Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Agaghị Eduhie Ndị Nke Chineke

    Ma na agaghị eduhie ndị nke Chineke. Nkuzi nile nke Kraịst ụgha nke a enweghị otu olu ya na Baịbụlụ. O mere ka ngọzi ya nile rute ndị ahụ nabatara akara nwa anụ ọhia na ndị nabatara onyonyo ya, bụ ndị Baịbụlụ kwuru sị na iwe na ọnụma nke Chineke ga-adakwasị.OdU 87.1

    Na ịganiru, agaghị ekwe ka Setan mezupụta ụdịdị nile nke ọbịbịa Kraịst. Onye Nzọpụta ahụ dọrọ ndị nke Ya aka na ntị banyere nduhie ha na ọnọdụ ndị dị otu a. “kraist ụgha dị iche iche ga-ebilikwa, tinyere ndị amụma ụgha; ha ga-egosipụta ihe ịrịbama na ihe dị ịtụnanya dị iche iche; rute n’ogo dị elu, nke bụ na ọ bụrụ na ọ dị mfe, ha ga-eduhie ndị arọpụtara...N’ihi nke a, ọ bụrụ na ha asị unu, ma le, Ọ nọ n’ime ọzara; esokwala ha: ma le, Ọ nọ n’ime ụlọ; unu ekwela. N’ihi na dịka amụma si na ọwụwa anyanwụ pụta, gosikwa onwe ya rue ọdịda anyanwụ; otu a ka ọbịbịa nke Nwa Nke Madụ ga-adị”. (Matiu 24:24-27). Lekwa Matiu 25:31; Nkughe 1:7; 1 Ndị Tesalonaịka 4:16,17. Ụdịrị ọbịbịa nke a, o nweghị ụzọ Ekwensu ji emezupụta ya kpọm kwem. Elu ụwa dum madụ bi ga-ahuzu ya anya.OdU 87.2

    Ọ bụ nanị ndị na-amụsi Baịbụlụ ike, bụ ndị nabatara ịhụnanya nke eziokwu ka-aga ekpuchite na ikike nke nduhie nke ga-adọrọ ụwa nile na agha. Site na ọgbụgba ama nke Akwụkwọ Nsọ, ndị a ga-amatazu onye nduhie ahụ na aghụghọ ya nile. Ndị nke Chineke, ha ga-eguzokwa ugbu a kpọm kwem n’elu okwu Chineke ka ọnọdụ nke ga-eme ka ha rapụ ịbụrụ ndị ihe ha letara n’anya ga-eduhie? Ha ga-anọrọ ọnọdụ n’ime ọgbaghara di otu a, ijigidesi Baịbụlụ, nanị Baịbụlụ ike?OdU 87.3

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents