Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ụkpụrụ Nile Ka E Kwupụtara

    “Mu onwem gēnye onye akpịrị nākpọ nkụ miri site n’isi-iyi miri nke ndụ ahụ n’efu.” Nkwa nkaa dịrị nanị ndị akpịrị nākpọ nkụ. “Onye nke nēmeri emeri gēketa ihe ndia nile; M’gābụkwara ya Chineke, ya onwe ya gābụkwaram nwa.” Mkpughe 21:6, 7 Ọnọdụ nile ka a kọwapụtara. Iketa ihe nile, bụ na anyị aghaghị imeri nmehie.OdU 33.1

    “Ọ gaghị adịrị onye ajọ-omume nma” Eklesiastis 8:13 Onye nēme nmehie nākpadoro onwe ya iwe “iwe nye onwe gị n’ụbọchị iwe na mkpuhe nke ikpe ziri ezi nke Chineke; Onye gēnyeghachi madụ obụla dịka ọlụ ya nile si dị” “Mkpagbu na oke ihe mgbu nye mkpụrụ-obi nke madụ ọbụla nēme ajọ omume.” Ndị Rom 2:5, 6, 9.OdU 33.2

    “Ọdịghị onye ọbụla nke nākwa-iko, ma-ọbụ onye n’adịghị ọcha, ma-ọbụ onye anya-uku, nke bụ onye nēkpere arụsị, nwere nketa ọbụla n’alēze nke kraist na Chineke.” “Ngọzi nādịrị ndị nēme iwu ya nile, ka ọ diri ha ikere oke n’osisi nke ndụ ahụ, ma nwekwa ike ibanye site n’ọnụ-ụzọ nile nke ime obodo ahụ. Nihi n’azụ-obodo ka ha dị bụ nkita nile, ma ndị nile nāgwọ nsi, na ndị nile nākwa iko, na ndị ogbu madụ nile, na ndị nēkpere arụsi, na onye ọbụla nke nāhụ ụgha n’anya nēmekwa ya.” Ndị Efesọs 5:5; Mkpuhe 22:14, 15.OdU 33.3

    Chineke enyewo ụmụ madụ nkwuputa nke usoro o ji emeso nmehie. “Ndị ajọ omume nile ka Ọ gēbibi”. “Ndị nmebi iwu nile ka a gālakọta niyi n’otu. Ọdị-niru nke ndị ajọmume ka a gēbipụ. Abụọma 145:20; 37:38. Ikike nke ọchichi Chineke gākwatu nnupu-isi, ma ụgwọ ihe ọbụla site n’ikpe ziri-ezi gēnwekwa otuolu ya na agwa nke Chineke dịka onye ebere na onye nēnyechasị ihe ọma nile.OdU 34.1

    Chineke adịghị akwagide uche akwagide. O nweghị ihe-ụtọ ọbụla na nrube isi nke a rụgidere-arụgide. Ọ bụ ọchịchọ Ya na ihe okike nile nke ọlụ aka Ya gāhụ ya n’anya nihi na O kwesịrị ka a hụ Ya n’anya. Ọ chọrọ ka ha rubere Ya isi nihi na ha nwere ezi nghọta nke amamihe Ya, ikpe Ya ziri-ezi na ịdị nma Ya n’ụba.OdU 34.2

    Ukpụrụ nile nke ọchịchị Chineke nwekwara otu-olu n’ụkpụrụ nke onye nzọpta “Nāhụnụ ndị iro unu nanya” Matiu 5:44. Chineke nēweta ikpe ziri ezi n’ebe ndị ajọ-omume nọ nihi ọdị-nma nke elu ụwa nile ọbụna nihi ọdị-nma nke ndị nile ikpe Ya rutere arụ. Ọ gēme ha obi-ụtọ ma obụrụ na Ọ pụrụ ime ya. Ọ nāgbakwa ha ogige site na mkpụrụ nile nke ịhụnanya ya ma n’emekwara ha ebere; kama ha nēme ịhụnanya Ya ihe efu; nēmebikwa iwu Ya, ma jụkwa ebere Ya. Ka ha nọgidere nānara onyinye Ya nile, ha nọkwa n’eleda Onye nēnye onyinye ahụ. Onye nweanyị nānagide ha ogologo mgbe n’uche ọjọ ha; kama ọ gadọkọta ndị nnupu-isi ndịa nye onwe ya, ma rụgidekwa ha ime uche Ya?OdU 34.3

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents