Go to full page →

Ndị Mmụọ Ozi Ndị Na-Edu Edu OdU 14

Onye na-eso ụzọ Kraịst ọ bula nwere mmụọ ozi a kpọpụtara ịbụ onye na-edu ya. “Mmụọ ozi nke Jehova na-agba ụlọ ikwu ya gburu gburu ndị na-atụ egwu Ya, O we dọpụta ha. N’ikwu okwu banyere ndị kwere na Ya, Onye Nzọpụta sịrị: “N’eluigwe, ndị mmụọ ozi ha na-elegide iru Nna m anya mgbe nile” (Abụ Ọma 34:7; Matiu 18:10). Ndị nke Chineke, bụ ndị nọ mgbe nile na-ezute ọnụma na-adịghị ararụ ụra nke onye isi nke ọchịchịrị ka e kwere nkwa nchebe na-adịghị akwụsị akwụsị nke ndị mmụọ ozi. Nkwa kwesiri ka atụkwasị ya obi dị otu a ka e kwere ha, ka ha we nwee ike izute ngwa ọlụ na ndị ozi nke Ekwensu, bụ ndị karịrị akarị n’ọnụ ogụgụ, ndị na-achọsi ike in we mmeri, ndị ike na-adịghị agwụkwa. OdU 14.2