Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Ndọndọ Ukuu Ahụ

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 21—Nzukọ Na Ụwà Dịkọrọ N’otu

    Ekwensu wee nwe nzukọ ya na ndị mụọ-ozi ya, ha nọkwa n’ebe ahụ ma tulee ihe ha rịtaworo. Ọ bụ ezie na ha ejidewo nkpụrụ obi ụfọdụ site n’itụ ụjọ nke ọnwụ, ka ha ghara ịnara ezi-okwu ahụ; kama ọtụtụ, ọbụna n’ime ndị ụjọ, nabatara ezi-okwu ahụ, ma n’otu ntabi-anya ahụ ụjọ ha rapụrụ ha, na ọbụna mgbe ha hụrụ ọnwụ nke ụmụnna ha, ma hụkwa nnọgịdesike na ntachi-obi ha, ha matara na Chineke na ndị mụọ-ozi nyeere ha aka inagịde ahụhụ dị otua, ha wee nwe anya-ike na nkwụwa-okwu karị. Ọbụna mgbe a kpọrọ ha inye ndụ nke ha, ha nọgịdere n’okwukwe ha na ụdị ntachi-obi na nguzosike nke mere ka ndị n’egbu ha maa jijiji. Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya kpebiri na ọ dị ụzọ ọzọ ha g’eji merie n’ila ọtụtụ nkpụrụ-obi n’iyi, bụ ụzọ nke g’ewe anya karị n’ikpeazu. Ha hụrụ na ọ bu ezie na ha na a kpatara ndị nke Kraist ịta-ahụhụ, kama nnọgịdesike ha na olileanya ahụ nke n’ewuli mụọ ha, n’eme ka ọbụna onye dakasịrị mba n’etiti ha dị ike, nke mere na ọdọ-nkwugbu m’ọbụ ọdọ-oku a digịkwa eme ka obi ha daa mba. Ha gbasoro nnagịde dị nro nke Kraist mgbe ọ nọ n’iru ndị n’egbu ya, na ọtụtụ kwenyere ezi-okwu ahụ mgbe ha letara nnọgịdesike ha, na ebube Chineke nke nọgịdere n’ime ha. Ekwensu kpebiri na ọ ghaghị ịbia n’ụzọ dịkarịrị nro. O meruwori ụkpụrụ nke akwụkwọ nsọ; ma omen’àlà ha ndị g’ebibi imerime madụ n’ewerekwa ọnọdụ dị omimi. O melatara mkpọrọmasị ya, ma kpebiekwa ime ka ndị ya ghara ị ga n’iru n’oke nkpagbu; kama duru nzukọ ị gbasi-mgba ike, ọ bụghị n’ihi okwukwe mbu ahụ e nyere n’aka ndị nsọ, kama, n’ihi omen’àlà ndị dị iche-iche. Dịka o duru nzukọ inaa iru-ọma na nsọpụrụ nke ụwà, site n’omume aghụghọ dịka ihe n’abara ha uru, o malitere itufu iru-ọma ya n’ebe Chineke nọ. Nzukọ jiri nwayọ-nwayọ tufue ike ya, ka a rapụrụ ikwupụta ezi-okwu ahụ niile nke megịdere ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya na enyi ndị ụwà.NUA 128.1

    Nzukọ a bụghịkwa ọgbakọ ndị pụrụ iche nke ọ bụworo mgbe a mụnyere ọkụ nke nkpagbu ahụ megide ya. Ole otu ọla-edo jiri dị inyoghị-inyoghị? Ole otu ola-edo ahụ a nụchara-anụcha jiri gbanwe? A hụrụ m na ọbụrụ na nzukọ nọgịdesịrị ike n’ịdị nsọ na ịdị iche nke agwa ya, ike nke Mụo-nsọ nke e nyeworo ndị n’eso ụzọ ya g’anọgịde kwa n’ime ya. Ndị ọria g’anata ọgwụgwọ, ndị mụọ-ọjọọ ka a g’abara mba ma chụpụkwa, ọ g’adikwa ukuu, bụrụkwa ihe egwu nye ndị-iro ya.NUA 130.1

    A hụrụ m na ọtụtụ igwe madụ kwenyere n’aha nke Kraist, kama Chineke a mataghị ha dịka ndị nke Ya. O nweghị ihe ụtọ n’ebe ha nọ. Ekwensu dika o nwere agwa nke okpuperechi, n’enwekwa nmasị ka ndị madụ n’eche na ha bụ ndị nke Kraist. O nwekwara nmasị n’ezie ka ha kwere na Jisọs, na ọnwụ nke obe a, na kwa nbilite n’ọnwụ ya. Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya kwere nke ọma n’ihe ndịa niile n’onwe ha, ma kụja. Kam’ọbụrụ na okwukwe nka adịghị akpali ọlụ-oma, ma durukwa ndị niile kwere ya ịgbaso ndụ nke iju ownwe-onye dịka Kraist, o sogbụghị ya m’oli; n’ihi na o bụ naanị áhà nke ndị nke Kraist ka ha n’aza, mgbe obi ha k’abu ihe nke anụ-arụ; na ọ pụrụ iji ha lụa ọlụ nke ya nke oma karịa mgbe ha n’enyeghị onwe ha ndị kwere ekwe. N’okpụrụ áhà ndị nke kraist ka ha n’ezo nkwarụ niile ha. Ha n’eje ije n’ime ndụ nke anụ-arụ, ha adịghị emerikwa ajụọ-omume nile nke anụ-arụ. Nka n’enye ndị n’ekweghị-ekwe ohere iwere ezughị-oke niile ha tụkwasị n’iru Jisọs Kraist, na ịta ya ụta, na ime ka ndị niile nwere ọkpukperechi dị-ọcha n’emerụghịkwa emerụ bụrụ ndị a kpọrọ ihe efu.NUA 130.2

    Ndị n’eje ozi wee n’ekwusa ihe dị ụtọ na ntị ndị n’ebi ndụ nke anụ-arụ. Nka bụ dịka Ekwensu chọro ya. Ha a dịghị anwa ikwusa Jisọs na ezi-okwu niile nke akwụkwọ nsọ; n’ihi na ọbụrụ na ha g’eme nka, ndịa niile kwere n’anụ-arụ a gaghị anụ ha. Ọtụtụ n’ime ha bara ọgaranya bụrụkwa ndị a n’achọsi-ike na nzukọ, ọ bụ ezie na ọnọdụ ha na nzukọ adịghị mma karị nke Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya. Okpukperechi nke Jisọs ka e mere ka ọ pụta ihè nwekwa nsọpụrụ n’anya ndị ụwà. E ziri ndị madụ na ndị niile nwere okpukperechi g’abụ ndị ụwà g’enye nsọpụrụ karị. Ozizi nka dị iche nke ukuu na ozizi nke Krasit. Ụkpụrụ ya na nke ụwà a pụghị ịdị n’udo. Ndị niile soro ya bụ ndị jụrụ ụwà. Ihe ụtọ ndịa malitere site na Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya. Ọ bụ ha tụrụ ukpụrụ a, ma ndị kwere-ekwe n’anụ-aru e tinyewo ya nọlụ. Ndị iru-abụa na ndị nmehie batara ha na nzukọ wee dị n’otu. Akụkọ-oma ha dị iche-iche ka a n’akuzi bụrụkwa ihe a naara nke-ọma. Kama ọ bụrụ na a kuzie ezi-okwu ahụ na ozuzu-oke ya, ọ g’emechibido ndị iru-abụa na ndị nmehie.Kama ọdịghị ihe dị iche n’etiti ndị sị na ha bụ ndị n’eso ụzọ Kraist na ndị ụwà. A hụrụ m na ọ bụrụ na a pụrụ itọpụ ihe nkpuchi ụgha ahụ n’ebe ndị nzukọ nọ, a g’ekpughe ọdịdị mmebi-iwu, ọrụrụ na mmerụ, nke nwa Chineke ọbụla kwesịrị ntụkwasị-obi n’agaghị atụ-nchichi ikpọ nmebi-iwu ndịa n’ezi-áhà ha, ụmụ nke nna ha, bụ Ekwensu; n’ihi na ọlụ ya niile ka ha n’alụ. Jisọs na ụsụụ nke ndị eluigwe niile legịdere ọnọdụ dị otua anya n’obi-mgbu; ma otu ọdị Chineke nwekwararị ozi nye nzukọ Ya nke dị nsọ dịkwa nkpa. Ọ bụrụ na a nara ya, ọ g’alụpụta nwụgharị ọhụụ zuru-oke n’ime nzukọ, wulitekwa ezi-àmà dị ndụ nke g’ewezuga ndị iru-abụa na ndị-nmehie, ma kpọghachikwa nzukọ ọzọ inweta iru-ọma n’ebe Chineke nọ.NUA 131.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents