Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Okwukwe Nke Na-Anọgide Anọgide

    Oge ọlụlọ mmiri na ntaramahụhụ nke chere anyị n’iru gaachọsike ike okwukwe nke pụrụ ịnagide ike ọgwụgwụ, ịtụ nchịnchị na agụrụ nri; bụ okwukwe nke na-apụghị ịda mba, ọ bụ ezie na anwara ya nke uku. Mmeri nke Jekọb meriri bụ ihe ama nye ikike na ịdị mkpa nke ekpere. Ndị nile ga-ejigidesi nkwa nile Chineke aka ike, dịka Jekọb, ga-emeri dịka o meriri. Ịgba mgba nke metụtara madụ na Chineke - ọ bụ nanị madụ ole na ole matara ihe ọ pụtara! Na mgbe anya mmiri na obi dara mba na-eru ka osimiri megide onye na-arịọ arịrịọ nke ekpere, ọ bụ nanị madụ ole na ole na-ejigidesi nkwa nile Chineke aka ike.OdU 85.3

    Ihe anya hụrụ, ndị dị egwu, dị ụjọ, ga-apụta ihe n’oge naadịghị anya n’iru cluigwe, bụ ihe ndị na-egosipụta ihe ịrịbama nke ije ozi nke ndị mọ ọjọọ. Ndị mọ ọjọọ ga-ejekwuru “ndị eze nke ụwa” na ndị ụwa nile, ịrụgide ha ijikọta aka ha na Setan n’ime ịgba mgba nke ikpeazụ ya imegide ọohịchọ Chineke. O nwere ndị ga-ebilite ma kwupụta na ha bụ Kraịst na onwe Ya. Ha ga-eme ihe ịrịbama nke ịgwọ ọrịa ma kwue na ha nwere nkpughe nke sitere na eluigwe bụ ndị na-emegide ama nke Akwụkwọ nsọ.OdU 86.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents