdụ. Gamaliel wee sị, rapụnụ ndị-ikom ndịa, ka ha laa; n’ihi na ọbụrụ na ndụmọdụ nka m’ọbụ ọlụ nka sitere n’aka madụ, ọ ghaghị ịda; kam’ọbụrụ na o sitere n’aka Chineke unu apụghị ikwatu ya, mọbụghị otua, ọ g’erukwa na ọ bụ Chineke ka unu n’alụso ọgụ. Ndị mụọ-ọjọọ n’akpalikwa ndị nchụ-àjà na ndị-okenye ibibi ndụ ndị-ozi ahụ kama Chineke zipụrụ mụọ-ozi ya igbochi ya, site n’iweli olu out-onye à márá áhà ya n’etiti ha ikwuchitere ọnụ ndị n’eso ụzọ ya.NUA 83.2
Ọlụ nke ndị-ozi ahụ a kagwụghị. A g’akpọtakwa ha n’iru ndị-eze, ịgba-àmà áhà nke Jisọs, na ikwupụta ihe ndịa niile ha hụworo ma nụkwa. Kama tutu ndị isi nchụ-àjà na ndị okenye ndịa arapụ ha, ha tiri ha ihe ma nyekwa ha iwu ka ha ghara ikwu okwu ọzọ n’aha nke Jisọs. Ha rapụrụ nzukọ ahụ n’eto Chineke na a gụrụ ha dịka ndị tozuru-oke ihụ ahụhụ n’ihi áhà ya dị oke ọnụ-ahia. Ha gakwara n’iru n’ozi ha, n’ekwusakwa ozi ahụ n’ụlọ nsọ na n’ụlọ niile ebe a kpọrọ ha. Okwu Chineke wee n’eto eto n’amubakwa. Ekwensu a kpaliwọkwa ndị-isi nchụ-àjà na ndị okenye ịzụrụ ndị ọchị-agha nche ndị Rom n’ọlụ ịgba àmà-ụgha na ndị n’eso ụzọ ya zuru arụ Jisọs n’ohi mgbe ha n’ararụ ụra. Site n’okwu-ụgha nka ha lere anya ikpuchi ezi-okwu ahụ niile; ma lee, site nakụkụ niile gburu-gburu ha ka ọtụtụ ihe-ngosi ha dị ukuu nke nbilite n’ọnwụ Jisọs n’asọpụta. Ndị n’eso ụzọ ya ji anya-ike n’ekwusa ya, n’egosipụtakwa ihe niile nke ha hụrụ ma nụkwa, ma sitekwa n’aha Jisọs ha lụkwara ọlụ ihe-iribama ha dị ukuu. Ha tukwasịkwara ọbara Jisọs n’isi ndị jikere inara ya, mgbe e nyere ha ohere inwe ike megide Ọkpara Chineke.NUA 84.1
A hụrụ m na arọpụtara ndị mụọ-ozi nke Chineke inwe ezi nlekụrụ-anya, na ichekwa ezi-okwu ndịa dị nsọ, dịkwa nkpa nke g’abụ ihe nkonye-aka nke ndị n’eso ụzọ Kraist n’ọgbọ niile.NUA 85.1
Mụo-nsọ dakwasịrị ndị-ozi ahụ n’ụzọ pụrụ iche, bụ ndị n’agba àmà nkpọgịde a kpọgịdere Jisọs n’obe, mbilite n’ọnwụ na ilaghachi n’eluigwe ya — bụ eziokwu ha dị nkpa nke kwesịrị ibu olileanya nke Izrel. Madụ niile kwesịrị ilegịde Onye-nzọpụta nke ụwà anya dịka olileanya naanị ha nwere, ma jeekwa ije nụzọ ahụ nke Jisọs mehere site n’àjà ahụ nke o ji ndụ ya chụọ, ma debekwa iwu Chineke wee dị ndụ. A hụrụ m amamihe na ịdị mma nke Jisọs n’inye ndị n’eso ụzọ ya ike ka ha buru otu ọlụ ahụ nke mere ndị juu jiri kpọ ya asị ma gbuekwa ya. Ha nwere ike e nyere ha megide ọlụ niile nke Ekwensu. Ha mere ihe-iribama na ihe itu-n’anya ha site n’aha Jisọs, onye e mere ihere, ma sitekwa n’aka ndị nmehie gbue ya. Ọkpụrụkpụ ihè na ebube gbara gburu-gburu n’oge ọnwụ na nbilite n’ọnwụ Jisọs nke mere ka ezi-okwu ndịa bụrụ ihe n’adịghị anwụ-anwụ, na Jisọs bụ onye-nzọpụta nke ụwà.NUA 85.2