Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Ndọndọ Ukuu Ahụ

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 38—Ụgwọ-Ọlụ Nke Ndị Nsọ

    Mgbe ahụ a hụrụ m imerime ọnụ-ọgụgụ ndị mụọ-ozi ka ha si n’obodo ahụ na eweta ọtụtụ okpu-eze dị ebube; okpu-eze nye onye nsọ ọbụla nke e dekwasikwara áhà ya n’elu ya; ma mgbe Jisọs kpọrọ oku n’ihi okpu ndịa, ndị mụọ-ozi wetara ha nye ya, ma Jisọs ọma ahụ sitekwa n’aka-nri nke ya onwe ya, tụkwasịrị okpu-eze ndịa n’isi niile nke ndị nsọ. N’otu aka ahụ, ndị mụọ-ozi wetara ụbọ-akwara, ma Jisọs nyekwara ha ndị nsọ niile. Ndị ndu nke ndị mụọ-ozi buru ụzọ kpatu aka n’ụbo-akwara, mgbe ahụ olu niile weliri elu n’obi-ekele, na otuto, na aka niile ji nka pụa eriri ụbọ-akwara ahụ, na ewepụta ụtọ abụ n’uju ya na ozuzu-oke. Mgbe ahụ a hụrụ m Jisọs ka ọ nedu otu ndị ahụ a gbapụtara rue n’ọnụ ụzọ àmà nke obodo ahụ. O we jide ọnụ-ụzọ ahụ ma kwahee ya, n’asị mba niile ahụ ndị debere ezi-okwu ahụ ka ha banye n’ime. Ihe niile jupụtara n’obodo ahụ bụ nke dị mma n’anya. Ụba nke ebube ka ha hụrụ ebe niile. Mgbe ahụ Jisọs lekwasịrị ndị nsọ ya ahụ a gbapụtara anya; egedege iru ha n’egbu màrà-màrà n’ọñụ; ma dịka Ọ n’elekwasi ha anya ọma ya, o jiri olu-ọma ya jupụtara n’abụ wee sị, a nam’ahụ ihe mgbu nke obi m, ma afọ ejuwom. Akụ n’ụba nka bụ nke unu g’añụrị n’ime ya ebighị-ebi. Iri-uju niile agwụsiwo. Ọnwụ agaghị adikwa ọzọ, iri-uju agaghị adịkwa, ịkwa-akwa agaghị adikwa, arụ-ngbu agaghị adịkwa ọzọ. A hụrụ m igwe ndị ahụ a gbapụtara ka ha rudatara ma wụsa okpu eze ha n’enwu-enwu nụkwụ-àlà Jisọs, ma mgbe ahụ, ka aka ihụnanya ya weliri ha elu, ha kpatukwara ụbọ-akwara ọla-edo ha aka, ma mejupụta eluigwe niile site n’abụ ha, na abụ dị iche-iche nye nw’atụrụ ahụ.NUA 222.1

    Mgbe ahụ a hụrụ m Jisọs ka ọ n’edu igwe ndị ahụ a gbapụtara rue n’osisi nke ndụ ahụ, ọzọkwa anyị nụrụ olu ọma Ya, nke dị ụtọ karị abụ ọbụla daworo na ntị madụ, ka ọ n’asị, akwụkwọ nke osisi a bụ n’ihi ọgwụgwọ nke mba niile. Rie nụ ihe niile sitere na ya. N’elu osisi nke ndụ ahụ ka nkpụrụ osisi kachasị mma dịkwa, nke ndị-nsọ pụrụ iri n’efu. Oche-eze ukuu dị ebube dị n’ime obodo ahụ, ma sitekwa n’okpuru oche-eze ahụ ka isi-iyi dị ọcha, na asọpụta miri nke ndụ n’enwụ dịka Kristal. N’akụkụ abụa nke isi-iyi nke ndua ka e nwere osisi nke ndụ. N’usọtu niile nke osimiri ahụ ka e nwere osisi dị iche-iche nke n’amị nkpụrụ dị mma n’ihe oriri. Asụsụ-ọnụ bụ ihe n’ezughị oke m’ọli inwa iji kọwaa ọnọdụ nke eluigwe. Ka ọnọdụa kpuhere nye m, efuru m efu n’ihe iju-anya, bụrụkwa onye e bupụrụ pụa nanụ-arụ site n’ịdị ukuu nke akụ n’ụba na imabiga mma oke nke ebube, m wee tọgbọ mkpịsị m, ma tipụ mkpu, Lee ihụnanya nka! Lee ịhụnanya dị ebube! Ọ dịghị ọkachamma asụsụ ọbụla pụrụ ikọwapụta ebube nke eluigwe, m’ọbụ omimi nke ịhụnanya Onye-nzọpụta n’enweghị òyìrì.NUA 223.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents