Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Ndọndọ Ukuu Ahụ

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 11—Ila N’eluigwe Nke Kraist

    Eluigwe niile nọ n’eche oge-awa nke nmeri mgbe Jisọs g’arigokuru Nna ya. Ndị mụọ-ozi pụtara ịnabata Eze nke ebube, na iduru Ya na nmeri rue eluigwe. Mgbe Jisọs gọzisịrị ndị n’eso ụzọ ya, a napụrụ ya site n’etiti ha, wee welie ya elu. Ma dịka ọ n’edu ụzọ n’arigo elu, igwe madụ ahụ ndị Ọ dọkpụrụ bụ ndị ahụ e mere ka ha bilie n’oge nbilite n’ọnwụ ya sọkwa ya. Ụsụụ ndị eluigwe biakwara; mgbe ọtụtụ ndị mụọ-ozi n’apughị iguta ọnụ nọkwa n’eluigwe n’echerekwa mbata Ya. Ka ha n’arigo elu rue obodo nsọ ahụ, ndị mụọ-ozi ndị dugara Jisọs tipụrụ mkpu si Welie nu isi unu elu, unu ọnụ-ụzọ nile, ka e buliekwa unu elu, unu ọnụ-ụzọ nke ebigh-ebi nile, na Eze nke ebube g’abatakwa. N’otu nkume ndị mụọ-ozi nọ n’obodo ahụ, ndị n’echerekwa ọbịbịa Ya, tipụrụ mkpu n’oke-olu si, onye be Eze ebube nka? Ndị mụọ-ozi n’edu Ya na nmeri zaghachịrị si, ọ bụ Onyenwe-anyị dị ike dịkwa ukuu! Onyenwe-anyị dị ike n’agha! Welienu isi unu elu, unu ọnụ-ụzọ niile! Weliekwa nu ha elu, unu ọnụ-ụzọ nke ebighị-ebi, ka Eze nke ebube bata. Ọzọkwa ụsụụ niile nke eluigwe tiri-mkpu sị, onye bu Eze nke ebubea? Ndị mụọ-ozi n’edu Ya jiri olu abụ-ụtọ wee zaa sị, ọ bụ Onyenwe-anyị nke ụsụụ niile! Ọ bụ ya bụ Eze nke ebube! Ma ahịrị-ugb nke eluigwe gafere banye n’ime obodo ahụ. Mgbe ahụ ụsụụ niile nke eluigwe gbakọrọ gburu-gburu Ọkpara Chineke bụ Onye-isi ha dị ukuu, ma sịtekwa na nkwanye ùgwù dị omimi wee rudata isi ha, n’atụsakwa okpu-eze ọma ha nụkwụ Ya. Mgbe ahụ ha wee kpatụ aka n’ụbọ akwara ọla edo ha, ma sitekwa n’olu abụ-ụtọ, ha mejupụtara eluigwe niile n’iba-uba nke ụda-abụ ha nye nwatụrụ ahụ e gburu nke n’adịkwa ndụ ọzọ n’ịdị ukuu na ebube.NUA 76.1

    Ọzọ, e gosịrị m ndị n’eso ụzọ ya ka ha sitere n’iri-uju legịde anya n’eluigwe ileta nke ikpeazụ bụ Onyenwe ha nke n’arigo n’eluigwe. Ndị mụọ-ozi abụa nke e gbọkwasịrị uwe-nwụda ọcha guzoro n’akụkụ ha, wee sị ha, Unu ndị-ikom nke Galili, gịnị mere unu guzoro n’ele anya n’eluigwe? Jisọs nka, onye a napụrụ unu laa n’eluigwe, g’abiakwa n’otu aka ahụ dịka unu hụrụ Ya ka Ọ n’ala n’eluigwe. Ndị n’eso ụzọ Ya na nne Jisọs, hụrụ mgbe Ọkpara Chineke n’arigo n’eluigwe, ha nọgịdekwara abali ahụ ikparịta ụka banyere ọlụ ebube Ya dị iche-iche na ihe itụ n’anya ha dịkwa ebụbe ndị meworo na nwa oge nta ndịa.NUA 77.1

    Ekwensu kparitere ụka ya na ndị mụọ-ozi ya, ma site nịkpọ asị dị-ilu megide ọchịchị Chineke, ọ gwara ha na ọbụna mgbe ya n’enwe ikike nke elu ụwà, mgbali ha aghaghị ịdị ike okpukpu-iri megide ndị n’eso ụzọ Jisọs. Ọdịghị ihe ọbụla ha metara Jisọs; kama ndị n’eso ụzọ ya ka ha n’aghaghị ikwatu m’ọbụrụ na o kwere mee, ma burukwa ọlụ a rue ọgbọ niile, imegịde ndị niile g’ekwere na Jisọs, na nbilite n’ọnwụ Ya na nlaghachi n’eluigwe ya. Ekwensu mere ka ndị mụọ-ozi ya mara na Jisọs e nyewori ndị n’eso ụzọ ya ike ichụpu ha, ibara ha mba, na igwọ ndị niile ọ g’eti ihe-otiti. N’ihi nka ndị mụọ-ozi Ekwensu pụrụ n’ike dịka agụ nke n’agbọ ụja n’achọ ibibi ndị n’eso ụzọ Jisọs.NUA 78.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents