Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Ndọndọ Ukuu Ahụ

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 41—Ọnwụ Nke Abụa Ahụ

    Ekwensu jiri ọhụhụ gbaba n’etiti, n’achọ ikpasu igwe madụ ahụ ka ha malite ọgụ. Kama ọkụ nke sitere n’ebe Chineke nọ n’eluigwe ka e zosara n’isi ha, na madụ ndị uku niile, na ndị á maara áhà ha niile, na ndị dimkpa niile ahụ, ma ndị ogbenye na ndị ụwà-ọjọọ niile, ha niile ka e repịara n’otu. A hụrụ m na ụfọdụ lara n’iyi ngwa-ngwa, mgbe ndị ọzọ tara ahụhụ ogologo mgbe karị. A tara ha ahụhụ dịka omume niile nke anụ-arụ ha. Ụfọdụ n’ere ọtụtụ ụbọchị, ma dịka ogologo oge nke akụkụ-arụ ha ọbụla regịdere ọkụ, ka ha nọgịdekwara mata na ha n’ata ahụhụ. Mụọ-ozi ahụ sịrị, ikpuru nke ndụ agaghị anwụ; ọkụ ha agaghịkwa anyụ-anyụ ụbọchị niile nke ihe ọ g’eri fọdụrụ.NUA 232.1

    Ma Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya tara ahụhụ ogologo oge. Ekwensu abụghị naanị na O buru ibu-arọ na ahụhụ nmehie nke ya onwe ya, kama nmehie niile nke ndị niile a gbapụtara ka e bọkwasịrị ya; ma ọ haghị ịtakwa ahụhụ nke mbibi nke mkpụrụ-obi niile ndị ahụ ọ kpatara. Mgbe ahụ a hụrụ m na Ekwensu, na igwe ndị ajụọ-omume niile, ka e mezuru; na igwe ndị mụọ-ozi niile, na ndị-nsọ a gbapụtara, sitere n’oke-olu tie-mkpu si, Amen!NUA 233.1

    Mụọ-ozi ahụ sịrị, Ekwensu bụ nkpọrọgwu, ụmụ ya bụkwa àláka ya. E ripịawọkwa ha, mkpọrọgwụ na àláka ya. Ha anwụwọkwa ọnwụ ebighị-ebi. Ọ dịghị mgbe ha g’ebilikwa ọzọ, ma Chineke g’enwekwa ụwà dị ọcha. M wee welie anya ma hụ ọkụ ahụ nke repiaworo ndị nmehie ka ọ n’erepia ọrụrụ niile, ma n’emekwa ka ụwà dị ọcha. Ọzọ, e weliri m anya wee hụ ụwà ka e mere ka ọdị ọcha. O dịghịkwa otu ihe ọbụla n’egosi ọbụbụ-ọnụ ahụ. Mbibi niile, na mbakoro niile nke elu-àlà, yiri ugbua dịka ebe dị larịị, sakwara mbara. ụwà niile nke Chineke dị-ọcha, ma ndọndọ-ukuu ahụ agwụsiwo ebighị-ebi. Ebe ọbụla anyị lere anya, ihe ọbụla nke anya tụkwasịrị na ya, mara mma dịkwa nsọ. Ma igwe ndị niile a gbapụtara, okenye na ntorọbia, onye uku na onye nta, wụsara okpu-eze ha n’enwụ-enwụ n’ụkwụ-àlà Onye mgbapụta ha, ma rudatakwa onwe ha n’ọjịja-mma n’iru Ya, ma fekwa Ya ofufe, bụ onye ahụ nke n’adị ndụ mgbe niile ebighị-ebi. ụwà ọhụụ ahụ magburu onwe ya, n’ebube ya niile, bụ ihe nketa ebighị-ebi nke ndị-nsọ. Àlà-eze ahụ, na ọchịchị, na ịdị-ukuu nke àlà-eze n’okpuru eluigwe niile, ka e nyekwara ndị-nsọ nke onye kachasị ihe niile elu, ndị g’enwekwa ya ebighị-ebi, ọbụna rue mgbe niile ebighị-ebi.NUA 233.2

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents