Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ihẹ Ize Ndụ

    Ọ dịghị ndị nọ n’ize ndụ karịa ndị ahụ ndị na-ekwenyeghị na Ekwensu na ndị mmụọ ozi ya dị adị. Imerime ndị mmadụ naaña ndụmọdụ ha ntị ma na-eche na ha na agbaso izu nke onwe ha. Ka anyị na-abịaru nso ọgwụgwụ oge, mgbe Ekwensu gaje iji ike niile lụa ọlụ nduhie, ọ na-agbasa ebe nile nkwenye na ya onwe ya adịghị adị. Ọ bụ ụkpụrụ ya izo onwe ya na ụzọ o si alụ ọlụ.OdU 17.3

    Onye nduhie uku ahụ na-atụ egwu na anyị ga-amata aghụghọ ya nile. Iji kpuchie nke bụ agwa ya n’iezie, o mewo ka e gosipụta ya n’ụzọ nwere ike ịkpali nkwutọ na nleda anya. Ọ naalọ ya ụtọ mgbe a na-esepụta ya dịka ihe na-atọ ọchị, ihe gbagọrọ agbagọ n’ụdịdị ya, na ihe bụ ọkara anụmanụ na ọkara mmadụ. Ọ na-amasị ya ịnụ ka eji aha ya eme ihe egwuregwu na ihe ịkwa emo. N’ihi na o werewo nka dị ukuu kpuchie onwe ya, ajụjụ a naajụ n’ebe nile bụ nke a: “Ọ dị onye dị otu ahụ dị adị n’ezie? Ọ bụ n’ihi na Ekwensu nwere ike ịchị n’akọ na uche ha ngwa ngwa bụ ndị ahụ ndị na-amaghị nhuku ya ka okwu Chineke ji na-ekpughere anyị ngwa agha ya dị iche iche, ka anyị we nọọ na nche.OdU 18.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents