Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Nbilite N’ọnwụ Ndị Nke Chineke

    Olu Ọkpara Chineke na-akpọ ndị nsọ niile dara n’ụra ọnwụ. Ndị nwụrụ anwụ n’ụwa niile ga-anụ olu ya, ndị nụrụ ya ga- ebili, bụ ndị agha si na mba niile, ebo niile, asụsụ niile na ndị niile. Ha ga-apụta site na mpkọrọ nke ọnwụ we yiri anwụghị anwụ, we sị, “Ọnwụ, olee ebe mmeri gị dị? Ọnwụ, olee ebe ihe ọgbụgba gị dị?” 1 Ndị Kọrint 15:55.OdU 93.4

    Mmadụ niile ga-ebili n’ili dịka ha dị ba n’ime ya. Ma ha ga-ebili n’udi ọhụụ na ike nke okoroọbịa. Kraịst bịara iweghachi ihe ndị nke furu efu. Ọ ga-agbanwe arụ anyị rere ure me ya dịka arụ Ya dị ebube. Arụ nke a pụrụ ire ure, nke mmehie merụrụ, we bụrụ ihe zuru oke, dị mma, yiri kwa anwụghị anwụ. Ịta ụta niile na nkwarụ niile ka arapụrụ n’ime ili. Ndị agbapụtara ga “awụli elu” (Malakaị 4:2) rue ntozu oke n’ọgbọ ọzọ, mgbe ewezugara ihe naakpata mmehie. Ndị nke Kraịst kwesiri ntụkwasị obi ga-esite n’obi ha na arụ ha cheta izu oke nke Chineke ha.OdU 94.1

    A ga-agbanwe ndị ezi omume dị ndụ “n’otu ntabi anya”. Ngwa ngwa ha nụrụ olu Chineke, a ga-eme ka arụ ha ghara ire ure, e we welie ha na ndị nsọ izute Onye nwe anyị n’ime mbara nke eluigwe. Ndị mọ ozi “ga akpọkọta ndị nke Ya arọpụtara site n’ifufe anọ zụkọ site n’otu nsọtụ eluigwe rue nsọtụ ya ọzọ.” Matiu 24:31. Ụmụ ntakịrị ga-ahụkwa ndị mụrụ ha. Ndị enyi ọnwụ kewara ga-abịakọtakwa ọzọ, agaghị ekewakwa ha ọzọ, ha ewere abụ ọñụ rue obodo nke Chineke.OdU 94.2

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents