Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Ndọndọ Ukuu Ahụ

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 26—Ihe Ngosi ọzọ

    Egosịrị m nmasị nke ndị eluigwe niile nweworo n’ime ọlụ ahụ nke n’aga n’elu-ụwà. Jisọs rọpụtara otu mụọ-ozi sịrị ike dịkwa ukuu ka ọ rịdata ma dọọkwa ndị bi n’ụwà aka na ntị ka ha jikere maka ọbịbịa nke abụa Ya. A hụrụ m mụọ-ozi ukuu ahụ ka ọ rapụrụ iru Jisọs n’eluigwe. Ihè dị ebube na enwụbiga oke n’aga n’iru ụzọ ya. A gwara m na ọlụ ya bụ inye ụwà niile ihe site n’ebube ya, ma dọọkwa madụ aka na ntị banyere iwe nke Chineke n’abia. Igwe madụ natara ihè ahụ. Ụfọdụ na edere duu, mgbe ndị ọzọ na añụrị-ọñụ n’ejideghịkwa onwe ha. Ihè ahụ kaọo wụsaara ndị niile, kama ụfọdụ batara naanị site na nhụkụ nke ihè ahụ, ma ha ejighị obi ha nara ya. Kama ndị niile natara ya, tụgharịrị chee iru ha n’eluigwe, ma nyekwa Chineke otuto. Ọtụtụ madụ jupụtara n’oke iwe. Ndị n’eje ozi na ndị madụ jikọrọ aka ha na ndị-ọjọọ, ma megide ihè ahụ nke mụọ-ozi ukuu ahụ wụsara. Kama ndị niile natara ya wezugara onwe ha site n’ihe ụwà, ma bụrụkwa ndị e jikọrọ n’otu.NUA 157.1

    Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya nọgịdekwara n’ọlụ n’achọ ịkpọrọ uche ndị niile ha nwere ike pụa nihe ahụ. Ọgbakọ ahụ nke jụrụ ya ka a rapụkwara n’ime ọchịchịrị. A hụrụ m mụọ-ozi ahụ ka o ji nmasị dị-omimi n’ele ndị niile kpọrọ onwe ha ụmụ Chineke, ka o wee dedata ọnọdụ omume ha, mgbe e kwupụtara ozi ahụ nke sitere n’eluigwe nye ha. Ma dịka ọtụtụ ndị sị na ha hụrụ Jisọs n’anya chigharịrị site n’ozi nke eluigwe ahụ, n’ewere nkwam’emo, njakịrị na ịkpọ-asị, otu mụọ-ozi nke n’ejidekwa akwụkwọ n’aka ya, dedatara omume ihere dị otua. Eluigwe niile jupụtara na ọnụma, n’ihi na ndị sị na ha n’eso Jisọs kparịrị ya.NUA 157.2

    A hụrụ m mkpọchụ-iru nke ndị ahụ kwesịrị ntụkwaasi -bi. Ha ahụghị onye nwe ha n’oge ha tụrụ anya ya. Ọ bụ nchekube Chineke izonarị ọdịn’iru, ma weta ndị ya na ọnọdụ mkpebi. Ọbụrụ na oge dịka nka a dịghị olu ahụ nke Chineke rọpụtara agaghị abụ ihe a luzuru. Ekwensu n’edu echiche nke ọtụtụ madụ rue ebe dị anya n’ọdị n’iru. Oge ọbụla nke e kwusara nye ọbịbịa nke Kraist aghaghị ikpọta uche madụ ịchọ ime nkwadebe siri-ike ugbua. Ka oge n’agafe, ndị niile na a k’anataghị ihe nke mụọ-ozi ahụ n’ozuzu-oke, jikọrọ onwe ha n’otu ha na ndị ledara ozi nke eluigwe ahụ anya, na ha niile wee tụgharia megide ndị ahụ nwetara mkpọchụ-iru n’emekwa ha ihe-ọchị. A hụrụ m ndị mụọ-ozi n’eluigwe ka ha na Jisọs n’erurite ụka. Ha e ribawọkwa àmà ọnọdụnke ndị n’eso ụzọ Kraist. Ngafe nke oge ahụ a hụrụ-mma anwapụtawokwa ha, ma imerime ha ka a tụrụ n’ihe ọtụtù ma chọpụta na ihe kọrọ n’ime ha. Ha niile weliri olu kwupụta na ha bụ ndị nke Kraist, kama ha dara n’iso Kraist ọbụna n’ụzọ niile. Ekwensu ñụrịrị-ọñụ nke nmeri n’ọnọdụ nke ndị kpọrọ onwe ha ndị n’eso ụzọ Kraist. O jiwo ha n’onya ya. O duruwokwa ndị ka n’ọnụ-ọgụgụ ịrapụ ụzọ ahụ guzoziri-eguzozi, ha wee n’anwa irigo eluigwe site n’ụzọ ọzọ. Ndị mụọ-ozi hụrụ ndị dị-ọcha, dịkwa nsọ, a gwakọtara n’etiti ndị nmehie na Zion, na onye iru-abụa ụwà hụrụ n’anya. Ha echegịdewokwa ndị hụrụ Jisọs n’anya n’ezie; ma nhụku nke ndị ajụọ-omume n’emetụta ndị nsọ.NUA 158.1

    Ndịa niile obi ha n’anu ọkụ, n’achọsikwa ike ihụ Jisọs, ka ndị sị na ha bụ ụmụnna ha n’okwukwe gbochiri ikwusa ọbịbịa nke Jisọs. Ndị mụọ-ozi lekwasịrị ọnọdụ niile ndịa anya, ma nwee obi ahizi n’ebe ndị fọdụrụ nọ, ndị hụrụ ọbịbịa Jisọs n’anya. Otu mụọ-ozi ukuu ọzọ ka e zipụrụ irịdata n’ụwà. Jisọs tụkwasịrị ihe odịde n’aka ya, ma dịka o biaruru n’ụwà, o tiri-mkpu, Babilon a dawo! Ọ dawo! Mgbe ahụ a hụrụ m ndịa niile nwere mkpọchụ-iru ka ha nwekwara iru-ọcha ọzọ, ma weliekwa anya ha lee eluigwe, legịdekwa site n’okwukwe na olileanya maka ọbịbịa nke onye nwe ha. Ma ọtụtụ dịka ha nọgịdere n’ọnọdụ iberibe, dịka ha nọ n’ụra; ma m n’ahụkwa ihe ngosi nke iri-uju dị-omimi n’iru ha. Ndị ahụ nwere nkpọchụ-iru hụrụ site n’akwụkwọ-nsọ na ha nọ n’oge nchere, na ha aghaghị iji ntachi-obi chere nmezu nke ọhụụ ahụ. Otu ihe ngosi ahụ nke duru ha ichere onyenwe ha na 1843, dukwara ha ile-anya ya na 1844. A hụrụ m na ndị ka n’ọnụ-ọgụgụ e nweghịkwa ume ahụ nke e jiri mara okwukwe ha na 1843. Mkpọchụ-iru ha e mewo ka okwukwe ha daa mba. Ma ka ndịa nwere mkpọchụ-iru jikọrọ aka n’iti-mkpu nke mụọ-ozi nke abụa ahụ, ụsụụ nke eluigwe legịdere anya site na nmasị dị-omimi, ma ribakwa àmà ihe nlụpụta nke ozi ahụ. Ha hụrụ ndịa niile zara áhà ndị nke Krasist ka ha tụgharịrị were njakịrị na nkwam’emo nọgịde ndị ahụ nwere mkpọchụ-iru. Ka okwu n’adapụ site n’ọnụ ndị nkwamemo ahụ, unu a kàlàghịkwa eluigwe rue ugbua! Mụọ-ozi dedakwara ha. Mụọ-ozi ahụ wee si, Chineke ka ha n’akwa emo.NUA 159.1

    A tụụrụ m aka laghachi azụ rue oge akpọọrọ Elaija laa na ndụ. Akwa ya dakwasịrị Elaisha, ma ụmụ nta agwa-ọjọọ (m’ọbụ ndị ntorobia) soro ya, n’akwa ya emo, n’etikwa nkpu si, Gafee, gị onye isi-nkwọcha! Gafee gị onye isi-nkwọcha! Ha kwara Chineke emo ma zutekwa ntaramahụhụ ha n’ebe ahụ. Ha mụtararị ihe ndịa site n’aka ndị mụrụ ha. Ma ndị niile kwara emo ma chiakwa ọchị n’echiche nke ndị nsọ ịla n’eluigwe, ka a g’eleta site na ihe otiti nke Chineke, ha g’amatakwa na ọ bụghị ntakịri ihe iji ya mee ihe egwuri-egwu.NUA 160.1

    Jisọs zigakwara ndị mụọ-ozi ọzọ ka ha fedata ngwa-ngwa itute na ịgba ndị ya ume n’okwukwe ha nke n’atalata-atalata, na ijikere ha ka ha ghọta ozi mụọ-ozi nke abụa ahụ, na ozi dị mkpa nke n’aghaghị ije n’eluigwe. Ahụru m ndị mụọ-ozi ndịa ka ha natara ike dị-ukuu na ihè site n’aka Jisọs, wee fedakwa ọsọsọ n’ụwà imejupụta ọlụ ha nke bụ inyere mụọ-ozi nke abụa ahụ aka n’ọlụ ya. Ihè ukuu chawakwasịrị ndị nke Chineke ka ndị mụọ-ozi ndịa n’eti, Lee onye n’alụ nwụnye ọhụụ n’abia, pụa nụ je zute ya. Mgbe ahụ a hụrụ m ndị ahụ nwere nkpọchụ-iru ka ha biliri, ma sitekwa na nkwekọrite nke olu ha na nke mụọ-ozi nke abụa ahụ, tie-mkpu, Lee onye n’alụ nwụnye ọhụụ ka ọ n’abia, pụa nụ je zute ya. Ihè nke sitere na ndị mụọ-ozi ndịa wakwasịrị ọchịchịri ebe ọbụla. Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya chọro ụzọ ime ka ihè a ghara ịgbasa, na inwe nhụkụ kwesịrị-ekwesi. Hà màrà ndị mụọ-ozi nke Chineke mgba, ma gwakwa ha na Chineke duhiere ndị madụ, na ọbụna site na ihe ha niile na ike ha, na ha apughị ime ka ndị madụ kwenye na Jisọs na abia. Ndị mụọ-ozi nke Chineke gara n’iru nọlụ ha, ọ bụ ezie na Ekwensu gbara mgba itinye ọdachi n’ụzọ, ma dọpu uche ndị madụ site n’ihè ahụ. Ndị niile natara ya nwere obi-ụtọ. Ha lekwasịrị anya ha n’eluigwe, ma nọgịdekwa n’ile anya-ọbịbịa nke Jisọs. Ụfọdụ nọkwara n’oke obi-mgbu, n’ikwa-akwa na ikpe ekpere. Anya ha dịka o lekwasịrị naru onwe ha, ha adịghịkwa eweli anya ha elu.NUA 161.1

    Ihè dị oke ọnụ-ahia sitere n’eluigwe chụpụrụ ọchịchịri n’ebe ha nọ, ma anya ha, nke ha ji adịghị ike tụkwasi n’onwe ha, ka ha weliri elu, mgbe obi ekele na ọñụ pụtara ihe n’aru ha niile. Jisọs na usuu niile nke eluigwe lere anya-ọma n’arụ ndị ahụ kwesịrị ntụkwasi obi, n’echerekwa.NUA 162.1

    Ndị ahụ jụrụ ma megịdekwa ihè nke ozi mụọ-ozi nke mbu ahụ, tufuru ihè nke abụa ahụ, nadịghịkwa e rite uru nke ike n’ebube dị n’ime-ozi ahụ, Lee Onye n’alụ nwụnye ọhụụ na abia. Jisọs jiri mgbarụ-iru chigharia site n’ebe ha nọ. Ha kpaịrị ya ma jụkwa ya. Ndị niile natara ozi ahụ ka e kekọrọ n’ime ogịdi nke ebube. Ha chere-nche kpekwa ekpere imara uche nke Chineke. Ha tụrụ egwu nke ukuu imehie megide ya. A hụrụ m Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya ka ha na achọ ikpuchi ihe ahụ zonari ya ndị nke Chineke; ma dịka ndị ahụ n’eche nọgịdere n’ihe ahụ, ma weliekwa anya ha elu site n’ụwà na elekwasi Jisọs, Ekwensu apụghị inwe ike ọbụla igbochi ha inwe ihe nka dị oke ọnụ-ahia. Ozi ahụ nke e nyere site n’eluigwe kpasuru Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya iwe, na ndịa niile sị na ha hụrụ Jisọs n’anya, ma were ọbịbịa ya kpọrọ ihe-efu, kwaa emo ma meekwa ihe-ọchị n’ebe ndị kwesịrị ntụkwasi-obi nọ. Kama otu mụọ-ozi ribara àmà nke nkparị ọbụla, nleda ọbụla, na nkọcha ọbụla ha natara site n’aka ndị sị na ha bụ ụmụnna ha. Ọtụtụ madụ weliri olu ha n’iti-mkpu ahụ, Lee Onye n’alu nwụnye ọhụụ ka ọ n’abia, ma rapụkwa umunna ha ndị nahụghị ọbịbịa nke Jisọs n’anya, ndị na achọghịkwa ka ha nọgịde n’olileanya ọbịbịa ya nke abụa. A hụrụ m Jisọs ka o wezugara iru ya site n’ebe ndị ahụ juru ma lelia ọbịbịa ya anya, o wee gwa ndị mụọ-ozi ka ha duru ndị ya pua n’etiti ndịa nadịghị ọcha, ka a ghara imeru ha. Ndị niile ñara ntị n’ozi ahụ niile guzoro iche nwerekwa onwe ha ma dịkwa n’otu. Ihè dị nsọ mabigakwara mma oke wakwasịrị ha. Ha jụkwara ụwà, dọkapụkwa nkekọrịta ha na ya, ma chụakwa aja site n’ihe nmasị ha niile nke ụwà. Ha rapụrụ akụ nke ụwà ha ma nlegịde anya ha niile chere iru n’eluigwe, na ele anya ihụ onye mgbapụta ha a hụrụ n’anya. Egedege iru ha nwupụrụ enwupụ site n’ọñụ e doro nsọ, nke kwupụtara ọnọdụ nke udo na ọñụ nke n’achi-achi n’ime ha. Jisọs gwara ndị mụọ-ozi ya ka ha ga gbaa ha ume, n’ihi na oge awa nke nkpagbu ha na abiaru nsọ. A hụrụ m na ndịa niile nọ na nchere a k’enwetaghị nkpagbu dịka ha n’aghaghị inwe. Ha a k’enwereghị onwe ha site n’ezighị -ezi. A hụkwara m ebere na ịdị mma nke Chineke n’iziga idọ-aka na ntị ahụ nye ndị bi n’ụwà, ma kwughachi ozi dị iche-iche ikpọlite ha rue otu oge, ka o wee duru ha rue ezi nnyocha nke onwe ha, ka ha wee yipu onwe ha pụa n’ezighị ezi niile nke e nyefere ha site n’aka ndị na ekpere arusi na ndị Pop. Site n’ozi ndịa Chineke n’akpọpụta ndị ya ebe o pụrụ iluru ha ọlụ n’ike dị ukuu karịa na n’ebe ha pụrụ idebe iwu ya niile.NUA 162.2

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents