Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Ndọndọ Ukuu Ahụ

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nkie 9—Nkpọgịde N’obe Nke Kraist

    E nyefere Ọkpara Chineke n’aka ndị madụ ka a kpọgịde ya n’obe. Ha duuru ezi Onye-nzọpụta ahụ pụa. Ike gwusịrị ya; Ọ magbọkwara amagbọ n’ihi oke arụ-ụfụ na nhuju-anya, nke sitere n’ụtarị na ihe otiti niile ọ nataworo, n’agbanyeghị nka, ha bọkwasịkwara ya obe ahụ dị arọ nke ha ga akpọgịde ya n’elu ya n’oge n’eteghị anya. Ma Jisọs tụbọrọ n’okpuru ibu-arọ ahụ. Ugbo atọ ka ha bokwasịrị ya obe-arọ ahụ; ugbo atọkwa ka ọ tụbọrọ. Ha wee jide otu n’ime ndị n’eso ụzọ ya, nwoke nke n’adịghị kwupụta okwukwe ya n’ime Kraist nye ọha madụ, kama o kwenyere na ya. Ha bọkwasịrị ya obe ahụ, o wee buru ya rue n’ebe ahụ jọgburu onwe ya. Ụsụụ ndị mụọ-ozi ka e zipụtara irugharị n’elu ebe ahụ. Ụfọdụ n’ime ndị n’eso ụzọ ya sọkwara ya jerue kalvarị n’iri-uju, na ikwa akwa dị-ilu. Ha chetara mgbe Jisọs gbara ịnyịnya na nmeri banye n’ime Jerusalem, mgbe ha n’eso ya n’azu, n’etikwa mkpu-ọñụ, Hosanna n’ebe kachasị elu n’atụsakwa uwe ha n’okpọrọ-ụzọ, ọbụna igu-nkwu ọma ndị ahụ. Ha chere na Ọ gaara ewere àlà-eze ma chịa ọchịchị nke ụwà nàlà izrel. Ma lee ka ọnọdụ sịrị tụgharịa! Lee ka ebum-nuche ha si kụa afọ n’àlà! Ha sogịdere Jisọs; Ọ bụghịkwa n’anñuri ọñụ; Ọ bụghịkwa n’obi mmali-elu na olileanya nke obi-ụtọ; kama site n’obi nke e yiri-egwu na ida-mba ka ha ji nwayọ nwayọ, n’iru gbarụrụ-agbarụ n’eso ya bụ onye e meworo ihe ihere, wedakwa àlà, na onye nọ n’ọnụ ọnwụ.NUA 54.1

    Nne Jisọs nọkwa n’ebe ahụ. Obi ya tiwara n’iri-uju, nke naanị nne hụrụ nwa ya n’anya pụrụ inwe. Obi ya tiwara-etiwa nọgịdekwara n’olileanya, ya na ndị n’eso ụzọ ya, na nwa ya g’eme otu oke ihe-iribama, inapụta onwe ya site n’aka ndị n’egbu ya. Ọ nagịdeghịkwa echiche nke ịsị na Jisọs g’arapụrụ ha onwe ya n’ime arụ-ụfụ ka ha kpọgịde ya n’obe. Ma otu ọdị a kwadobere ihe niile werekwa Jisọs tụkwasi n’obe ahụ. E wetekwara hama na ntu. Obi ndị n’eso ụzọ ya tụbọrọ. Nne Jisọs nọkwa n’oke iri-uju n’enweghị nkasi obi, tụmadị mgbe ha gbatịrị Jisọs n’obe ahụ, ka ha kụgịde ya ajụo ntu ndị ahụ n’aka osisi, ndị n’eso ụzọ ya kuuru nne Jisọs pụa n’ebe ahụ, ka ọ ghara ịnụ ụda ntu ndịa, ka a n’akụba ha n’ọkpụkpụ n’arụ ya nke aka na ụkwụ ya dị nro. Jisọs atamughị ntamu ọbụla kama Ọ sụrụ-ude n’arụ ụfụ. Iru ya magbọkwara amagbọ, ajirija gbara ọkpụrụkpụ-ọkpụrụkpụ jupụtakwara n’iru ya. Ekwensu nọkwa n’añụrị n’ihi nhụju-anya ahụ nke Ọkpara Chineke n’agabiga, ma nọrọkwa n’ụjọ n’ihi na àlà-eze ya e funarịwo ya, na ọ ghaghị inwụ.NUA 55.1

    Ha bulitere obe ahụ elu mgbe ha kpọgịdesri Jisọs ntu na ya, ma were ike manye ya n’àlà ebe e gwuru ya, nka dọkasịrị anụ-arụ ya, kpatakwara ya oke arụ ụfụ. Ha mere ọnwụ ya ka ọbụrụ nke ihere karịsia. Ndị-ori abụa ka a kpọgịdekọrọ ha na ya n’obe, otu onye n’akụkụ abụa Jisọs. Ndị-ori ahụ ka a dọkpụụrụ n’ike, ma n’ihi ekweghị ekwe ha na ulịghịlị ha n’agba, e wee kee aka ha eriri n’azụ ma kpọgịde ha ntu n’obe ha. Ma Jisọs nyere onwe ya site n’obi dị ume-àlà. O meghị ka onye ọbụla were ike dọlaa aka ya azụ n’obe ahụ. Mgbe ndị-ori ahụ n’akpo ndị n’egbu ha iyi, Jisọs n’ime arụ mgbu ya nọ n’ekpere ndị-iro ya ekpere n’asị Nna, gbaghara ha, n’ihi na ha a mataghị ihe ha n’eme. Ọ bụghị naanị iri-uju nke anụ-arụ ka Jisọs nagịdere, kam’ọbụna nmehie niile nke ụwà nọ n’ubu Ya.NUA 56.1

    Ka Jisọs kwụ n’elu-obe ahụ, ụfọdụ ndị n’agafe n’akụkụ ebe ahụ n’ekwe n’isi ha, dika ha n’erudatara eze, n’asikwa ya, Gị onye n’akwatu ụlọ nsọ na ewulikwa ya na mkpụrụ ụbọchị atọ, zọpụta onwe gị ọbụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, si n’elu-obe rịdata. Ekwensu gwakwara Jisọs ụdị okwu ndịa na ọzara, ọbụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke. Ndị isi nchụ-àjà, na ndị-okenye na ndị ode-akwụkwọ jikwa ikwa-ya emo nasị, ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma ọ pụghị izọpụta onwe ya. Ọbụrụ na ọ bụ eze izrel, ka o si n’elu-obe ahụ ugbua rịdata, anyị g’ekwekwa na ya. Ndị mụọ-ozi na erụgharị n’ogịge ebe ahu a kpọgịdere ya n’obe ka a kpalikwara iwe ha mgbe ndị-ọchịchị n’eme ya ihe-ọchị, n’asi, ọbụrụ na o bụ Ọkpara Chineke ka ọ zọpụta onwe ya. Ọ bụ ọchịchọ ha n’ebe ahụ ịbịa napụta Jisọs; kama e kweghị ka ha mee otua. Ebum n’obi nke ozi ya fọdụrụ ntakịrị ka e mejupụta ya. Ka Jisọs kwufere n’elu-obe ahụ n’oge awa niile nke arụ-ụfụ ya, o chefughịkwa nne ya. Nne ya a nọghịkwa n’ebe dị anya site n’ogịge nke nhụju-anya ahụ. Ihe ozizi ikpeazụ nke Jisọs bụ nke sitere n’obi-ebere na ọdị-mma nke madụ. O legịdere nne ya anya onye obi n’etiwa etiwa n’iri-uju, legịdekwa Jọn anya bụ onye n’eso ụzọ ya a hụrụ n’anya. O wee gwa nne ya, nwanyị lee nwa gị. O sikwara Jọn, lee nne gị ma sitekwa n’oge awa ahụ, Jọn kuuru nne ya laa nụlọ nke aka ya.NUA 56.2

    Akpịrị kpọrọ Jisọs nkụ n’ime arụ-mgbu kama ha tụkwasịrị ya nkparị n’elu nkparị, site n’inye ya manya gbara-ụka na ogịri ka ọ ñụa. Ndị mụọ-ozi elegịdewo anya na ọnọdụ ọjọọ nkpọgịde n’obe nke ezi-onye-ndu ha, rue mgbe ha n’apụghi ilegịdekwa ya ọzọ, wee kpuchie iru ha. Ọbụna anyanwụ jụrụ ichakwasi ogịge ọjọọ ahụ. Jisọs tiri mkpu n’oke-olu, nke yiri-egwu n’obi ndị n’egbu ya, o gwụsiwo. Mgbe ahụ akwa-mgbochi nke ụlọ-nsọ gbawara site n’elu rue àlà, alà mara jijiji, oke nkume ha gbawakwara. Oke ọchịchịrị gbachikwara n’elu-àlà. Olileanya ikpeazu nke ndị n’eso ụzọ ya yiri dịka e hichapụrụ ya ehichapụ mgbe ahụ Jisọs nwụrụ. Ọtụtụ ndị n’eso ụzọ ya hụkwara ọnọdụ niile nke njhụju anya ya na ọnwụ ya, iko nke iri-uju ha jukwara eju.NUA 57.1

    Ekwensu a ñurịghị ọñụ-nmeri dịka o mere na mbụ. O cheworị na ọ pụrụ imebi atụmatụ nke nzọpụta; kama a tụrụ ya n’ụzọ dị omimi nke ukuu. Ma ugbua site n’ọnwụ Jisọs, ọ matara na ọ ghaghị inwụ n’ikpeazu, na àlà-eze ya ka a g’anapụ ya nye Jisọs. O nwere ọgbakọ ya na ndị mụọ-ozi ya. Ọ dịghị ihe o metara megide Ọkpara Chineke, ma ugbua ha aghaghị ilụsi ọlụ ike, ma sitekwa n’aghụghọ ha na ike megide ndị n’eso ụzọ Jisọs. Ha aghaghị igbochi ndị niile ha nwere ike ka ha rapụ inweta nzọpụta a zutaara ha site n’aka Jisọs. Site nime nka Ekwensu pụrụ inọgịde ịlụ ọlụ ya megide ọchịchị nke Chineke. Ọ bụkwa na ọdịmma nke onwe ya ịnapụ Jisọs ndị niile o nwere ike. N’ihi na nmehie niile nke ndị a gbapụtara site n’obara Kraist nwekwara, nmeri, n’ikpeazu ka a ga kwaghachiri onye ahụ nmehie sitere n’aka ya, bụ Ekwensu, ya onwe ya ga eburukwa nmehie niile ha, mgbe ndị niile ọzọ na anaraghị nzọpụta site n’aka Jisọs g’eburu kwa nmehie nke ha onwe ha.NUA 58.1

    Ndụ Jisọs bụ nke okomoko ụwà n’adịghị nime ya, m’ọbụ nke igosi aku n’uba. Ndụ nke ịdị umeàlà, na ịjụ onwe ya bụ ihe dị iche nke ukuu n’ebe ndụ nke ndị nchụ-àjà na ndị okenye, bụ ndị hụrụ ịdị-mma na nsọ nke ụwà n’anya, ma nnọgịdesike na ndụ dị nsọ nke Jisọs nọgịdere ibụ ihe ima-ụta nye ha, banyere nmehie ha nille. Ha kpọrọ ya asị n’ihi obi umeàla, ịdị nsọ na ịdị ọcha ya. Kama ndị ahụ kpọrọ ya asi ebe a, g’ahụ ya otu ụbọchị n’ịdị ukuu nke eluigwe, na n’ime oke ebube nke Nna ya. Ndị-iro gbara ya gburu gburu n’ụlọ-ikpe, bụ ndị n’achọ ighọ ya ọbara; kama ndị ahụ obi tara-miri bụ ndị ahụ tiri-mkpu sị, ka ọbara ya dị n’isi anyị na n’isi ụmụ anyị, g’ahụkwa ya dịka Eze e nyere ùgwù. Ụsụụ niile nke eluigwe g’eduru ya n’ụzọ ya na abụ nke nmeri, n’ike na oke-ebube, nye Onye ahụ e gburu, nke n’adị kwa ndụ ọzọ dịka onye-uku meriri emeri. Madụ dara ogbenye, n’adịghị ike, ndụ ya jọgbukwara onwe ya bụrụ ọnụ-miri n’iru Eze nke ebube ahụ, ọbụna mgbe iti-mkpu ọñụ nke nmeri arụrụ-àlà ha n’arị elu n’ime nkparị ha niile. Ha metọrọ iru ahụ site n’iti ya ọkpọ na aruru-àlà nile dị iche-iche nke jupụtara eluigwe nile n’ihe itụ-n’anya. Ha g’ahụkwa iru ahụ ọzọ n’igbu marà-márá dịka ihè-anyanwụ nke etiti-ụbọchị, na ha ga achọkwa ịgbapụ n’iru Ya. Kama iti-mkpu ọñụ nke nmeri arụrụ-àlà ahụ, ha g’eji oke ụjọ kwaa akwa dị-ilu n’ihi ya. Jisọs g’egosi aka ya abụa na àpà ntu ndị ahụ e jiri kpọgide ya n’obe. Àpà ihe-arụ ndịa e mere ya ka Ọ g’ebukwa mgbe niile. Ọnụkpata-ntu niile ọbụla gakọwapụta akụkọ nke mgbapụta dị-ebube nke madụ, na oke ọnụ-ahia nke eji zụta ya. Madụ ndị ahụ mara ube nagbịrị-akụkụ Onye ahụ nwe ndụ g’ahụ àpà ube n’arụ ya, ha ga akwakwa akwa n’obi-ntiwa banyere òkè ha lụrụ n’ibibi arụ ya. Ndị gburu ya were iwe nke ukuu n’ihi ihe ahụ e dekwasịrị n’elu-obe ahụ: EZE NKE NDỊ JUU. Kama mgbe ahụ ọ gabụ òkè ha ihụ ya n’uju nke ebube ya n’ikike nke ibu-eze ya. Ha ga ahụ n’ihe-oyiyi ya na ihe-okike nke ụkwụ ya, e biri na nkpụrụ okwu na adịgide adịgide: EZE NKE NDỊ EZE, na ONYENWE NKE NDỊ NWE NIILE. Ha tikuru ya nkpu akwam-emo, mgbe Ọ kwufere n’elu-obe, ka Kraist eze nke ndị izrel rịdata site n’elu-obe a, ka anyị hụ ma kwere kwa na ya. Ha g’ahụkwa ya mgbe ahụ n’ike n’oke-ebube nke Onye-eze. Ha a gaghịkwa achọ ihe-ngosi ọzọ iji mara na ọ bụ eze nke Izrel; kama n’ime oke ihe iju-anya mgbe ha matara ịdị-ukuu na oke ebube ya, ha g’abụ ndị a rụgidere ịnabata sị, Ngọzi n’adịrị onye ahụ nke n’abịa n’aha Onyenwe-anyị.NUA 59.1

    Àlà oma-jijiji, ntiwa nke oke-nkume dị iche-iche, ọchịchịrị nke gbachiri elu-ụwà niile, na oke iti-nkpu siri-ike nke Jisọs, ọ gwusiwo, ka O nyepụrụ ndụ ya, nyere ndị-iro ya nsogbu, ma meekwa ka ndị n’egbu ya tua egwu nke ukuu. Ndị n’eso ụzọ ya nwere ihe iju-anya n’ime ihe-ngosi ndịa niile pụrụ iche; kama olileanya ha niile lara n’iyi. Ha tụrụ egwu na ndị juu ga ebibikwa ha onwe ha. Ụdị ịkpọ asị ahụ ha gosipụtara nebe Ọkpara Chineke nọ ka ha chere na ọ gaghị akwụsị ebe ahụ. Ndị n’eso ụzọ ya nọrọ n’iri-uju n’oge awa ndịa n’ime onwe ha, ni’kwa akwa nihe nkpọchụ-iru ha. Ha chere na Ọ g’achị ọchịchị eze nke ụwà, kama olileanya ha nwụrụ anwụ mgbe Jisọs nwụrụ. Ha nwere obi-abụa n’ime iri-uju na nkpọchụ-iru ha m’ọbụ na Jisọs eduhieghị ha. Iru nne ya kpuru n’àlà, ọbụna okwukwe ya na ọ bụ Mesai ahụ dakwara.NUA 60.1

    Kama n’agbanyeghị na ndị n’eso ụzọ ya e nwewo ri nkpọchụ-iru n’olileanya ha banyere Jisọs, ha hụkwara ya n’anaya, ma nyekwa arụ ya ùgwù na nsọ, kama ha a mataghị otu ha g’esi enweta ya. Josef nke Arimathea, onye-ndu nwere ùgwù na nsopụrụ, bụ onye a maara áhà ya, bụrụkwa otu n’ime ndị n’eso ụzọ Jisọs n’ezie. O jere na nzuzo, werekwa nkwụwa-okwu, jekuru Pailet ma rịọ ya arụ Jisọs. O pụghịkwa iwepụta onwe ya ihè n’ije a; n’ihi na anya-iro nke ndị Juu dị ukuu nke mere na ndị n’eso ụzọ ya tụrụ egwu na ha ga agbali igbochi arụ Jisọs inweta ebe izu ike nwere ùgwù. Kama Pailet nabatara arịrịọ ya, ma ka ha n’ebudata arụ Jisọs site n’elu-obe ahụ, iri-uju ha kpalikwara, ha wee kwa akwa n’obi-ilu banyere olileanya ha lara n’iyi. Ha kere Jisọs n’ime akwa-ọcha mara-mma, Josef wee tinye ya n’ime ili ọhụụ nke aka ya. Ndị inyom ndị bụworị ezi ndị n’eso ụzọ ya mgbe ọ n’adị ndụ nọgịdekwara ya nso mgbe ọnwụ ya gasịrị, ha a rapụghịkwa ya rue mgbe ha hụrụ na e dotere arụ ya dị nsọ n’ime ili, nke e jiri nkume dị oke arọ wee bichie ọnụ-ụzọ ya, ka ndị iro ya ghara iburu arụ ya. Kama ọ dịghị nkpa na ha tụrụ egwu nka; n’ihi na a hụrụ m ụsụụ ndị mụọ-ozi ka ha ji nmasị ọnụ n’apụghị ikọ n’echegịde ebe izu-ike nke Jisọs. Ha chegịdere ili ahụ nche, nọrọ kwa na njikere ime oke ha n’ịgbapụta Eze nke ebube site n’ụlọ nkpọrọ Ya.NUA 61.1

    Ndị gburu Kraist tụrụ egwu na ọ pụrụ ibilite n’ọnwụ ma gbanarị ha. Ha rịọrọ Pailet ka o tinye ndị nche g’echegịde ili ahụ rue ụbọchị nke atọ. Pailet kwere nye ha ndị-agha ichegịde ili ahụ, ma gbachiekwa ili ahụ na ọnụ-ụzọ ya, ka ndị n’eso ụzọ ya ghara izuru arụ ya n’ori, ma kwue na o biliwo na ọnwụ.NUA 62.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents