Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Ndọndọ Ukuu Ahụ

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 31—Anya Uku

    Ahụrụ m Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya ka ha n’enwe nzukọ. O wee gwa ndị mụọ-ozi ya ka ha ga see ọnya ha niile karịsia nye ndịa niile n’ele anya ọbịbịa abụa nke Kraist, na ndị n’edebe iwu niile nke Chineke. Ekwensu gwara ndị mụọ-ozi ya na nzukọ niile n’ararụ ụra. Ọ g’amụba ike ya n’ọlụ ebube ụgha ya niile, ọ g’enwekwa ike ijide ha. Kama òtù nke ndị n’edebe ụbọchị izu-ike ka anyị kpọrọ asị. Ha n’anọgịde n’ọlụ megide anyị, ma n’anakpụkwa anyị ndị nke anyị, idebe iwu Chineke ahụ a kpọrọ asị. Gaa nụ, mee ka ndị nwere àlà na ego bụrụ ndị nọ na ndọgbu n’ọlụ mgbe niile. Ọbụrụ na unu pụrụ ime ka ha tụkwasị nmasị ha niile n’ihe ndịa, anyị enwetawo ha. Ha nwere ike inwe okwukwe ọbụla ha chọrọ, kama naanị mee nụ ka ha tụkwasị obi n’ego karịa n’ọganiru nke àlà-eze Kraist, m’ọbụ mgbasa ezi-okwu ahụ anyị kpọrọ asị. Chee ụwà n’iru ha nụzọ dịkasịrị mma n’anya, ka ha wee hụ ya n’anya ma were ya dịka chi. Anyị aghaghị ijide akụ n’uba niile n’ime onweanyị dịka anyị nwere ike. N’ihi na ọ bụ mgbe ha n’enwe akụ n’uba karị, ka ha g’emerụ àlà-eze anyị arụ site n’inapụ anyị ndị nke anyị. Ọzọkwa ka ha n’enwe ọgbakọ n’ebe dị iche-iche, mgbe ahụ ka anyị g’anọkwa n’ihe ọghọm. Nọrọ nụ na nche na mgbe ahụ. Mee ihe ọbụla iji kpọpụ echiche madụ site n’ezi ihe. Mebie ihụnanya n’ebe madụ ibe ya nọ. Mee ka ndị-ozi ha daa-mba n’obi, n’ihi na anyị kpọrọ ha asị. Mee ka ndị nwere akụ n’ụba nwekwa aka-ntagịde, ka ha ghara inye ya n’ọlụ Chineke. Leba anya n’okwu ego niile ọ bụrụ na ị nwere ike, ma chụba ndị ozi ha n’ụkọ, na obi ọlịlọ-miri. Nka g’egbu mụọ nke ije-ozi ha na inụ-oku nke obi ha. Buso ha agha na nzọ ụkwụ ha ọbụla. Mee ka anya-uku na ihụ ihe ụwà n’anaya bụrụ ihe n’achị-achị n’omume niile ha. N’ihi na mgbe ụdị omume ndịa n’achi ndịa, nzọpụta na amara g’adi anya n’ebe ha nọ. Mee ka ọtụtụ ihe dị iche-iche nọgịde ha gburu-gburu, nke ga adọrọ uche ha, mgbe ahụ ha g’abụkwa ndị nke anyị. Ọ bụghị naanị na ha g’abụ ndị nke anyị, kama nhukụ ọjọọ ha agaghị adiyere ndị ọzọ iduba ha eluigwe. Ma ndị g’achọ inye onyinye, tinyekwa n’ime ha ndụ nke ntamu, ka ha nye naanị ole na ole. NUA 189.1

    A hụrụ m na Ekwensu tinyere atụmatụ ya niile n’ọlụ nke ọma. Ma mgbe ọbụla ndị-oru nke Chineke nwere ọgbakọ, Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya ghọtara mkpebi ha, ma nọrọkwa nso igbochi ọlụ nke Chineke, n’anọgịdesikwa ike itinye echiche dị iche-iche n’ime obi ndị nke Chineke. ụfọdụ ka ọ n’edu n’otu ụzọ, ụfodụkwa n’ụzọ nke ọzọ, n’enwekwa ohere ị site na ndụ nmehie nke ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, n’akpali ndụ nke anụ-arụ ha. Ọbụrụ na ha nwere ndụ nke onwe-onye na anya-uku, Ekwensu g’enwe obi-ụtọ ịnọdụ ha n’akụkụ, ma mgbe ahụ ka ọ n’ewerekwa ike ya niile duru ha igosipụta ndụ ajụọ-omume ha. Ọ bụrụ na amara nke Chineke na ihè nke ezi-okwu ya gbazere ndụ nke anya-uku, na onwe-onye ndịa na nwa oge nta, na ha enwetaghịkwa nmeri zuru oke n’ihe ndịa, mgbe ha n’anọghịkwa n’okpuru nhukụ nke nzọpụta, Ekwensu g’abata kwa ma hipu ịdị-mma na ụkpụrụ ọm’ọbụla, ma ha g’eche, na ha g’alụ ọlụ karịrị akarị. Ha g’ada mba ime ihe oma ma chefuekwa ihe niile gbasara aja ukuu ahụ nke Jisọs chụrụ n’ihi ha, ịgbapụta ha site n’ike nke Ekwensu, na ndụ ahụhụ n’enweghị olileanya.NUA 190.1

    Ekwensu were ohere nke anya-uku Judas, na ndụ onwe onye ya, ma duru ya ịtamụ ntamụ megide otite manụ ahụ nke Meri jiri dozie arụ Jisọs. Judas lere ya anya dịka oke ịla n’iyi; a ka ere ya were ego ya nye ndị ogbenye. O nweghịkwa nlekụrụ-anya n’ebe ndị-ogbenye nọ, kama ọ hụrụ onyinye afọ-ọma ahụ e nyere Jisọs dịka oke nmefu. Judas kwere onye nwe ya ọnụ-ahia dịka ọ zụrụ ya ire ya mkpụrụ ọla-ọcha ole na ole. A hụkwara m na ufọdụ ndị dịka Judas n’etiti ndị sị na ha n’echere onyenwe ha. Ekwensu bụ onye na’tụrụ ha ụka, ma ha amataghị ya m’ọli. Ọ bụghị ntụpọ nke anya-uku m’ọbụ onwe onye ka Chineke pụrụ ile-anya ebere. Ọ kpọrọ ya asị, ọ n’emekwa ekpere na arịrịọ ndị niile nwere ya ihe efu. Dịka Ekwensu hụrụ na oge ya dị mkpirimkpi, ọ n’edu ha n’ime onwe onye karị, n’ime anya-uku karịrị akarịkwa, ma ñuriakwa mgbe ọ n’ahụ ka ha nọ naanị n’ime onwe ha, e kpudoro ihe, n’ime ụkọ, na onwe-onye. Asị n’apụrụ imeghe anya nke ndị dị otua, ha ga ahụ Ekwensu na nmeri dị egwu, ka ọ na añụrị n’isi ha, na achịkwa ọchị n’amaghị ihe nke ndịa niile kwenyere na ntụm’aka ya, ma banyekwa n’ọnya ya niile. Mgbe ahụ ya onwe ya na ndị mụọ-ozi ya ga ewere ajụọ-omume na anya-uku nke madụ ndịa, che n’iru Jisọs na ndị mụọ-ozi dị nsọ, ma sitekwa n’ịta-ụta kwue, Ndịa bụ ndị n’eso ụzọ Kraist! Ha na ejikere ka a kpọrọ ha laa n’eluigwe! Ekwensu n’eleta ụzọ ọjọọ ha niile, ma werekwa ya na atụnyere akwụkwọ-nsọ, n’agba niile nke kwugịdere ihe ndịa, nụzọ were anya, ma werekwa ya che n’iru ikpasu ndị mụọ-ozi nke eluigwe iwe, na asị, Ndịa n’eso Krasit na okwu ya! Ndịa bụ mkpụrụ nke àjà Krasit na mgbapụta ya! Ndị mụọ-ozi wee wezuga iru ha site nọnọdụ ọjọọ dị otua. Chineke chọro ka ndị ya nọgịde n’ime oke nke ha mgbe niile, ma mgbe ha dara mba n’ezi-omume, ya onwe ya na adakwa mba n’ebe ha nọ. A hụrụ m na ọjọrọ-njọ n’anya Chineke ihụ ọbụna ntakịrị onwe onye n’arụ ndị n’akpọkụ áhà ya, ndị Jisọs nyere ndụ ya dị oke ọnụ-ahia n’ihi ha. Madụ ọbụla nke nwere onwe onye, na anya-uku g’adapụ n’ụzọ. Dịka Judas, onye rere onye nwe ya, ha g’ererkwa ukpụrụ oma niile, na ndụ ọma ha niile, n’ihi ntakịrị jụrụ nke ụwà. Ụdị ndị a niile ka a ga yọpu sitre n’etiti ụmụ Chineke. Ndị niile chọro eluigwe, aghaghị, site n’ume niile nke ha nwere, ikwado ụkpụrụ niile nke eluigwe. Ma kama nkpụrụ-obi ha ga ada site n’onwe onye, ha ga agbasa agbasa nịdị mma, ma ohere ọbụla g’abụ iji gaa-n’iru n’omume oma n’ebe madụ n’ibe ya nọ, ma na’abukwa, n’etokwa-eto n’ime ụkpụrụ niile nke eluigwe. E guzoro Jisọs n’iru m dịka ihe atụ zuru oke. Ndụ ya bụ nke ọchịchọ onwe-onye n’adịghị, bụrụkwa nke a hụrụ n’enweghị ikpa-oke ọbụla n’omume nke ihụnanya.NUA 191.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents