Ndị nile họọrọ Ekwensu dịka onye ndu ha a dịghị na njikere ibanye n’iru nke Chineke. Nganga, aghụghọ, ime mpụ, aka ike, a bụrụwo ihe nānọgidesike n’omume ha. Ha pụrụ ịbanye n’elu-igwe ibi ndụ ebighi-ebi ha na ndị ahụ nile ha kpọworo asị n’elu ụwa? Ọ dịghị mgbe onye ụgha gēkwenyere ezi-okwu; ndụ umeala agaghị amasị onye onwe ya juru afọ; onye gbagọrọ-agbagọ agaghị anabata ndụ dị ọcha; ịhụnanya nke n’achọghị ihe nke aka ya agaghị adọrọ uche onye onwe ya nāchị. Ihe obi-ụtọ gịnị ka eluigwe pụrụ inye ndịa mikpuworo nime ọchịchọ nke onwe-onye? OdU 34.4
Ndịa nile obi ha juputara n’ịkpọ-asị megide Chineke, megidekwa ezi-okwu na ịdị nsọ, ha pụrụ ịnọkọ ha na ụsụụ nile nke elu-igwe ma sorokwa ha n’abụ nile nke òtutò? Ọtụtụ afọ nke nnwale na nmezi-ihe ka e nyeworo ha, kama ha enyeghị uche ha n’ihụ ndụ dị ọcha n’anya. Ọ dịghị mgbe ha mụtara asụsụ nke eluigwe. Ma ugbua oge agafewokwa. OdU 35.1
Ndụ nke nnupu-isi megide Chineke emewo ha ndị n’ekwesịghịkwa elu-igwe. Idị-ọcha na udo ya gābụ ihe mgbu nye ha; ebube nke Chineke gābụ ọkụ nērepịa-erepịa. Ha gāchọkwa ịgbapụ site n’ebe ahụ dị-nsọ ma nabatakwa mbibi karị, ka ọ bụrụ na e zoturu ha site n’iru onye ahụ nke nwụworo ịgbapta ha. Ụsọtu ndụ nke ndị ajọ-omume ka e debeworo site na nhọrọ nke onwe ha. Ngụpụ a gụpụrụ ha site n’eluigwe bụ nhọrọ nke onwe ha, ma bụrụkwa site n’izi-ezi na ebere n’akụkụ nke Chieneke. Dịka miri nke uju miri, ọbụna ọkụ nēre ere nke oke ụbọchị ahụ nēkwupụta mkpebi ikpe nke Chineke na ndị ajọ-omume enweghị ka a gwọta ha. Uche obi ha ka ha mere site n’iwezuga onwe ha. Mgbe ndụ gwụsịrị, o wee bụrụ na oge agafewokwa itụgharị uche ha site na mmebi-iwu rue n’ige ntị, ma-ọbụkwa site n’ikpọ asị rue n’ịhụnanya. OdU 35.2