Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Adịghị Na Njikere Ịbanye Elu-Igwe

    Ndị nile họọrọ Ekwensu dịka onye ndu ha a dịghị na njikere ibanye n’iru nke Chineke. Nganga, aghụghọ, ime mpụ, aka ike, a bụrụwo ihe nānọgidesike n’omume ha. Ha pụrụ ịbanye n’elu-igwe ibi ndụ ebighi-ebi ha na ndị ahụ nile ha kpọworo asị n’elu ụwa? Ọ dịghị mgbe onye ụgha gēkwenyere ezi-okwu; ndụ umeala agaghị amasị onye onwe ya juru afọ; onye gbagọrọ-agbagọ agaghị anabata ndụ dị ọcha; ịhụnanya nke n’achọghị ihe nke aka ya agaghị adọrọ uche onye onwe ya nāchị. Ihe obi-ụtọ gịnị ka eluigwe pụrụ inye ndịa mikpuworo nime ọchịchọ nke onwe-onye?OdU 34.4

    Ndịa nile obi ha juputara n’ịkpọ-asị megide Chineke, megidekwa ezi-okwu na ịdị nsọ, ha pụrụ ịnọkọ ha na ụsụụ nile nke elu-igwe ma sorokwa ha n’abụ nile nke òtutò? Ọtụtụ afọ nke nnwale na nmezi-ihe ka e nyeworo ha, kama ha enyeghị uche ha n’ihụ ndụ dị ọcha n’anya. Ọ dịghị mgbe ha mụtara asụsụ nke eluigwe. Ma ugbua oge agafewokwa.OdU 35.1

    Ndụ nke nnupu-isi megide Chineke emewo ha ndị n’ekwesịghịkwa elu-igwe. Idị-ọcha na udo ya gābụ ihe mgbu nye ha; ebube nke Chineke gābụ ọkụ nērepịa-erepịa. Ha gāchọkwa ịgbapụ site n’ebe ahụ dị-nsọ ma nabatakwa mbibi karị, ka ọ bụrụ na e zoturu ha site n’iru onye ahụ nke nwụworo ịgbapta ha. Ụsọtu ndụ nke ndị ajọ-omume ka e debeworo site na nhọrọ nke onwe ha. Ngụpụ a gụpụrụ ha site n’eluigwe bụ nhọrọ nke onwe ha, ma bụrụkwa site n’izi-ezi na ebere n’akụkụ nke Chieneke. Dịka miri nke uju miri, ọbụna ọkụ nēre ere nke oke ụbọchị ahụ nēkwupụta mkpebi ikpe nke Chineke na ndị ajọ-omume enweghị ka a gwọta ha. Uche obi ha ka ha mere site n’iwezuga onwe ha. Mgbe ndụ gwụsịrị, o wee bụrụ na oge agafewokwa itụgharị uche ha site na mmebi-iwu rue n’ige ntị, ma-ọbụkwa site n’ikpọ asị rue n’ịhụnanya.OdU 35.2

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents