Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    A Chụpụrụ ya N’eluigwe

    Ekwensu na ụsụụ ndị na-eso ya wee bo Kraịst ebubo dika onye kpatara nnupu isi ha; a sị na abaghịrị ha mba na ha agaghịrị enupu isi. Na nnọgidesi ike na nnupu isi ha, na nkwesi olu ike ha, ya na iji nkwulu na-ekwu na ha bụ ndị aka ha dị ọcha ndị e ji aka ike naemegide, a chụpụrụ onye isi nnupu isi a na ndị niile na-adọnyere ha ukwu pụa n’eluigwe (Lee Nkpughe 12:7-9).OdU 7.1

    Mmụọ nke Ekwensu nọkwa na-akpali nnupu isi n’ụwa taa n’ime ụmụ nke nnupu isi. Dịka Ekwensu ha na-ekwe ndị mmadụ nkwa nnwere onwe onye site n’imebi iwu Chineke, ịbara mmehie mba nọkwa na-akpali ịkpọ asị. Ekwensu na-eduba ụmụ mmadụ n’ịgụ onwe ha na ndị ikpe na-amaghị, na ịchọ ka ndị ọzọ dọnyere ha ukwu n’ime mmehie ha. Kama imezi ihe ha mejọrọ, ha akpalie ọnụma megide onye na-abara ha mba dịka a ga-asị na ọ bụ ya kpatara nramahụ.OdU 7.2

    Site n’otu igosi agwa Chineke n’ụzọ ụgha na mmegide ahụ nke bụụrụ omume ya n’eluigwe, bụ nke o ji mee ka e lee Chineke anya dịka onye aka ike na onye mkpagbu ukuu, Ekwensu dubara mmadụ ime mmehie. O kwupụtara na ọ bụ mgbochi dị iche iche na-ezighị ezi nke Chineke dubara mmadụ ime mmehie dịka ha dubakwara ya onwe ya na nnupu isi.OdU 7.3

    N’ịchụpụ Ekwensu pụa n’eluigwe, Chineke kwupụtara ikpe ziri ezi na otuto Ya. Ma mgbe mmadụ mehiere, Chineke gosiputara ịhụnanya ya site n’inye Ọkpara ya ka ọ nwụa n’ihi ọgbọ mmadụ ahụ dara ada. Site n’ọchụchụ aja ime ka a dị n’otu ahụ, e kpughere agwa Chineke. Nkwuwa okwu ukwuu nke obe ahụ na-egosiputa na ọ dịghị ụzọ ọ bụla a pụrụ iji ma ọchịchị Chineke ikpe mmehie. N’ime ije ozi nke onye nzọpụta n’elu ụwa e yipụrụ nduhie ahụ ihe mkpudo ya. Oke nkwulu ya nke ịchọ ka Kraịst kpọọ isi ala nye ya, oke ọnụma ya nke izu ike na-adịghị na ya, bụ nke o ji chuso Kraịst site n’otu ebe rue ebe ọzọ, na nkpal ahụ nke ọ kpaliri ndị nchụ aja na ndị mmadụ ịjụ ịhụnanya Kraịs na iti mkpu sị, “Kpọgide ya n’obe! Kpọgide ya n’obe!” - Ihe ndị a niile mere ka ụwa niile e kere eke nọọ jụụ n’oke mwute nke ihe ịtu n’anya ma nwekwaa ọnụma megide Ekwensu. Onye isi nko mmehie wepụtara ike ya niile na aghụghọ niile ịla Jisọs n’iyi Ekwensu ji mmadụ mere ndị na-ejere ya ozi ime ka ndụ onyo nzọpụta jupụta na nhuju anya na iri uju. Ite ọkụ na-ere ere nko anya ukwu na ọnụma, ịkpọ asị na mmeso ọjọọ gbawara n’elu obe Kalvarị megide Ọkpara Chineke.OdU 7.4

    Ugbu a ọmụma ikpe nke Ekwensu pụtara guzoro na enweghị ngọpụ. O gosiwo nke bụ agwa ya n’ezie. Ụgha niile nko Ekensu megide agwa Chineke wee pụta ihe otu ha dị n’ezie. O boro Chineke ebubo dịka onye na-achọ ibuli onwe ya elu site n’ịchọ ka ndị O kere eke gee ya ntị, wee kwupụta na Chineke bu onye na-achọ ka ndị ọzọ bie ndụ nke ijụ onwe onye mgbe ya onwe ya na-enweghị ndụ ịjụ onwe onye ma ọ bụkwanụ ndụ nko ọchụchụ aja. Ugbu a, ọ huwo na Eze nke ụwa niile achụwo aja nke kachasị, nke ịhụnanya pụrụ ịchụ, n’ihi na “Chineke nọ n’ime Kraist na-eme ka ya na ụwa dị n’otu” (2 Cor. 5:19). N’ihi ka o bibie mmehie, Kraịst wedara onwe ya n’ala, we bụrụ onye na-aña ntị rue ọnwụ.OdU 8.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents