Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Ndọndọ Ukuu Ahụ

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 40—Nbilite N’ọnwụ Nke Abụa Ahụ

    Mgbe ahụ Jisọs na ahịrị igwe ndị mụọ-ozi, na ndị-nsọ a gbapụtara, rapụrụ obodo ahụ. Ndị mụọ-ozi dị-nsọ gbara Jisọs gburu-gburu, n’edu ya n’ụzọ Ya, ma ụgbọ ahịrị nke ndị-nsọ a gbapụtara n’esọkwa. Otua Jisọs n’ime oke ịdị ukuu nke ebube Ya, kpọlitere ndị ajụọ-omume n’ike; ma dịka ha bilitekwara n’ime ọnọdụ ọjọọ nke arụ ha, dịka ha dị mgbe ha bara n’ili, lee nụ ka ọdị! Lee nụ ọnọdụ dị otua! Na nbilite n’ọnwụ nke mbụ, ndị niile biliri na ndụ anwụghị- anwụ; kama na nbilite n’ọnwụ nke abụa, e jiri-mara nke ọbụbụ-ọnụ ha dị iche-iche dịkwa n’iru ha niile. Ndị-eze niile na ndị á maara áhà ha n’elu ụwà bilitesịrị, ha na ndị dị-àlà, na ndị nwere nmụta na ndị n’enweghị nmụta, ha niile pụtasịrị n’otu. Ha n’elekwa Nwa nke madụ ahụ; ọbụna ndị ahụ mere ya ihe-ọchị ma kwaa kwa Jisọs emo, ma tiekwa ya ihe, ma ndị ahụ kpukwasịrị Ya okpu-ogwu n’iru nsọ ya, hụzuru Ya anya n’ịdị ukuu Ya niile. Ndị ahụ bụrụ Ya ọnụ-miri n’oge a n’ekpe Ya ikpe, na ewepụ iru ha ugbua site n’anya ike nke ya, na sitekwa n’ebube nke iru ya. Ndị ahụ kụrụ ntu n’aka abụa na ụkwụ abụa ya, n’elekwa anya n’àpà ntu ndịa ha kụrụ oge ha kpọgịdere ya n’obe. Ndị ahụ mara ya ube n’akụkụ, n’elekwa àpà arụrụ-àlà ha n’arụ ya. Ma ha matara na ọ bụ onye ahụ nke ha kpọgịdere n’obe, nke ha mekwara ihe-ọchị n’oge ahụhụ ya. Mgbe ahụ ka oke iti-mkpu na ịkwa ogologo akwa malitere, ka ha n’agbapụ izo onwe ha site n’iru Onye-eze nke ndị-eze na Onye-nwe nke ndị-nwe niile.NUA 228.1

    Madụ niile n’achọ izo onwe ha n’ime oke nkume dị iche-iche, ikpuchi onwe ha site n’iru oke ebube nke Onye ahụ ha mere ihe-ọchị na mbu. Ka ọ n’eju ndị niile anya gabiga oke n’enwekwa arụ-ụfụ site n’ịdị ukuu na oke ebube Ya, ha niile welitere olu ha n’otu, tie oke mkpu n’asi, ngọzi n’adịrị onye ahụ nke n’abia n’aha Onyenwe-anyị.NUA 229.1

    Mgbe ahụ Jisọs na ndị mụọ-ozi, na ndị-nsọ niile n’eso ha ụkwụ-na- ụkwụ, banyekwara ọzọ n’obodo ahụ, ma iti-nkpu na ịkwa-akwa dị-ilu nke ndị ajụọ-omume ikpe mara bụ ihe jupụtara ebe niile. Mgbe ahụ a hụrụ m na Ekwensu malitekwara ọlụ ya ọzọ. Ọ gabigara gburu-gburu ndị ya niile, ma meekwa ka ndị n’adịghị ike dị ike, na gwakwa ha na ya na ndị mụọ-ozi ya sịrị ike nke ukuu. O wee tụa-aka n’ebe imerime nnụ madụ biliri n’ọnwụ dị. Ọtụtụ ndị dị-ike n’agha na ndị-eze ndị maara usoro agha nke ọma, ndị meriwọkwara àlà-eze dị iche-iche na mbụ. Ọbụna ọtụtụ ndị dimkpa a maara nke ọma n’adịghị emery-emeri n’agha. N’ebe ahụ ka onye nganga anya-uku ahụ dịka Napoliọn, onye nzọ-ụkwụ nke mbata ya meworo ka obodo maa jijiji. N’ebe ahụ ka ndị dimkpa toro obiribi, ndị kwesịrị nsọ, ndị nwere ọdịdị rijuru afọ n’ile anya, ndị dawokwara n’agha. Ndịa dara oge ha jupụtara n’ọchịchọ nke inwe nmeri n’agha. Ka ha n’apụta site n’ili ha, ha malitekwara echiche ọgụ ha site n’ebe ha kwụsịrị n’ọnwụ ha. Ha n’enwekwa ụdị mụọ nke inwe nmeri ahụ n’achị ha mgbe ha nwụru. Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya wee n’agba izu, ma nwekwa nzukọ ha na ndị-eze ahụ niile na ndị ahụ niile dị-ike n’agha. Mgbe ahụ o lekwasịrị igwe ndị-agha ahụ anya ma gwa ha na òtù ndị ahụ nọ n’obodo ọma ahụ dị nta n’enweghịkwa ume, na ha nwere ike ịga were obodo ahụ, ma chụpụ ndị nọ n’ime ya, ma nwerekwa akụ na ụba ya niile na ebube ya niile dịka nke ha.NUA 230.1

    Ekwensu meriri n’iduhie ha, ha niile wee malite n’otu mgbe ahụ idozi onwe ha n’agha. Ha wee mepụta ọtụtụ ngwa-agha dị iche-iche; n’ihi na ọtụtụ ndị ọkachà-márá dị n’etiti igwe ndị-agha ahụ. Ma mgbe ahụ ha nwere Ekwensu dịka onye-isi ha, imerime ndị-agha ahụ gara n’iru. Ndị eze na ndị dị-ike n’agha n’esogịdekwa Ekwensu n’azu, imerime ndị ọzọ n’esọkwa nusu, nụsụụ. Nkega ụsụụ ndị-agha ọbụla nwere onye ndu, ha n’agbasokwa usoro ka ha n’azọ ije ha n’elu mkpọmkpọ-ebe dị iche-iche nke ụwà ijeru obodo-nsọ ahụ. Jisọs mechiri ọnụ-ụzọ nke obodo ahụ, ma imerime ndị-agha ahụ gbara ya gburu-gburu, ma doziekwa onwe ha n’ahịrị nke agha. Ha e doziwọkwa ụdi ngwa-agha niile dị iche-iche, n’olileanya na ha gaje ịlu ọgụ sịrị ike. Ha wee dozie onwe ha nke ọma gburu-gburu obodo ahụ. Jisọs na igwe ndị mụọ-ozi niile ndị nwekwara okpu-eze na enwụ enwụ n’isi ha, tinyekwara ndị-nsọ niile n’okpu-eze ha chapụrụ achapụ, wee rigoro n’elu mgbịdị nke obodo ahụ. Jisọs wee kwue okwu site n’ịdị ukuu na asi, Lee, unu ndị nmehie, ụgwọ-ọlụ nke ndị ezi-omume! Ma lekwanụ unu ndị m a agbapụtara, ụgwọ-ọlụ nke ndị ajụọ-omume! Imerime madụ ahụ wee lekwasị òtù ndị ahụ n’anọkwasị n’elu mgbidi nke obodo ahụ. Ma ka ha n’elekwasị anya n’okpueze ha n’enwụ-enwụ, n’ahụkwa iru-ọma ha jupụtara n’ebube, nke n’egosi oyiyi nke Jisọs, ma hụkwa ịdị ukuu na ebube nke Eze nke ndị-eze niile, na Onye-nwe nke ndị-nwe niile, agbam-ume ha dárá. Echiche nke akụ n’ụba na ịdị ukuu ahụ nke ha tufuru batara n’ime ha, ka ha matara na ụgwọ-ọlụ nke nmehie bụ ọnwụ. Ha hụrụ otu ndị nsọ ahụ, nwere obi-ụtọ ndị ha meworo ihe ọchị, ka ha n’eyikwasị ebube, nsọ, anwụghị-anwụ na ndu-ebighị-ebi, mgbe ha onwe ha nọ n’azụ obodo n’etiti ihe niile rụrụ-arụ.NUA 231.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents