Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Ndọndọ Ukuu Ahụ

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 24—Ozi Mụọ-ozi Nke Abụa Ahụ

    NZukọ ndịa a chọghị inara ihè nke ozi mụọ nke mbụ ahụ, ma dịka ha jụrụ ihè ahụ nke sitere n’eluigwe ha dapụrụ site n’iru-ọma nke Chineke. Ha tụkwasịrị obi n’ike nke onwe ha, ma site n’imegịde ozi nke mbụ, ha dotere onwe ha n’ọnọdụ ha n’apụghị ihụta ihè nke sitere n’ozi mụọ-ozi nke abụa. Kama ndị niile Chineke hụrụ n’anya, ndị a n’akpagbu, zara ọkpụkpọ-oku nke ozi ahụ, Babilon adawo, ha wee rapụ nzukọ ndị ahụ dárá-ada.NUA 145.1

    Mgbe ozi mụọ-ozi nke abụa ahụ n’emechi, a hụrụ m ihè ukuu sitere n’eluigwe n’awakwasị ndị nke Chineke. Ihè a n’ achawapụtakwa dịka nke anyanwụ. M wee nụkwa olu nke ndị mụọ-ozi ka ha n’eti, Lee Onye n’alụ nwụnye ọhụụ na a bia, pụa nụ zute ya!NUA 145.2

    Mkpu nke etiti-abali ahụ ka e nyere ka o tinye ume n’ozi mụọ-ozi nke abụa ahụ. E zipụrụ ndị mụọ-ozi sitere n’eluigwe ikpọte ndị nsọ ndị dara-mba n’obi, na ijikere ha n’ihi ọlụ ukuu ahụ chere ha n’iru. Ndị nwere amamihe karị abụghịkwa ndị mbụ natara ozi nka. E ziri ndị mụọ-ozi ijekuru ndị wedara onwe ha n’àlà, dịkwa ike n’okwukwe, ma rugidekwa ha itisi mkpu ahụ ike, Lee ka Onye n’alụ nwụnye ọhụụ n’abia, pụa nụ izute ya. Ndị ahụ niile e nyere iti-mkpu ahụ n’aka mere ngwa-ngwa, ma sitekwa n’ike nke Mụo-nsọ, wee gbasa mkpu ahụ, ma kwalie kwa ụmụ-nna ha ndị dara-mba n’obi. Iti-mkpu nka e guzoghị n’amamihe na nmụta nke ụmụ madụ, kama nike nke Chineke, na ọbụna ndị-nsọ ya niile ndị nụrụ nkpua arapụghịkwa ya. Ndị niile karị ike na ndụ nke ime-mụọ bụ ụzọ nata ozia, ma ndị niile n’edu edu n’ọlụa n’oge gara aga bụ ndị ikpeazu natara ya wee nyekwa aka imụba ụda mkpu ahụ, Lee Onye n’alụ nwụnye ọhụụ n’abia, pụa nụ izute ya.NUA 146.1

    Nakụkụ àlà niile, e nyere ihe banyere ozi mụọ-ozi nke abụa ahụ, ma mkpu ahụ n’agbawekwa obi nnụkuru-nnụ madụ. O jere site n’obodo rue n’obodo, sitekwa n’ebe obibi rue n’ebe obibi, ọbụna ruekwa mgbe a kwalisịrị ndị nke Chineke niile n’echere oge ahụ. Ọtụtụ e kweghịkwa ka ozi nka banye na nzukọ ha, ma igwe ọgbakọ ndị nwere àmà ahụ dị ndụ n’ime onwe ha rapụrụ nzukọ ndịa dárá-ada. Ọlụ ukuu ka a luzuru site na mkpu etiti-abalị ahụ. Ozi ya bụ ozi nke n’enyocha obi, ma durukwa ndị kwere na ya ichọsi omume ya ike n’onwe ha. Ha matara na ọ dịghị mgbe ha pụrụ idabere n’arụ ibe ha.NUA 146.2

    Ndị nsọ ahụ niile jiri ọnụ-okụ n’obi chere onyenwe ha site kwa n’obubu-ọnụ, iche-nche na inọgịdesike n’ekpere. Ọbụna ndị ajụọ-omume jikwa mgbafu-obi n’ele anya oge ahụ, mgbe ọ n’adị ka a kpasuru igwe mba imegịde ozi a ka ha n’egosipụta mụọ nke Ekwensu. Ha kwara emo na emekwa ihe-ọchị, ka a n’anụ ebe niile, ọ dịghị onye ọbụla matara ụbọchị na awa ahụ. Ndị mụọ-ọjọọ na a ñurịkwa ọñụ nke nmeri gburu-gburu ha, n’arụgịdekwa ha imesi obi ha ike, na ijụ ihe ọbụla nke sitere n’eluigwe, ka ha wee jisie ha ike n’onya ha. Ọtụtụ kwupụtara na ha n’ele anya onyenwe ha, bụ ndị n’enweghịkwa oke n’okwu a. Ebube nke Chineke ha hụworo, nweda n’àlà na nguzosike nke ndị na echere, na ihe ngosipụta dị ukuu ndịa niile, mere ha ị si na ha natara ezi-okwu ahụ. Kama ha abụghị ndị chegharịrị echegharị. Ha a nọghịkwa na njikere. Mụọ nke nnọgịdesike n’ekpere dị nro ka ndị nsọ nwetara ebe niile. Odido-nsọ dị nro na a dịkwara ha. Ndị mụọ-ozi nwere nmasị dị omimi e letawori nlụpụta ya, ma n’ebulikwa ndị niile natara ozi nke eluigwe ahụ elu, ma n’adopụtakwa ha site nihe niile nke ụwà ka ha nweta ihe nketa dị ukuu site n’isi iyi nke nzọpụta. Mgbe ahụ Chineke nakweere ndị nke ya niile. Jisọs lekwasikwara ha anya n’obi-ụtọ. Oyiyi ya pụtakwara ihè n’ime ha. A chụwọkwa ha àjà zuru oke, na odịdo nsọ niile, wee n’ele anya ka a gbanwe ha rue anwụghị-anwụ. Kama a kpadoro ha inweta kwa nkpọchụ-iru ọzọ dị-ilu. Oge nke ha n’echere, inweta nnapụta gafere. Ha nọgịdekwara n’elu ụwà, ma ihe nlụpụta nke ọbụbụ-ọnụ a adịghị apụta ihe karị. Ha a tukwasiwokwa uche ha niile n’eluigwe, ma sitekwa n’olileanya dị ụtọ, ha e detuwọkwa nzọpụta nke anwụghị-anwụ ire, ma olileanya ha e mezughị.NUA 147.1

    Ụjọ ahụ nke dakwasiworo ọtụtụ n’ime ụmụ madụ a pụghị n’otu mgbe ahụ. Ọ bụghị otu mgbe ahụ ka ha ñụrịrị ọñụ nmeri ha megide ndị ahụ nwere mkpọchụ-iru. Kama ebe nọdịghị oke iwe nke Chineke a hụrụ anya ha natara, ụjọ ahụ ha nwere na mbụ rapụrụ ha, ha wee malitekwa ọchị ha, nkwamemo na njakịrị ha. Ndị nke Chineke ka e letakwara ọzọ, ma nwalekwa. Ụwà chịrị ọchị, kwaa emo, ma taakwa ha ụta; ma ndịa niile kweworo n’enweghị obi-abụa na Jisọs g’abia mgbe ahụ ikpọlite ndị nwụrụ-anwụ, ma gbanwekwa ndị nsọ dị ndụ, ma narakwa àlà-eze ahụ, ma nwerekwa ya ebighị-ebi, dịrị ka ndị n’eso ụzọ Kraist. Ha e wepụwo Onyenwem, na a mataghịkwa m ebe ha dotere Ya.NUA 148.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents