Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Iwu Nke Nnwere-Onwe-Onye

    Ọtụtụ ndi ozizi nke okpukperechi nēkwu na Kraist sitere n’ọnwụ ya mee ka iwu ghara ịdịkwa ọzọ. Ụfọdụ nēgosikwa ya dịka yok nke n’egbu-egbu, ma n’itụnyere “agbụ nke oru” ahụ sitere n’iwu, ha wee negosi “nnwere onwe-onye” dịka ihe añuri nke a gērite site n’ozi-ọma.OdU 52.1

    Kama ọbụghi otua ka ndị amụma na ndị ozi hụtara iwu nsọ nke Chineke. Devid kwuru sị M’gējegharikwa n’ebe, sara mbara nihi na ama Gi nile kam nāchọsike.” Abụọma 119:45. Jems onye-ozi nke Kraist kpọkwara iwu-iri ahu dịka: “iwu zuru-oke bụ iwu nke inwe-onwe onye” Jems 1:25. Onye Nkpuhe ahụ nēkwupụta ngọzi n’isi ndi “nēdebezu iwu Ya nile, ka ha wee nwee oke n’ebe osisi nke ndụ ahụ di, ma sitekwa n’ọnụ-ụzọ ama ahụ nile baa nime obodo ahụ.” Nkpughe 22:14.OdU 52.2

    A si na o kweworo mee bụ igbanwe iwu ahụ ma-ọbụkwa wepụ ya, ọdịghịkwa mkpa na Kraist nwụrụ ka a zọpụta madụ site na ntaramahụhụ nke nmebi iwu. Ọkpara nke Chineke biara “ime ka iwu Ya di ukuu na ime ka ọ dị ebube” Asaia 42:21. Owee si “Unu echela na a biaram imebi iwu Chineke”; “Rue mgbe elu-igwe na ala gāgabiga ọ dịghị otu ihe ọbụla dịkasịrị nta gāgabiga n’iwu ahụ ma-ọlị.” Gbasara Onwe Ya O kwuputakwara si, “Ọ dim ezi-ụtọ ime uche Gi, Chinekem; iwu Gi dikwa nime obim.” Matiu 5:17, 18; Abuọma 40:8.OdU 52.3

    Iwu nke Chineke ka a nāpụghi igbanwe, ihe mkpughe nke agwa Onye mere ya. Chineke bụ ihụnanya, iwu Ya bụkwa ihụnanya. “ya mere ịhụnanya bụ idebezu iwu.” Ka onye ọbụ-abụ nēkwu, “Iwu gi bụkwa ezi-okwu ahu”; “ihe nile I nyere n’iwu bụkwa ezi-omume.” Pọl nēkwuputakwa sị, “Iwu ahụ di nsọ n’ezie, ihe e nyere n’iwu dikwa nsọ, zikwa ezi, bụrụkwa ezi-ihe.” Ndị Rom 13:10; Abụọma 119:142, 172; Ndị Rom 7:12. Iwu nke dị otua a ghaghi ịbụ ihe nādigide-adigide dịka Onye mere ya.OdU 52.4

    Ọ bụ ọlu nke nnwogha na odido-nsọ ime ka ụmụ madụ na Chineke di n’udo site n’ikpọta ha n’inwe otu-olu n’ụkpụrụ nile nke iwu Ya. Na nmalite, madụ nọworo na nkwekọrite zuru oke n’iwu nke Chineke. Kama nmehie kewapụrụ ya site n’ebe Onye keworo ya nọ. Obi ya nọwokwara n’agha ya na iwu nke Chineke. “Nihi na uche nke anụ-arụ na Chineke di n’iro; nihi na e doghi ya n’okpuru iwu nke Chineke, nihi na apụghịkwa ido ya n’okpuru ya.” Ndị Rom 8:7. Kama “Chineke hụrụ ụwa n’anya otua na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ naanị Ya,” ka madụ bụrụ onye e meziri agbata ya na Chineke, nke e weghachikwara n’inwe otu-olu ya na Onye kere ya. Mgbanwe nkaa bụ ọmụmụ-ọhụ ahụ, nke ma ọ bụghị otua ọ gaghị ahụkwa ala-eze nke Chineke.” Jọn 3:16, 3.OdU 53.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents