Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Ndọndọ Ukuu Ahụ

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 39—Ụwà Tọgbọrọ N’efu

    Mwee legịde ụwà anya n’oge ahụ. Ndị ajụọ-omume niile nwụru-anwụ, ozu ha tọgbọkwara n’elu-àlà niile. Ndị bi n’ụwà atawọkwarị ahụhụ nke iwe Chineke site n’ihe otiti asaa nke ikpeazụ ahụ. Ha amịwo ire ha site n’ihe mgbu ma kọchaakwa Chineke. Ndị ọzụzụ-atụrụ ụgha bụ ndị iwe Jihova dakwasịrị. Anya ha e repiawọkwarị n’ime isi ha, ma ire ha kwa n’ime ọnụ ha, ọbụna mgbe ha n’eguzo nụkwụ ha abụa. Mgbe a napụtasịrị ndị nsọ site n’olu nke Chineke, iwe nke ìgwè ndị ajụọ-omume tụgharịrị n’arụ ibe ha. Elụwà dịka ihe mikpuru n’ime ọbara, ma ózú ndị nwụrụ anwụ jupụtara site n’otu ụsọtụ ụwà rue ụsọtụ ọzọ.NUA 225.1

    Ụwà nọkwa n’ọnọdụ nke itọgbọrọ n’efu karịsia. Obodo úkú na ime obodo niile, nke àlà ọm- jijiji kwatusịrị, n’atọgbọ na nvunvu dị iche-iche. Ugwu niile chipụkwara site n’ọnọdụ ha, na akpata omimi-àlà, na ólùlù mbara dị iche-iche. Osimiri gbọpụtakwara oke-nkume dị iche-iche n’elu-àlà, ma oke-nkume ndị ọzọ ka àlà nuputasikwara, nke wusasịrị ebe niile. Elu ụwà dịkwa ka ọzara tọgbọrọ n’efu. Oke-osisi dị iche-iche ka a bupụrụ site na mkpọrọgwụ ha, ma tọgbọkwara n’elu-àlà. Ebe a bụ ebe obibi nke Ekwensu, na ndị mụọ-ọjọọ ya, ogologo puku afọ ahụ. N’ebea ka a g’akpchigịde ha, ha wee n’agagharị elu na-àlà ndịa niile mebiri emebi, ma hụ nlụpụta nke nnupu-isi ya megide iwu Chineke. Nlụpụta niile nke ọbụbụ-ọnụ ahụ o kpatara, ka ọ g’eri uru ha ogologo puku-afo ahụ. N’ihi na ọ bụ naanị n’ụwa ka a rapụrụ ya, ọ gaghị enwekwa ohere ịgagharị ụwà ndị ọzọ, ịnwa ịkpasu ndị ọzọ n’akadahieghị. Ekwensu g’ata ahụhụ n’oge nka gabiga oke. Sitekwarị n’ọdịda ya, ndụ nke ajụọ-omume ya niile ka ọ n’etinye n’ọlụ mgbe niile. Ma mgbe ahụ a g’anapụ ya ike ya, ma rapụ ya ị na atụgharị uche na ọlụ-aka ya niile sitekwa n’oge ahụ ọ dara, ma n’elekpukwa anya site n’obi ọlịlọ-miri n’oke ụjọ n’ihi ọdị n’iru ya dị oke egwu, mgbe ọ g’ahụju anya banyere ihe ọjọọ niile nke o meworo, ma narakwa ntaramahụhụ n’ihi nmehie niile nke ọ kpatara.NUA 225.2

    Mgbe ahụ a nụrụ m olu nke nmeri site na ndị mụọ-ozi, na sitekwa na ndị nsọ a gbapụtara, nke dakwara dịka nke sitere na iri puku ihe eji abụ abụ, n’ihi na ha apughịkwa ibụ ndị a kpasuru iwe na ndị a nwara ọnwụnwa site n’aka Ekwensu, ma ndị bi n’ụwà ndị ọzọ ka a napụtakwara site na nnoyere ya na ọnwụnwa ya niile.NUA 227.1

    Mgbe ahụ a hụrụ m oche-eze dị iche-iche, ebe Jisọs na ndị-nsọ a gbapụtara n’anọkwasikwa ha; ndị-nsọ na achikwa ka ndị-eze na ndị nchụ-àjà nke Chineke, ma ndị ajụọ-omume nwụru-anwụ ka e kepkwara ikpe, omume ha niile ka a tulekwara site n’akwụkwọ nke ụkpụrụ, bụ iwu Chineke, na e kpekwara ha ikpe dịka omume niile nke e mere n’anụ-arụ. Jisọs, site n’ịdị n’otu nke ya na ndị-nsọ, rọpụtaara ndị ajụọ-omume, oke ahụhụ nke ha na aghaghị ịta, dịka ọlụ ha niile si dị, ma e dekwara ya n’akwụkwọ nke ọnwụ n’isi áhà ha niile. Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya ka Jisọs na ndị-nsọ kpekwara ikpe. Ntaramahụhụ nke Ekwensu dịkwa ukuu karịa nke ndị niile o duhieworo. Ọ karịrị ahụhụ ha nke ukuu na ọdịghị ụzọ a pụrụ iji ya tụnyere nke ha. N’ime nka, ndị niile ahụ o duhieworo àláworị n’iyi, ma Ekwensu n’adịkwa ndụ ịta ahụhụ ogologo mgbe gaa n’iru.NUA 227.2

    Mgbe ikpe nke ndị ajụọ-omume gwụsịrị, n’ọgwụgwụ nke puku afọ ahụ, Jisọs rapụrụ obodo ahụ, ma ahịrị ụgbọ nke igwe ndị mụọ-ozi sooro ya. Ndị nsọ sokwara ya jee. Jisọs rịdatara n’elu oke ugwu, nke, n’otu mgbe ahụ O metụrụ ya ụkwụ, na ọ gbazere ma bụrụ obosara àlà uku dị larịị. Mgbe ahụ anyị lepụrụ anya n’elu ma hụ obodo ukuu ahụ magburu onwe ya, nke nwere ntọ-àlà iri-n’abụa, ọnụ-ụzọ ámá-iri n’abụa, ato n’akụkụ ọbụla, nke mụọ-ozi nọkwa n’ọnụ ụzọ-àmà ọbụla. Anyị tipụrụ mkpu, obodo ahụ, obodo ukuu ahụ! Ọ n’arịdata site n’ebe Chineke nọ n’eluigwe! O wee rịdata n’ịdị mma ya niile n’ebube ya n’enwụ-enwụ, wee nọkwasị n’elu-àlà ahụ dị larịị nke Jisọs doziri nye ya.NUA 227.3

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents