Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Ndọndọ Ukuu Ahụ

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 14—Mgbanwe Nke Sọl

    Ka Sọl n’eje Damaskọs n’ejidekwa akwụkwọ nyere ya ikike ijide ndị nwoke m’ọbụ ndị nwanyị n’ekwujsa Jisọs, ma dọkpụta ha Jerusalem, ndị mụọ-ọjọọ ji ọñụ-nmeri n’agba ya gburu-gburu. Ma ka ọ n’eje, n’otu ntabi-anya ihè sitere n’eluigwe nwụe gburu-gburu ya, nke mere ka ndị mụọ-ọjọọ ndịa gbafusia, ma meekwa ka Sol daa-nàlà ngwa-ngwa. Ọ nụrụ olu nke n’asi, Sọl, Sọl, gịnị mere i ji wee n’akpagbu m? Sol jụrụ sị, I bụ onye, Onye nwem? Ma Onyenwe-anyị sịrị, Mụ onwe m bụ Jisọs onye gị onwe gị n’akpagbu. Ọ bụkwa ihe sịrị ike ka ikpọ ụkwụ gị na nkume. Mgbe ahụ Sọl mara jiji ma sitekwa n’oke ụjọ wee sị, Onyenwe m, ọbụ gịnị ka I chọrọ ka m mee? Onyenwe-anyị sịrị ya, bilie ma jee n’ime obodo, a gagwakwa gị ihe n’ịghaghị ime.NUA 89.1

    Ndị-ikom n’eso ya nọkwa n’ekwughị okwu ọbụla. Naanị na ha n’anụ olu, ma ha a hụghị onye ọbụla. Mgbe ihe ahụ gabigara, na Sol bilitere ọtọ, wee meghee anya ya abụa, kama ọ hụghịkwa madụ ọbụla. Ebube sitere na ihè nke eluigwe e mewo ka o kpue-isi. Ha wee jide ya n’aka, duru ya rue Damaskọs, ebe ọ nọrọ abali-ato n’ahụghị ụzọ, n’erighịkwa ihe oriri m’ọbụ ihe-ọñụñụ. Onyenwe-anyị wee ziga mụọ-ozi ya nye otu n’ime ndị ahụ Sọl bu n‘obi ịdọkpụrụ, wee kpanyere ya ụka na ọhụụ ka o jee n’otu ụzọ-àmà a n’akpọ Streti, ma jụa ajụjụ n’ime ụlọ nke Judas banyere otu-onye a n’akpọ Sọl nke Tasiọs, n’ihi na lee, ọ n’ekpekwa ekpere, na o hụwọkwa na ọhụụ otu nwoke áhà ya bụ Ananias ka ọ n’abata, nke n’atụkwasikwa ya aka, ka o wee hụ ụzọ.NUA 90.1

    Ananais tụrụ egwu na eleghị anya na okwua ezighị ezi, o wee malite ikwusara Onyenwe-anyị ihe ọ nụworo banyere Sọl. Ma Onyenwe-anyị gwara Ananais, jee n’ụzọ gị; n’ihi na ọ bụ ụgbọ nke a rọpụtara nye m, iburu áhà m rue ndị Jentail, na ndị-eze, na ụmụ IZrel kwa. N’ihi na a ga m egosi ya ọtụtụ ahụhụ nke n’ọghaghị ihụ n’ihi áhà m. Ananais wee soro ntuzi aka niile nke Onyenwe-anyị, wee banye n’ụlọ ahụ, n’atukwasikwa ya aka n’isi ya, wee si, Nwannem-nwoke Sọl, Onyenwe-anyị, ọbụna Jisọs, onye zutere gị n’ụzọ ka I n’abia, e zitewo m, ka iwe hụ ụzọ, bụrụkwa onye e mejupụtara na Mụo-nsọ.NUA 90.2

    N’otu-oge ahụ Sọl hụrụ ụzọ, ma biliekwa, e wee meekwa ya baptizim. O wee kwusaa Kraist n’ime ụlọ ikwu niile, na ọ bụ Ọkpara Chineke. Ndị niile nụrụ ya tụrụ egwu nke ukuu; na- ajụkwa sị, Nka ọ bụghị onye ahụ nke n’ebibi ndị niile n’ekwusa áhà ahụ na Jerusalem? Ma biakwa ebe a n’out-uche ahụ, bụ ijide ha kpugara ha ndị-isi nchụ-àjà . Ma Sọl bara ụba na ike werekwa anya-ike, n’agwa ndị Juu okwu. Ndị a banyere na nsogbu ọzọ. Sọl kọpụtara ije ya niile site n’ike nke Mụo-nsọ. O were onye ọbụla anya banyere ọnọdụ Sọl megide Jisọs, na ọnụ ọkụ nke obi ya ichọpụta na, inyefe ha n’aka ọnwụ bụ ndị niile kwere na áhà ya. Ọlụ-ebube nke mgbanwe ya mere ka o wee ọtụtụ madụ anya na Jisọs bụ Ọkpara nke Chineke. Sọl kọwapụtara ije ya, na dịka ọ naara akpagbu ndị madụ rue ọnwụ, na etinyekwa n’ụlọ nkpọrọ, ndị nwoke na ndị nwanyị ka ọ n’eje Damaskọs, n’otu ntabi anya ihè dị oke-egwu nke sitere n’eluigwe nwuru gburu-gburu ya, nke Jisọs gosikwara ya onwe ya, ma zikwa ya ihe na ya bụ Ọkpara Chineke ahụ. Ka Sọl ji olu-ike na ekwusa Jisọs, ọ bụkwa nhụku sịrị ike n’onwe ya. O nwere ezi amamihe nke akwụkwọ-nsọ, ma mgbe o chegharisịrị ihe nke Chineke wapụtara n’okwu amụma niile banyere Jisọs, nke nyere ya ike ikwupụta ezi-okwu ahụ n’ụzọ were anya, na idozi okwu Chineke arọgharịrị n’ụzọ ọbụla. Site na nnọyere nke Mụo-nsọ, ọ g’eji ụzọ were anya na ike kpọrọ akọ n’uche ndị n’ege ya ntị site kwa n’olu nke amụma niile biarue n’oge ọbịbịa nke mbụ nke Kraist, wee gosikwa ha n’akwụkwọ-nsọ e mezuwori, nke metutara nhụju-anya nke Kraist, ọnwụ na nbilite n’ọnwụ ya.NUA 91.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents