Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ọgụ Ikpeazụ Imegide Chineke

    Setan kpọtụrụ ndị ikom ndị a dị ike. Ha kwusiri ike na ọnụ ọgụgụ ndị agha nọ n’ime obodo ahụ dị ole na ole iji tụnyere ha na nddị agha nke ha, n’ihi nke a enwere ike imeri ha. Ndị ịkwa nka doro anya kpụpụtara ngwa agha. Ndị isi agha kewara ndị agha ha na mpaghara na mpaghara.OdU 101.2

    N’ikpeazụ, e we sị ha gaba n’iru, igwe ndị agha a, a naapụghị ịgụta ọnụ we zọpụ njem, nke a bụ ndị agha a na-enwebeghị ọgbọ ọ bụla eji atụnyere ha. Setan bụ onye ndu ha, ndị eze na ndị ọzọ nọkwa na ụgbọ ya ịzọ ije dịka ndị agha a zụrụ azụ, ha we zọpụ ije site n’okporo ala ụwa gbawara agbawa we bata n’obodo nke Chineke. Ma site n’olu iwu Jisọs, ọnụ ụzọ nile nke Jeruselem ọhụụ ahụ ka emechiri emechi, ma ndị agha nke Setan dị njikere ịbata na obodo ahụ.OdU 101.3

    Ugbu a, Kraịst pụtara ebe ndị iro Ya na-ahụ Ya anya. N’elu elu obodo ahụ, ka oche eze nke ejiri ọla edo añụchara nke ọma tọọ ntọ ala ya. Nwa nke Chineke nọdụrụ ala n’oche eze a, gburu gburu Ya niile bụ ndị nọ n’ala eze Ya. Ebube nke Nna nke ebighi ebi naekpuchikwa Nwa Ya Nwoke. Igbu mara mara nke ọnọdụ Ya naasọpụtakwa gafee ọnụ ụzọ ndị ahụ, na-awụsakwara elu ụwa ihè Ya.OdU 102.1

    Ndị nọkarịrị nso n’oche eze a bụ ndị nwere mgbe ọ na-anụ ha ọkụ n’obi ijere Setan ozi, ndị aghụpụtara n’ime ọkụ na-ere ere, na-eso Onye Nzọpụta ha n’ikwesi ntụkwasị obi, ndị na-asọpụrụ okwu Chineke mgbe ụwa kpọrọ ihe Chineke ihe efu, nnụkwuru nnu mmadụ nke ọgbọ niile egburu egbu n’ihi okwukwe ha. Karịa nke a, bụ “bụ igwe mmadụ a na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị sitere mba niile, na ebo niile, na asụsụ niile...ndị yi uwe ọcha, ma jirikwa igu nkwụ n’aka ha” Nkpughe 7:9. Ịlụ ọgụ ha akwụsịla, ha enwetala mmeri. Igu nkwụ ahụ bụ akara nke mmeri, uwe ọcha ahụ bụ ihe ịrịba ama nke eziomume nke Kraịst nke bụ nke ha ugbu a.OdU 102.2

    N’ime igwe mmadụ ndị a, enweghị onye weere nzọpụta ya dịka ihe sitere na ịdị mma nke onwe ya. E nweghị ihe ọ bụla e kwuru banyere ahụhụ ha hụrụ. Isi okwu niile bụ, Nzọpụta nye Chineke anyi, nyekwa Nwa Atụrụ ahụ.OdU 102.3

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents