Go to full page →

Ụsọtụ Ndụ N’ụdị Abụa OdU 35

“Ụgwọ-ọlụ nke mmehie bụ ọnwụ; ma onyinye-amara nke Chineke bu ndụ ebighi-ebi nime Kriast Jisọs Onyenwe-anyi.” Ka ndụ nābụ ihe nketa nke ndị ezi-omume, ọnwụ bụkwa oke nke ndị ajọ-omume. “Ọnwụ nke abụa ahụ” ka e dotere dịka ihe atụ n’ụzọ nke ọzọ megide ndụ ebighi-ebi Ndị Rom 6:23; Lee Mkpughe 20:14. OdU 35.3

Nihe nlụpta nke nmehie Adam, ọnwụ gafere ụmụ-madụ nile. Madụ nile n’otu aka ahụ nāridaru ala ili. Ma sitekwa n’atụmatụ nke nzọpụta, madụ nile ka a g’akpọpụtakwa site n’ili ha: “Mbilite n’ọnwụ gādị, ma nke ndị ezi-omume ma nke ndị ajọ-omume”, “nihi na dịka ọnwụ dịrị madụ nile nime Adam, ọbụkwa otua ka a gēme ka madụ nile dị ndụ nime Kraist.” Kama e mere ka ọdị-iche dị n’etiti nkega abụa ndịa e wepụtara: “Ndị nile nọ n’ili gānụ olu Ya, ha gāpụtakwa; ndị ahụ meworo ezi ihe, gāba na mbilite n’ọnwụ nke ndụ; ma ndị ahụ nke meworo ajọ ihe, gāba na mbilite n’ọnwụ nke ọmụma-ikpe” Ọlụ ndị-ozi 24:15; Ndị lKọrint 15:22; Jọn 5:28, 29. OdU 36.1