Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Ndọndọ Ukuu Ahụ

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 18—Ihe-Omimi Nke Nmebi-Iwu

    ỌBụworị atụmatụ nke Ekwensu ịdọrọ echiche ụmụ madụ site n’ebe Jisọs nọ tụkwasị ya na madụ, na imebi nhazi nke onwe onye. Ekwensu dara n’atụmatụ ya mgbe ọ nwara Ọkpara Chineke ọnwụnwa. O meriri karịa mgbe o bikutere madụ dárá-ada. Ụkpụrụ nke okpukperechi ndị nke Kraist ka e merụkwara. Ndị Pop na ndị nchụ-àjà chekubere iwere ọnọdụ dị elu, ma kuziekwara ndị madụ ilekwasị ha anya ịgbaghara ha nmehie ha, karịa ha ilekwasi Kraist anya n’onwe ha. E zonariri ha akwụkwọ-nsọ, ka ha wee kpuchie eziokwu ndịa niile ga-àmà ha ikpe.NUA 109.1

    E duhiere ndị madụ n’ụzọ niile. A kuziri ha na ndị Pop na ndị nchụ-àjà bụ ndị nọchitere anya Kraist, mgbe o bụ ezie na ha nọchitere anya Ekwensu; nke bu na mgbe ha na erudatara ha, o bụ Ekwensu ka ha n’efè. Ndị madụ kpọrọ oku ka e nye ha akwụkwọ nsọ; kama ndị nchụ-àjà letara ya dịka ihe ọghọm ikwere ka ha nweta okwu Chineke ha g’agu n’onwe ha, ka o g’abụ mgbe ha matara eziokwu, na nmehie ha g’apụta ihè. Eziri ndị madụ ilekwasị ndị nduhie a, ma narakwa okwu ọbụla nke sitere n’ọnụ ha, dịka okwu sitere n’ọnụ Chineke. Ha jigịdere ike nke uche madụ nke naanị Chineke kwesịrị ijide. Na ndị ọbụla nke nwara isoro ako-n’uche nke onwe ha, g’anata ụdi ikpọ-asị ahụ nke Ekwensu na ndị Juu kpọrọ Jisọs, ọbụna ndị nọ n’ọchịchị g’achọkwa iwụsị ọbara ha. E gosịrị m otu oge mgbe Ekwensu meriri n’ụzọ pụrụ iche. Imerime ndị nke Kraist ka e gburu n’ụzọ dị oke egwu n’ihi na ha g’echekwa ịdị-ọcha nke okpukperechi ha.NUA 109.2

    Akwụkwọ nsọ ka a kpọrọ asị, a gbalikwara ime ka elu ụwà ghara inwe okwu Chineke a nke dị oke ọnụ-ahia. E jiri iwu nke ọnwụ aru-ufụ machigịde igụ akwụkwọ nsọ, ọbụna akwụkwọ-nsọ niile a chọpụtara ka a gbakwara ọkụ. Ma a hụkwara m na Chineke nwere nkpachara anya pụrụ iche banyere okwu Ya. O chekwara ya. N’oge dị iche-iche, naanị akwụkwọ-nsọ ole na ole fọdụrụ, ma otu ọdị Chineke adịghị ekwe ka okwu Ya fue. Ọ bụna n’oge ikpeazu, akwụkwọ-nsọ g’abụ ihe a mubara ka ezi na ụlọ ọbụla nwe ike inweta ya. A hụrụ m na mgbe ọfọdụrụ naanị akwụkwọ-nsọ ole nole, Ọ bụuru ihe oke ọnụ-ahia na ihe nkasi-obi nye ndị n’eso ụzọ Jisọs a na kpagbu. A gụrụ ya nụzọ nzuzo, ọbụna ndị nwere ohere ọma dị elu dịka nka hụrụ ya dịka ha nweworo nkparite ụka ha na Chineke, na Ọkpara ya Jisọs, na ndị n’eso ụzọ ya kwa. Kama ohere ọma nka a gọziri agọzi riri ndụ ọtụtụ n’ime ha. Mgbe ọbụla a chọpụtara ha, a n’adọkpụrụ ha site n’ebe ha n’agụ okwu nsọ Chineke rue n’akwa nbipụ-isi ha, ma o bụ n’osisi a na e kedo ha, ma o bụ n’ụlọ nkpọrọ ebe ha g’anwụ n’enweghị ire oriri.NUA 110.1

    Ekwensu apụghị igbochi atụmatụ nke nzọpụta. A kpọgịdere Jisọs n’obe, nke O bilikwara ọzọ n’ụbọchị nke atọ. Ọ gwara ndị mụọ-ozi ya na ọ g’emekwa ọbụna ọnwụ nke obe a na nbilite n’ọnwụ ya bụrụ akụkọ na ọdịmma nke ya onwe ya. Ọ bụ nmasị ya ka ndị niile nwere okwukwe na Jisọs kwenye kwa na iwu niile metutara nchụ-àjà nke ndị Juu na onyinye niile kwụsịrị n’ọnwụ nke Kraist, m’ọbụrụkwa na o pụrụ inuru ha ga n’iru, meekwa ka ha kwenye na iwu-iri Chineke sokọrọ Kraist nwụa.NUA 111.1

    A hụrụ m na ọtụtụ nyere onwe ha n’aghụghọ Ekwensu a. Eluigwe niile maliri n’iwe, ka ha hụrụ iwu nsọ nke Chineke ka a zodoro ya ụkwụ. Jisọs na ụsụụ ndị eluigwe niile maara ọdịdị iwu Chineke nke ọma; ha matara na ọ gaghị agbanwe m’ọbụ mebie ya. Ọnọdụ-ọjọọ nke madụ kpatara iri-uju dịkasị omimi na eluigwe, nke kpaliri Jisọs ikwenye inwụ n’ihi ndị nmebi-iwu nsọ nke Chineke. Ọbụrụ na a pụrụ imebi iwu ya, madụ ka a pụrụ izọpụtakwa n’abụghị site n’ọnwụ Jisọs. Ọnwụ Kraist emebighị iwu nke Nna ya; kama ọ mụbara ya ma nyekwa ya nsọpụrụ, na akwadokwa ige-nti n’ụkpụrụ ya niile. A sị na nzukọ nọgịdere n’ịdị ọcha na ikwesi ntụkwasị obi, Ekwensu agaghị enwe ike iduhie ha, ma duru ha izọ ụkwụ na iwu nke Chineke. Site n’atụmatụ anya-ike nka, Ekwensu n’eti aka n’iru anya megide ntọ-àlà ọchịchị nke Chineke n’eluigwe na n’elu ụwà. Nnupu-isi ya mere ka a chụpụ ya site n’eluigwe. Mgbe o nupụrụ isi, n’ichọ izọpụta onwe ya, o chọro ka Chineke gbanwe iwu ya; kama Chineke gwara Ekwensu, n’iru ụsụụ niile nke eluigwe, na iwu ya a dịghị a gbanwe agbanwe. Ekwensu mara na Ọ bụrụ na o nwere ike ime ka ndị ọzọ mebie iwu Chineke na ndị ahụ a bụrụwokwa ndị nke ya; n’ihi na onye mebiri iwu ya ọbụla aghaghị inwụ.NUA 111.2

    Ekwensu kpebiri iga n’irukwa karịa. Ọ gwara ndị mụọ-ozi ya na ụfọdụ g’enwe ekworo megide iwu Chineke nke n’apughị imata ha n’ọnya nka; na iwu iri ahụ were anya nke ọma na ọtụtụ madụ g’ekwenye na ha n’adịgịdekwa; n’ihi nka ọ ghaghị ichọ ụzọ imerụ iwu nke anọ bụ nke n’egosipụta Chineke nke n’adị ndụ. O wee duru ndị nọchitere anya ya ịnwa ịgbanwe ụbọchị-izuike, ma gbanwekwa naanị iwu ahụ n’ime iri nke n’egosipụta ezi Chineke ahụ, bụ onye mere eluigwe na ụwà. Ekwensu gosịrị ha mbilite n’ọnwụ dị ebube nke Jisọs, ma gwakwa ha na site na mbilite ya n’ụbọchị nke mbụ n’izu, na Ọ gbanwere ụbọchị izuike site n’ụbọchị nke asaa bia n’ụbọchị nke mbụ n’izu. Site n’ụzọ dị otua Ekwensu jiri mbilite n’ọnwụ ahụ mejupụta ebum n’obi ya. Ya onwe ya na ndị mụọ-ozi ya ñụrịrị ọñụ na okwu ụgha nka ha doziri gara nke ọma n’ebe ndị kpọrọ onwe ha ndị enyi Kraist nọ. Ihe otu onye pụrụ ile anya dịka ihe ụjọ n’okpukperechi, nke ahụ ka onye ọzọ g’anara. Ụgha ndịa niile dị iche-iche ka a g’anabata, ma werekwa inu-ọkụ n’obi kpepụta ha. Uche nke Chineke nke e kpuhere n’ụzọ were anya n’ime okwu ya, ka e jiri okwu ụgha na omen’àlà kpuchie, nke a kuzikwara dịka iwu nke Chineke. Ma ọ bụ ezie na nduhie nka yiri ihe sitere n’eluigwe ka a g’eme ka e buru ya rue oge niile ọbụna rue kwa ọbịbịa abụa nke Jisọs, ma otu ọdị, ọbụna n’oge a niile nke okwu ụgha na nduhie, ọ dịghị mgbe Chineke nọ n’enweghị onye na agbara ya àmà. Ọtụtụ ezi ndị-àmà kwesịrị ntụkwasị-obi dị, ndị n’edebe iwu niile nke Chineke n’oge niile nke ọchịchịri na nkpagbu nke nzukọ.NUA 112.1

    A hụrụ m na ndị mụọ-ozi jupụtara nihe itụn’anya ka ha legịdere nhuju-anya na ọnwụ nke Eze nke ebube. Kama a hụkwara m na ọ bụghị ihe iju-anya nye ụsụụ nke ndị mụọ-ozi na Onyenwe ndụ na otuto, onye mejupụtara eluigwe niile n’ọñụ na ịdị ukuu, ga agbaji ihe okike niile nke ọnwụ, ma zọpụ ụkwụ site n’ụlọ mkpọrọ ya dịka onye meriri emeri. Ọ bụrukwa na otu n’ime ihe omume ndịa ka a g’eji ụbọchị izuike mara, o bụ nkpọgịde a kpọgịdere ya n’obe. Kama, a hụrụ m na ọdịghị otu n’ime ihe omume ndịa e doziri iji gbanwee m’ọbụ mebie iwu Chineke; kama ha na enye ngosi sikarịrị ike banyere agbanweghị agbanwe ya.NUA 113.1

    Ihe omume abụa ndịa nwekwara ihe e ji echeta ha. Site na isokọ na nri anyasi nke Onyenwe-anyị, na achịcha a nyawara na nkpụrụ nke vaini, anyị na egosipụta ọnwụ nke Onyenwe-anyị rue mgbe ọ gabia. Site na idebe ihe ncheta nka, ebe niile nke nhụju-anya ya na ọnwụ ya ka a n’akpọlite ọhụụ na akọ-n’uche anyị. Nbilite n’ọnwụ Kraist ka a n’echeta site na ilikọ anyị na ya na baptizim, ma kulitekwa anyị pụa site n’ili nke miri na n’oyiyi nke nbilite n’ọnwụ ya, n’ime ịdị-ọhụụ nke ndu.NUA 114.1

    E gosịrị m na iwu Chineke g’eguzosi ike rue ebigh ebi, ma dikwa n’ụwà ọhụụ rue mgbe niile ebigh ebi. Na okike ụwà, mgbe a tọrọ ntọ-àlà nke ụwà, ụmụ Chineke lekwasịrị anya obi-ụtọ na ọlụ aka nke Onye-okike, ụsụụ nile nke eluigwe tikwara mkpu-ọñụ. Ọ bụkwa mgbe ahụ ka a tọrọ ntọ-àlà nke ụbọchị izuike. Na nmechi nke ụbọchị isii nke ọlụ-okike, Chineke zuuru ike n’ụbọchị nke asaa site n’ọlụ ya niile nke Ọ lụrụ; O wee gọzie ụbọchị izuike ma dookwa ya nsọ, n’ihi na n’ime ya ka O zuru ike site n’ọlụ ya niile. Ụbọchị izuike ahụ ka e hiwere n’Iden tutu ọdịda ahụ, nke Adam na Iv debekwara, na ụsụụ niile nke eluigwe. Chineke zuru ike n’ụbọchị nke asaa, ma gọzie ya ma dookwa ya nsọ; a hụkwara m n’ọdịghị mgbe a g’ewezuga ụbọchị izuike ahụ; kama ndị nsọ a gbapụtara, na ụsụụ ndị mụọ-ozi niile, g’edebekwa ya na nsọpụrụ nke Onye-okike ukuu ahụ rue mgbe niile ebighị-ebi.NUA 114.2

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents