Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isiokwu 1— Isi Nke Mbụ Gịnị Mere Ịta Ahụhụ Ji Wee Dị ?

    Ọtụtụ mmadụ na-ahụ ọlụ nke mmehie, na ahụhụ na mbibi nke ọ na-eweta, ha wee na-ahụ otu ọnọdụ nke a pụrụ iji dị n’okpuru ọchịchị nke Onye ahụ nke amamihe, na ike na ịhụnanya ya na-enweghị nsọtụ. Ndị ahụ ndị na-enwekarị obi abụọ mgbe ọ bụla na-adabere n’ọnọdụ a dịka ebe mgbakwasị ụkwụ ha ijụ ọkwu nke Akwụkwọ Nsọ. Omenaala na ntapịa na-ezighị ezi ekpuchiwo ozizi nke akwụkwọ nsọ banyere agwa Chineke, ụdị ọchịchị Ya, na ụkpụrụ dị iche iche O ji emeso mmehie.OdU 1.1

    Ọ bụ ihe a na-apụghị ime bụ ịkowa mmalite nke mmehie n’ụdị nke ikwu sị: “Lee ihe kpatara o ji malite”. Na-agbanyeghị nke a, e nwere ike ịghọta ihe banyere mmalite nke mmehie na nwezuga ikpeazu ya n’ojuju afọ nke pụrụ ime ka ikpe ziri ezi nke Chineke na obi ebere Ya pụta ihe. Ọ dịghị ụzọ ọ bula mmalite nke mmehie ji site n’aka Chineke; ọ dịghị ezughị oke ọ bụla n’ọchịchị nke eluigwe nke mere ka nnupu isi malite. Mmehie bụ onye ọbịa ọjọọ nke a na-apụghị ịsị: ‘lee ihe kpatara mbata ya’. Ikwu sị: ‘lee ihe kpatara ya’ bụ ịdọnyere ya ukwu. Ọ bụrụ na e nwere ike ịsị: ‘lee ihe kpatara ya’, ọ gaghị abụkwa mmehie ọzọ. Mmehie bụ ihe nlụpụta nke otu ụkpụrụ na-ebu agha megide iwu .ịhụnanya Chineke nke bụ ntọala nke ọchịchị Ya.OdU 1.2

    Tupu mmehie abata, udo na ọñụ juputara n’ụwa niile nke okike Chineke. Ịhụnanya nye Chineke bụụrụ isi ihe niile, ịhụnanya nke otu onye na ibe ya wee bụrụkwa nke aghụghọ naadịghị n’ime ya. Kraịst, onye Chineke mụrụ naanị ya, na Nna ebighi ebi ahụ bụụrụ otu n’ụdịdị Ha, n’agwa Ha, na ebumnobi Ha - onye naanị Ya pụrụ ịbanye n’izu niile na ebumnobi niile nke Chineke. “Esitewo n’aka Ya kee ihe niile, nke dị n’eluigwe, ...ma ha bu oche eze, ma ha bụ ndị nwe mmadụ, ma ha bụ ịchị isi dị iche iche” (Ndị Kọlọsị 1:16). Iwu nke ịhụnanya, ebe ọ bụ ntọala nke ọchịchị Chineke, obi ụtọ nke ihe niile e kere eke dabeere na ige ntị ha n’ụkpụrụ ezi omume nke iwu a. Chineke enweghị mmasị ọbụla n’ofufe nke eji aka ike kwagide mmadụ inye, O nyewokwa mmadụ niile ohere ọma nke inwe onwe onye nke akọ n’uche, otu ha ga-enye Ya ofufe nke nrụgide na-adịghị n’ime ya.OdU 1.3

    Ma ọ dị otu onye, onye họọrọ ịñagharị nnwere onwe onye a. Mmehie malitere na onye ahụ na-esoje Kraịst n’inwe nsọpụrụ kachasị site n’aka Chineke. Tutu ọdịda ya, Lusifa bụ onye mbụ n’etiti ndị cherub na-ekpuchi ekpuchi, bụrụkwa onye dị nsọ na onye a na-emerụghị emerụ. “Otu a ka onye nwe anyị a sịrị: Gi onwe gị bụ onye na-akachi ọtụtụ ihe akara, nke jupụtara n’amamihe, mazukwa mma. N’Iden, bụ ubi Chineke a gbara ogige ka ị nọworo. Nkume niile ọ bụla nke dị oke ọnụ ahịa bụ ihe mkpuchi gị....Gị onwe gị bụ cherub ahụ e tere mmanụ nke naekpuchi ekpuchi: otu ahụ ka m doworo gị: n’ugwu nsọ nke Chineke ka ị nọworo; n’etiti nkume ọkụ a ka I jegharịworo. Onye zuru oke ka ị bụ n’ụzọ gị niile, site n’ụbọchị e kere gị rue mgbe a hụrụ ajọ omume n’ime gị....Obi gị adịwo elu n’ihi ịma mma gị, I bibiwo amamihe gị n’ihi onwunwu ihe gị”. “I dowo obi gị dịka obi Chineke.” “Gị onwe gị asịwo...m ga-ebuli oche m n’elu kpakpando niile nke Chineke. M ga-anọkwasịkwa n’ugwu nzukọ...M ga-arịgo n’elu ebe niile dị elu nke igwe ojii, m ga-eyi onye kachasị ihe niile elu.” (Ezekiel 28: 12-17; 28:6; Aịsaịa 14:13, 14).OdU 2.1

    N’inwe anya ukwu n’ebe nkwanye ugwu ahụ dị bụ nke Nna nyeworo Ọkpara Ya, onye isi ndị mmụọ ozi a wee lekwasị anya ya inweta ike ahụ nke ruuru naanị Kraịst inwe. Ụda ọlụ ọjọọ wee si otu a wee bata ma mebie olu ụtọ nke abụ eluigwe. Mbuli elu nke onwe onye wee kpalie egwu na echiche nke ihe ọjọọ n’akọ n’uche ndị ọ bụụrụ naanị otuto Chineke bụ ihe kachasị elu n’ime ha Na mkpọkọta niile nke eluigwe, a kpọrọ ya oku ka ọ laghachi. Ọkpara Chineke wee gosi ya ịdị mma na ikpe ziri ezi nke Onye okike na ịdị nsọ nke iwu ya. N’i si n’ebe iwu a nọ pụa, Lusifa gaewetara onwe ya mbibi. Ma ịdọ aka na nti a kpaliri nanị isi ike n’ime ya. Lusifa wee kwe ka anya ukwu megide Kraịst merie ya ma bichie n’ime ya.OdU 2.2

    Mpako n’ime ya wee zụpụta ọchịchọ nke ị bụ onye kachasị ihe niile elu. Ugwu niile dị elu nke e nyere Lusifa ewepụtaghị ekele ọ bụla nye Onye kere ya. Ma Ọkpara Chineke bụ onye naachị achị n’eluigwe, nke a maara nke ọma, onye ya na Nna bụ otu n’ike na ịchị isi. N’ọgbakọ nke izuzu nke Chineke, Kraịst na-ekere oke. Ma e kweghị Lusifa ịbata n’izuzu a bụ nke ebumnobi dị iche iche nke Chineke. Mmụọ ozi uku a wee jụa sị: “gịnị mere Kraịst ji bụrụ ọkaka? Gịnị mere eji enye ya nkwanye ugwu karia Lusifa?OdU 3.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents