Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ọkpụkpọ Oku I Ji Dị Na Njikere

    N’ihi ụbọchị ahu nke dịkarịsịrị oke egwu, okwu Chineke na-akpọ ndị nke Ya ịchọsi iru ọma Ya ike site na nchegharị, “n’ihi na ụbọchị Jehova na-abịa, n’ihi na ọ dị nsọ”. “Doonụ obubu ọnụ nsọ, kposanụ ụbọchị ngbochi. Meenụ ka ndị Isrel zukọta, doonụ mkpọkọta Isrel nsọ, chịkọtanụ ndị okenye, meenụ ka ụmụntakịrị na ụmụ na-añụ ara zukọta...,ka ndị nchụ aja na ndị na-ejere Jehova ozi kwa akwa n’etiti ụzọ mbata Ya na ebe ịchụ aja Ya”. “Werenụ obi unu nile, werekwa obubu ọnụ m, werekwa ịkwa akwa, werekwa iti aka n’obi, chigharịkutem. Dọwakwanụ obi unu, adọwakwala uwe unu, chigharịkutenụ Jehova, bụ Chineke unu: n’ihi na Onye amara na Onye obi ebere ka Ọ bụ, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọsọ, nke na-abakwa ụba n’ebere...” (Joel 2:17, 12, 13)OdU 79.2

    Ijiri kwado ndị ga-anọ na njikere maka ọbịbịa nke Ụbọchị Chineke, ọlụ nhazigharị dị elu dị oke mkpa. Site na obi ebere Ya, Ọ nọrọ na njikere izite ozi ịdọ aka na ntị iji kwalite ndị ahụ naekwupụta na ha kwenyere Ya, ma site n’ụzọ dị otu a jikere maka ọbịbịa nke Onye Nwe Anyị.OdU 79.3

    Ịdọ aka na ntị ahụ pụtara ihe nke ọma na Akwụkwọ Nkpughe, isi iri na anọ. Nke a bụ ozi atọ gbara ọkpụrụkpụ bụ nke egosipụtara na ọ bụ ndị mọ ozi na-eme ka ọ pụta ihe, ma bụrụkwa ihe ọbịbịa abụọ nke Kraịst sochiri azụ ‘iwere ihe ubi nke ụwa’. Onye amụma ahụ hụrụ onye mọ ozi “Ka ọ na-efe n’etiti eluigwe, na-enwe ozi ọma ebighi ebi, izisara ndị nile bi n’ụwa, nye mba nile ọ bụla, asụsụ nile ọ bụla, na madụ nile, ọ na-ewerekwa oke olu tie mkpu sị, tụanụ egwu Chineke, nyekwa Ya otuto; n’ihi na oge awa nke ikpe Ya abịawo: ma kpọ isi n’ala nye Onye ahụ nke meworo eluigwe na ụwa, na oke osimiri, n’isi iyi nile (Nkpughe 14:6, 7).OdU 80.1

    Ozi nke a bụ otu n’ime akụkụ nke “oziọma ebighi ebi” ahụ.Ọlụ nke ikwusa oziọma ahụ bụ ọlụ enyefere ụmụ mmadụ n’aka. Ndị mọ ozi dị nsọ na-eduzi, ma na ikwupụta kpọm kwem oziọma nke Kraịst bụ ọlụ ndụ oru Ya ndị bi n’ime ụwa na-emezupụta”.OdU 80.2

    *Le anya n ‘ime akwụkwọ Great Controversy, Chapta 17 and 18OdU 80.3

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents