Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ghọta Ihe E Deworo N’akwụkwọ-Nsọ

    Mụọ nke ndi mụọ-ọjọ n’ọdịdị nke ndị ezi-n’ụlọ anyị na ndị enyi anyị ha gēnweta obi anyị ikwenye na ha, na ọlụ ihe iribama ha di iche iche. Ma anyị aghaghị iguzogide ha site n’ezi-okwu nke akwụkwọ-nsọ na ndị nwụrụ-anwụ adịghị ama ihe ọbụla na ndịa nāpụta ugbua bụ naanị mụọ nke ndị mụo-ọjọ.OdU 47.2

    Ndị nile n’enweghị okwukwe e doro-ukwù nke ọma site n’akwụkwọ-nsọ ka a gēduhie ma meriekwa. Ekwensu “nālụ ọlụ nile nke ndụhie na ọlụ nile nke ajọ-omume,” ma ndụhie ya nile gābakwa ụba nāga niru. Ma ndị nile nāchọ amamihe nke ezi-okwu nēmekwa ka mkpuru obi ha dị ọcha site n’irube-isi gēnweta ezi nchekwa n’ime Chineke nke ezi-okwu. Onye nzọpụta gādị ngwa n’izipu mụọ-ozi nile ọbụla site n’elu-igwe ichekwa ndị nke Ya karị irapụ Ekwensu ka o merie ọbụna otu mkpuru obi nke dabeere na Ya. Ndị nile nākasi onwe ha obi n’elu okwu ụgha nke sị na ọdịghị ntaramahụhụ ọbụla dịrị onye nmehie, bụ ndị nātụgharị eziokwu nile ahụ nke elu-igwe nyere dịka ihe ogbụgbo dịrị ụbọchị nsogbụ, gānabatakwa ụgha nile nke Ekwensu nēnye, bu nrụgidesiike aghụghọ nile nke dị n’ofufe mụo-ọjọ.OdU 47.3

    Ndị nākwa-emo ji okwu nile nke akwụkwọ-nsọ nēme ihe-ọchị banyere atụmatụ nke nzọpụta na ikpe-ndozi-ihe nke a gēji leta ndị n’anabataghị ezi-okwu. Ha nēnwe nhuku dị ukuu nēbe ndị uche ha nēzughi-oke, nādịghịkwa ike ma-ọbụ ndị-ujo a maghị nke-bụ-nkè n’ụzọ ige-ntị n’ụkpụrụ nile nke iwu Chineke. Ha enyechasiwokwarị onye ọnwụnwa ahụ onwe ha, bụrukwa ndị jikọrọ onwe ha na ya n’ịdị n’otu, ndị a gbajụkwara na mụọ ya, na ọ dịghịkwa ihe nēmetụ ha n’uche itọpụ onwe ha site n’ọnya ya.OdU 47.4

    Ntọ-ala nke ọlụ Ekwensu ka e doro site n’okwu-ụgha mbụ ahụ a gwara Iv n’Iden: “Unu a gaghị anwụ nezie.” “N’ubọchị ahụ nke unu gēri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a gēmehepụ anya unu, unu wee bụrụ ndị dịka chi, nāmarakwa ezi-ihe na ihe-ọjọ.” Jenesis 3:4, 5. Ụdị ọkàcha-mara nke nduhie ya ka a gēzutekwa n’ụbọchị ndia fọdụrụ n’oge ikpeazụ. Onye-amụma nēkwukwa si: “M’wee hụ ndị mụọ atọ n’adịghị ọcha, dịka awọ;..... nihi na ha bụ mụọ nke ndị mọọ-ọjọ, nēme ihe iribama di iche iche; ndị nāpukurukwa ndịeze nke elu-ụwa dum madụ bi, ime ka ha zukọọ ibu-agha nke oke ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile.” Mkpughe 16:13, 14.OdU 48.1

    Ewezuga ndị echekwara n’ike nke Chineke site n’okwukwe dị n’ime okwu Ya. Ụwa nile ka a gēdubakwa n’ime ogó dị iche iche nke ọlụ ndụhiea. Ndị madụ dịka ndị nọ n’ura, ka e ji aghụghọ nēduba n’ebe nchebe ha rue ịla-niyi, bụrụkwa ndị gēteta n’ụra ha naanị site na mwụsa iwe nke Chineke.OdU 48.2

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents