Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ụsọtụ Ndụ N’ụdị Abụa

    “Ụgwọ-ọlụ nke mmehie bụ ọnwụ; ma onyinye-amara nke Chineke bu ndụ ebighi-ebi nime Kriast Jisọs Onyenwe-anyi.” Ka ndụ nābụ ihe nketa nke ndị ezi-omume, ọnwụ bụkwa oke nke ndị ajọ-omume. “Ọnwụ nke abụa ahụ” ka e dotere dịka ihe atụ n’ụzọ nke ọzọ megide ndụ ebighi-ebi Ndị Rom 6:23; Lee Mkpughe 20:14.OdU 35.3

    Nihe nlụpta nke nmehie Adam, ọnwụ gafere ụmụ-madụ nile. Madụ nile n’otu aka ahụ nāridaru ala ili. Ma sitekwa n’atụmatụ nke nzọpụta, madụ nile ka a g’akpọpụtakwa site n’ili ha: “Mbilite n’ọnwụ gādị, ma nke ndị ezi-omume ma nke ndị ajọ-omume”, “nihi na dịka ọnwụ dịrị madụ nile nime Adam, ọbụkwa otua ka a gēme ka madụ nile dị ndụ nime Kraist.” Kama e mere ka ọdị-iche dị n’etiti nkega abụa ndịa e wepụtara: “Ndị nile nọ n’ili gānụ olu Ya, ha gāpụtakwa; ndị ahụ meworo ezi ihe, gāba na mbilite n’ọnwụ nke ndụ; ma ndị ahụ nke meworo ajọ ihe, gāba na mbilite n’ọnwụ nke ọmụma-ikpe” Ọlụ ndị-ozi 24:15; Ndị lKọrint 15:22; Jọn 5:28, 29.OdU 36.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents