Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Ndọndọ Ukuu Ahụ

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 29—Ihe Nnọkwasị Siri-Ike

    Ahụrụ m ọgbakọ guzoro nke ọma ndị e chekwara echekwa nọsikwara ike, ndị n’agaghị eche iru ha n’ebe ndị g’emelu okwukwe nzukọ ha. Chineke lere ha anya-ọma. E gosịrị m nzọ-ụkwụ atọ - otu, abụa na atọ - bụ ozi mụọ-ozi nke mbụ, nke abụa na nke atọ ahụ. Mụọ-ozi ahụ wee si, ahụhụ g’adịrị onye ọbụla nke g’ebupụ otu nkume, ma ọ bụ kpalie otu anaga n’ime ozi ndị a. Ezi nghọta nke ozi ndịa dị oke mkpa. Ndụ nke ọtụtụ nkpụrụ obi n’adabere na omume nke e jiri nabata ha. A kpọtakwara m ọzọ rue ozi ndịa niile, ma hụ ka o si dị ukuu bụ ụgwọ ndị nke Chineke kwụrụ n’izụta amamihe ha. Ha nwetaworo ya site n’oke nhụju-anya na ọgụ sịrị ike. Site na nzọ-ụkwụ rue nzọ-ụkwụ ka Chineke duworo ha n’aga, rue mgbe o dotere ha n’elu ebe siri ike, n’apụghị ikwatu akwatu. Mgbe ahụ a hụrụ m ndị madụ n’otu n’otu ka ha n’abiaru nso ebe-nnọkwasi ahụ, ma tutu ha zọkwasị ụkwụ ha n’elu ebe ahụ ha n’enyọchakwa ntọ-àlà ya. Ụfọdụ ji nñurị-ọñụ n’otu oge ahụ n’arigọkwa n’elu ya. Ndị ọzọ malitere ichọpụta ezighị-ezi nke ntọ-àlà ebe nnọkwasị ahụ. Ha chọrọ ka e dozie ihe ụfọdụ, ka ebe nnọkwasị ahụ zue oke, ka ndị madụ nwekwa obi-ụtọ karịa. Ụfọdụ rịdatakwara ma nyochaakwa ebe nnọkwasị ahụ, ma chọtakwa ezighị-ezi na ya, wee kwupụta na a tọrọ ntọ-àlà ya n’ezighị-ezi. A hụrụ m na madụ karịrị na ọnụ-ọgụgụ guzosịrị ike n’elu ihe nnọkwasi ahụ, ma n’adusikwa ndị ọzọ ọdụ ike ndị rịdaworo site na ya ka ha kwusị ntamụ ha, n’ihi na Chineke bụ okachamara nke wuru ụlọ ahụ, na ọ bụkwa Ya ka ha n’aluso ọgụ. Ha gụkọrọ ọlụ-ebube niile nke Chineke, nke duteworo ha n’ebe-nnọkwasị ahụ sịrị ike, ma sitekwa n’ịdị n’otu ka ọtụtụ n’ime ha weliri anya n’eluigwe, ma jirikwa oke-olu nye Chineke otuto. Omume nka hụkukwara ụfọdụ n’ime ndị ahụ tamuworo ntamụ, ma rapụkwa ebe nnọkwasị ahụ, ma jiri anya nke nweda onwe onye n’àlà wee rịgotakwa n’elu ya ọzọ.NUA 177.1

    A tụụrụ m aka ọzọ lọghachi na nkwupụta nke ọbịbịa mbụ nke Kraist. E zigara Jọn na mụọ na ike nke Elaija idozi ụzọ nye ọbịbịa nke Jisọs. Ndị niile jụrụ àmà nke Jọn e riteghị uru na ozizi niile nke Jisọs. Nmegide ha megịdere nkwupụta banyere ọbịbịa mbụ ahụ dotere ha ebe ha napụghị ịnara ihe ngosi wekasịrị anya na Jisọs ị bụ Mesaia ahụ. Ekwensu duru ndị ahụ jụrụ ozi nke Jọn igakwa n’iru, ijụ Jisọs na ịkpọgịde Ya n’obe. N’ime nka, ha dotere onwe ha ebe ha n’apụghị ịnata ngọzi nke ụbọchị Pentikọst, nke ga akụziri ha ụzọ ịbanye n’ebe-nsọ nke eluigwe. Mgbawa nke akwa nkpuchi nke ebe-nsọ ahụ gosịrị na nchụ-àjà niile nke ndị Juu na omenàlà niile ha ka a n’agaghị anarakwa ọzọ. Aja ukuu ahụ abụwori nke a chụrụ, a narawọkwarị ya, na Mụo-nsọ nke rịdatara n’ụbọchị Pentikoọst buuru uche nke ndị n’eso ụzọ ya site n’ebe nsọ nke ụwà jee na nke eluigwe, ebe Jisọs banyeworo site n’obara nke aka ya, ma wụsara ndị n’eso ya uru niile nke ha k’enwetarị n’elu ukpụrụ nke nzọpụta, ma nọgịdekwa n’itụkwasị obi na nchụ-àjà ha na onyinye ha niile n’abaghị uru ọbụla. Ha apụghịkwa irịta uru ọbụla site n’olu ogbugbo nke Kraist n’ebe nsọ ahụ. Ebe-nsọ nke eluigwe e werewori ọnọdụ nke ebe nsọ nke ụwà, kama ha a mataghịkwa ụzọ nke gara ebe-nsọ nke eluigwe ahụ.NUA 178.1

    Ọtụtụ madụ tụrụ oke egwu mgbe ha letara nmeso ndị Juu mesoro Jisọs n’iju ya na ikpọgịde ya n’obe. Ma ka ha n’agụ akụkọ nke nmeso ihere ya, ha chere na ha hụrụ Kraist nanya, nke ha na a kagọnarighị ya dịka Pita, m’ọbụ kpọgịde ya n’obe dịka ndị Juu mere. Kama Chineke onye hụrụ ụdị nwụte ha nye Ọkpara ya, anwapụtawọkwa ha, ma wetekwa nwale nye ụdi ihụnanaya ahụ ha sị na ha hụrụ Jisọs.NUA 179.1

    Eluigwe niile ji nmasi dị omimi n’ele ka e si a nara ozi ahụ. Ma ọtụtụ ndị si na ha hụrụ Jisọs n’anya, ndị hikwara anya-miri mgbe ha n’agụ akụkọ nke obe ahụ, kama ha g’anara ozi ahụ n’obi-ụtọ, bụ ndị a kpaliri iwe, ma meekwa ozi-ọma nke ọbịbịa Jisọs ihe- ọchị, ma kpọkwa ya njehie. Ha adịghịkwa ejeko n’etiti ndị ahụ hụrụ obibia ya n’anya, kama ha kpọrọ ha asi, ma chụpukwa ha site na nzukọ ha niile. Ndị niile jụrụ ozi nke mbụ ahụ a pụghịkwa irịta uru na nke abụa ahụ, ha agaghịkwa erịta uru site na mkpu nke etiti abali ahụ, nke pụrụ ijikere ha site n’okwukwe isoro Jisọs banye n’ebe-nsọ nke kachasị ebe-nsọ nke eluigwe. Ma site n’ijụ ozi abụa ndị mbụ ahụ, ha a pụghị ihụ ihe ọbụla nke sitere n’ozi mụọ-ozi nke atọ ahụ, nke n’egosi ụzọ banyere n’ime ebe nsọ kachasi ebe nsọ. A hụrụ m na nzukọ ndịa dị iche-iche, dịka ndị Juu kpọgịdere Jisọs n’obe, a kpọgịdewọkwa ozi ndịa niile n’obe, nke mere na ha a mataghị ihe ọbụla e mere n’eluigwe, ma ọbu ụzọ bara n’ebe-nsọ ahụ kachasi ebe-nsọ, na ha a pugbhikwa iketa uru ọbụla sitere n’aririọ Jisọs n’arịọta ebe ahụ. Dịka ndị Juu, na achụ aja ha nabaghị uru ọbụla n’ebe nkega ahụ nke Jisọs rapụworo, ma Ekwensu, ebe o nwere nmasị na nduhie nke ndị sị na ha bụ ndị n’eso ụzọ Kraist, na ejisikwa ha ike n’ọnya ya, ma n’enwekwa ụdị agwa nke okpukperechi, ma n’edukwa uche ndị sị na ha bụ ndị nke Kraist nye onwe ya, n’alụkwa ọlụ n’ike ya, n’ọtụtụ ihe iribama na ọlụ ebube ụgha ya dị iche-iche. Ụfọdụ ka ọ n’eduhie n’otu ụzọ ụfodụkwa n’ụzọ ọzọ. O nwere nduhie dị iche iche o doziri nke g’emetụta echiche dị iche-iche.NUA 179.2

    Ụfọdụ ji obi mgbafu n’elegịde otu nduhie, mgbe ha sitere n’ezi-obi ha n’anara nke ọzọ. Ekwensu n’eduhiekwa ụfọdụ site n’ofufe mụọ-ọjọọ. Ọ n’abiakwa dịka mụọ-ozi nke ihè, n’agbasakwa nhukụ ya n’ebe niile. A hụrụ m ọtụtụ nwụgharị ihe-ụgha ebe niile. A kpaliri nzukọ niile, ma n’eche na Chineke n’alụrụ ha ọlụ dị ebube, mgbe ọ bụ naanị mụọ ọzọ. Nka g’anwụkwa ma rapụ ụwà na nzukọ n’ọnọdụ jọgburu onwe ya na njọ karị mgbe mbụ.NUA 181.1

    A hụrụ m na Chineke nwere ụmụ kwesịrị ntụkwasị-obi n’etiti ndị n’ele anya ọbịbịa Kraist, na nzukọ ndị dárá-ada, ma ndị-ozi na ndị madụ ka a g’akpọpụtakwa site na nzukọ ndịa, tutu a wụsa ihe otiti, ma ha g’ejikwa obi ụtọ nara ezi-okwu ahụ. Ekwensu matara nka, na tutu oke iti-mkpu ahụ nke mụọ-ozi nke atọ, ọ g’akpali ọnụ-ọkụ n’ime ọgbakọ okpukperechi ndịa, na ndị niile jụrụ ezi-okwu ahụ g’eche na Chineke nọyere ha. O nwere olileanya iduhie ndị kwesịrị ntụkwasị-obi, ma duru ha iche na Chineke nọkwa n’alụrụ nzukọ ndịa ọlụ. Ma ihè a g’enwụ, na onye ọbụla n’ime ndị kwesịrị ntụkwasị-obi g’arapụ nzukọ ndịa dárá-ada, ma guzorọkwa n’etiti ndị ahụ fọdụrụ.NUA 181.2

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents