Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isiokwu 2— Isi Nke Abụa Olile Anya Eji Emeri Ihe Ọjọọ

    “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti gị na mkpụrụ ya. Mkpụrụ ahụ ga-echifia gị n’isi, gị onwe gị gaechifịa ya n’ikiri ụkwụ” (Jenesis 3:15). Iro a abụghị nke e bu pụta ụwa site n’ọmụmụ. Mgbe mmadụ mebiri iwu Chineke, ndụ ya ghọrọ ndụ mmehie, nke ya na Ekwensu nwere otu olu. Ndị mọ ozi ndị dara ada na ndị ajọ mmadụ we jikọta aka n’ịdị n’otu siri ike nke uku. Asị na Chineke abataghị nọchie n’agbata ha, Ekwensu na mmadụ gaara aba n’ọgbụgba ndụ megide eluigwe, ihe nile akpọrọ mmadụ gaara ejikọtakwa aka na nnupu isi megide Chineke.OdU 10.1

    Mgbe Ekwensu nụrụ na iro ga-adị n’etiti ya na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ ya na mkpụrụ nwanyị ahụ, ọ matara na a gaenwe ụzọ nke e ji enyere mmadụ aka iguzogide ike ya.OdU 10.2

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents