Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Okwu-Ụgha Mbụ Ahụ

    Onye ahụ nke kwere nkwa nime egeghị ntị bụụrụ onye nduhie ukuu ahu. Ọbụna nkwupụta nke agwọ ahụ n’ogige Iden si: “Unu agaghị anwụ nezie” - bụkwaara ozi nke mbụ e kwusara bayere anwụghi-anwụ nke mkpụrụ-obi. Ma nkwpụta nkaa, nke tụkwasikwara isi ya n’ikike nke Ekwensu, ka a nēmekwa ka a nụzue ya òkè site n’elu oche-ozi ndị ụkọ-chukwu nke ụmụ-madụ ndị ka n’ọnụ-ọgụgụ nānabatakwa ngwangwa dịka nne na nna anyị mbụ ahụ mekwara. Ma okwu ọnụ Chineke nke si, “Mkpụrụ-obi ahụ nke nēmehie, ya onwe-ya gānwụkwa” (Izikel 18:20), ka e mere ka ọbụrụ na, mkpụrụ-obi nke mehiere, nke ahụ agaghi anwụ, kama ọ gēbi ndụ ebighi-ebi. Asị na mgbe madụ dahiesịrị na e kwekwara ka o nwee òkè n’osisi nke ndụ ahụ, mmehie gara abụ ihe e mere ka ọ nọgide n’anwụghi-anwụ. Kama ọdịghị otu onye n’ime ezi-n’ụlọ Adam nke e nyeworo ohere ikere oke site na mkpụrụ ahụ nke nēnye ndụ. Ya mere ọdịghị onye nmehie nke nwere ndụ anwụghi-anwụ.OdU 29.2

    Mgbe ọdịda-madụ gasịrị, Ekwensu gwara ndị mụọ-ozi ya ka ha mee ka e buru ya n’uche na madụ nwere ọdịdị nke anwụghi-anwụ. Mgbe arụgidesịrị ndị madụ ịnabata okwu-ụgha nkaa, a gēdurukwa ha ikwesi-ike na onye mmehie gādị ndụ ebighi-ebi nime ndụ ahụhụ. Ugbua eze nke ochịchịrịa nēgosi Chineke dịka onye mmegwa ọchichi aka-ike, nēkwukwa na ndị nile ka ọ nātụnye n’ọkụ àlà mụọ bụ ndị n’adịghị eme ihe dị ya nma, na ọbụkwa mgbe ha nāta ikere-eze nime ọkụ ebighi-ebi ahụ ka Onye kere ha nēlekwasi ha anya n’afọ-ojuju. Otua ka Ekwensu nēyiri ọdịdị nke onye ọma madụ yikwasị n’elu ejirimara ya. Aka ike bụ ihe ekwensu. Chineke bụ ihụnanya. Ekwensu bụ onye iro ahụ nke nānwa madụ ka o mehie ma bibiekwa onye ahụ ma ọbụrụ na ọdịrị ya mfe ime. O megidere ịhụnanya, ebere na ikpe ziri ezi, bụ ụkpụrụ nke sị na ndị ajọ-omume nwụrụ-anwụ ka a nāta ahụhụ nime ọkụ nēre ere mgbe nile ebigh-ebi, na ọbụkwa nihi nmehie ndụ abalị ole n’ole e biri n’elu ụwa ka ha nānata ntaramahụhụ rue ogologo ụbọchị nile nke Chineke nādị ndụ.OdU 30.1

    Olee ebe a gāhụ ụdị ozizi nkaa nime okwu Chineke? Ọbụ omume aka-ike nke onye obi tara miri n’enweghị ahizi ka a gēji leta madụ bụ aja? Ee akwụkwọ nke Chineke adịghị ezi ụdị ozizi nkaa. “Ka Mu-onwem nādị ndụ, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Onyenwe-anyị Jehova pụta), ọnwụ nke onye nēmebi-iwu adịghị atọm ụtọ ma-ọlị; kama ọ nātọm ụtọ mgbe onye nēmebi-iwu si n’ụzọ ya chigharia, wee dị ndụ: chigharianụ, sinụ n’ụzọ ọjọ nile unu chigharia; ọ bụkwa nihi gịnị ka unu gānwụ?” Izikel 33:11OdU 30.2

    Ọ nādị Chineke ezi nma n’ilekwasị anya na ntaramahụhụ n’adịghị akwụsị-akwụsị? Ọ nākpa Ya obi-ụtọ bụ isụ-ude na ikirieze nke ndị o kere eke o jidere nime ọkụ nēre ere? Ụda akwa arụụfụ ndịa ha pụrụ ibụ abụ-ụtọ na ntị Onye ịhụnanya ya n’enweghị ụsọtụ? Lee ka nkwulu nkaa dị oke egwu! Ebube Chineke adịghị aba-ụba site nime ka nmehie nọgide-anọgide n’ọgbọ nile n’akwụsịghị-akwụsị.OdU 31.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents