Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ndị Agbapụtara Na-Añụrị Ọñụ

    Site n’ọgbọ rue n’ọgbọ, ndị nke Onye nwe anyị na-aga ije n’ụzọ dị warawara. Añụchara ha n’ime ọkụ nke mkpagbu. N’ihi Jisọs, ha nagidere iro, nkwụtọ, ịjụ onwe onye na inagide ihe ndabara dị iche iche. Ha chọpụtara ihe ọjọọ dị na mmehie, ike ya na ihe ịsụ ude dị na ya; we lee ya anya ọjọọ. Mgbe ha chetara ọchụchụ aja si n’elu a chụrụ igbochi ya, obi ha jupụtara n’ọñụ. Ịhụnanya ha dị uku n’ihi na ọtụtụ ihe ka agbaghara ha. Le Luk 7:47. Ndị soro Kraịst hujue anya, bụ ndị akwadoro ịba n’ebube Ya.OdU 97.1

    Ụmụ Chineke sitere n’ọnụ ụlọ dị iche iche, ebe ruru unyi, n’ụlọ mkpọrọ, ebe ndị ọjọọ nọ, ugwu, ọzara, na n’ime ọgba; pụta. E mere ha ihe ọjọọ dị iche iche. Ọtụtụ mmadụ gara n’ili ha n’ime ebubo dị iche iche eboro ha n’ihi na ha jụrụ ịña Ekwensu ntị. Ma ugbu a, adịghị esogbukwa ha ma ọ bụ mekpa kwa ha arụ ọzọ. Site ugbu a, ha na-eyi uwe dị oke ọnụ karịa nke ndị amara aha ha n’ụwa na-eyi. Eze ebube ehichawo anya mmiri n’anya ha. Ha we bụa abụ otuto dị ụtọ ma nwekwa otu olu. Ha were oke olu si n’ime ulo nke eligwe tie mkpu sị, “Nzọpụta dịrị Chineke anyị, Onye na- anọkwasị n’oche eze ahụ, dịkwara Nwa Atụrụ ahụ”. Ha we zaa sị, Amen. Ngọzi niile, na otuto niile, na amamihe niile, na ekele niile, na nsọpụrụ niile, na ike niile, na ume niile, dịrị Chineke anyị rue rfigbe niile ebighi ebi” Nkpughe 7:10,12.OdU 97.2

    Na ndụ anyị ga-amalite ebumnobi banyere mgbapụta. Na nghọta nke ihe nke igwe, anyị nwere ike itule ihe mweda ala, na ebube, ndụ na ọnwụ, ikpe ziri ezi na ebere nke dị n’obe; n’agbanyeghị uche anyị, anyị apụghị ịghọta ihe ọ pụtara. Akaa na uhie, ị dị ogbu na ị dị ogologo ya, nke ịhụnanya mgbapụta bụ ihe nke adịghị amata nke ọma. Adịghị aghọta ụkpụrụ nzọpụta nke ọma, ọ bụna oge ndị agbapụtara hụrụ otu esi hụ ha ma ọ bụ mara otu esi mara ha; ma site na ọgbọ rue na ọgbọ ọzọ, eziokwu na-eji nwayọ na-ekpughere obi niile na-awagharị na-achọ Ya. Ọ bụ ezie na ihe mwute na ihe mgbu dị iche iche na ọnwụnwa dị n’ime ụwa nka akwụsiwo, ewepụwokwa ihe kpatara ya, ndị nke Chineke gaenwe amamihe pụrụ iche banyere ịdị oke ọnụ ahịa nke nzọpụta ha.OdU 98.1

    Obe Kraịst ga-abụ abụ na ntụgharị uche ndị agbapụtara rue ebighi ebi. Na ebube Ya ka ha hụrụ Kraịst akpọgburu. Agaghị echefu na onye kachasị ihe nile elu n’eluigwe wedara onwe Ya ala, iweli mmadụ dara ada, ka o we buru amamikpe na ihere nke mmehie na nzonarị iru nke Nna rue oge ahụhụ nke ụwa furu na njọ gbawara obi Ya ma were ndụ Ya.Onye kere ụwa niile wezugara ebube Ya n’ebe mmadụ nọ - nke a ga-eju mmadụ niile anya. Dika ndị niile agbapụtara na-ele Onye Nzọpụta ma mara na ala eze Ya enweghị ọgwụgwụ, ha we malite ịbụ abụ sị: “Ngọzi naadịrị Nwa Atụrụ e gburu, ma were ọbara Ya gbapụta anyị nye Chineke”.OdU 98.2

    Iju anya nke obe na-akọwa ihe iju anya niile. Anyị ga-ahụ na Onye ahụ maara ihe niile enweghị ike ịtụ ụkpụrụ ọzọ banyere nzọpụta anyị ma ọ bụghị iji Ọkpara Ya chụọ aja. Ụgwọ ọlụ ịchụ aja nke a bụ inwe ọñụ na ndị niile agbapụtara juru n’ụwa, bụ ndị dị nsọ, nwe obi ụtọ, ma nwekwa anwụghị anwụ. Oke ọnụ ahịa dị uku ka e ji gbapụta mkpụrụ obi mmadụ. Nke a mere ka Nna Ya nwe obi ụtọ n’ihi ụgwọ Kraịst kwụrụ. Kraịst, mgbe ọ na-ele anya mkpụrụ nke ịchụ aja Ya dị uku, nwere ezigbo ojuju afọ.OdU 98.3

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents