Go to full page →

Nnapụta N’ihe Ize Ndụ Dị N’aka Jisọs OdU 18

Anyị nwere ike ịchọta ebe mgbaba na nnapụta n’ike ukuu nke Onye Mgbapụta anyị. Anyị na-etinye igodo na ihe ndị eji agbachi ụzọ n’ụlọ anyị ka anyị wee kpuchie onwe anyị pụa n’aka ajọ mmadụ, ma ọ na-ara anyị ahụ iche banyere ndị mmụọ ọjọọ, bu ndị anyị na-enweghị mgbochi ọ bụla megide obubu agha ha n’ike nke onwe anyị. Ọ bụrụ na ekwenye ha, ha nwere ike gbasasịa echiche anyị, mekpa anyị arụ n’anụ arụ, bibie ihe nweta anyị na ndụ anyị. Ma ndị ahụ ndị na-eso Kraịst bụ ndị e zobere nke ọma n’okpuru nlekọta Ya. Ndị mmụọ ozi ndị ka n’ike ka a na-ezite ichebe ha. Ajọ onye ahụ apụghị ibibi ọta nke nchebe ahụ bụ nke Chineke ji gbaa ndị Ya gburugburu. OdU 18.2