Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Iwe N’ihi E nweghị Afọ Ojuju Wee Bute Agha

    Chineke, n’amamihe Ya, kwere ka Ekwensu gaa n’iru n’ọrụ ya rue mgbe mmụọ nke iwe n’ime obi Ekwensu bịara ghọọ agha nke nnupu isi. Ọ dịịrị mkpa ka ihe ahụ ọ naara ezube n’ime obi ya tozue oke, ka mmadụ niile huzue ya. Ndị bi-n’eluigwe hụrụ Lusifa n’anya nke ukuu, nhuku o nwere n’ebe ha nọ sikwara ike.OdU 5.1

    Ọchịchị nke Chineke abụghị naanị ndị bi n’eluigwe ka ọ nagidere, kama ọ nagidere ụwa niile nke o kere. Ekwensu wee chee sị na ọ bụrụ na ya e nwee ike iduba ndị mmụọ ozi isoro ya na nnupu isi ya, na uwa ndị ọzọ niile ga-esokwa ya. N’ihi na ọ na-etinyekọta izu dị omimi na aghụghọ, ike nke nduhie ya wee rie nne nke ukuu. Ọbụna ndị mmụọ ozi ndi na-erubere Chineke isi aghọtazughị agwa ya ma ọ bụ ịhụ ebe ọlụ ya na-edu na-aga. N’ihi na Ekwensu abụrụwori onye a na-asọpụrụ asọpụrụ, tinyekwa na omume ya bụ ihe mgbagwoju anya dị omimi, ọ bụghị ihe dị mfe ịkọwara ndị mmụọ ozi nke bụ eziokwu banyere ọlụ ya. Ruokwa mgbe a gaeme ka ọ pụtazuo ihe, mmehie agaghị adị ka ihe ọjọọ ahụ nke ọ bụ kpọmkwem. Ma ndị nsọ apụghị ịghọta na mgbe ahụ ọghọm nke iwezuga iwu Chineke ga-alụpụta. Ekwensu kwuru na mbụ na ya na-achọ ibuli otuto Chineke elu ma wetakwa ịdị mma nke ndị niile bi n’eluigwe.OdU 5.2

    N’imeso mmehie, Chineke pụrụ iji naanị ezi omume na eziokwu lụa ọlụ. Ma Ekwensu pụrụ iji ngwa ọlụ ndị ahụ nke Chineke na-apụghị itinye n’ọlụ, bụ ire ụtọ nke okwu ụgha na nduhie wee na-alụ ọlụ. Nke bụ kpọmkwem agwa onye aghụghọ ahụ aghagị ịpụta ihe ka ọra niile mazue ya. Aghaghị inye ya oge ka o mee ka a mata onye ọ bụ site n’ọlụ ya dị iche iche.OdU 5.3

    Nkewa ahụ nke omume ya kpatara n’eluigwe ka o bogidere Chineke dị ka onye kpatara ya. Mmehie niile ka o kwupụtara na ha bụ ihe nlụpụta nke ọchịchị Chineke. N’ihi nke a, ọ dị mkpa ka ya onwe ya gosiputa otu mgbanwe ndị a nke iwu Chineke, nke ọ na-achọ ka etinye n’ọlụ ga-esi alụ ọlụ. Ọlụ ya aghaghị ịma ya ikpe. Ụwa niile aghaghị ịhụ onye nduhie ahụ na-enweghị ihe mkpuchi ọbụla.OdU 6.1

    Ọbụna mgbe e kpebiri na ọ pụghị ịnọkwa n’eluigwe, Chineke n’amamihe Ya na enweghị nsọtụ alaghị Setan n’iyi. Ofufe nke ndị Chineke kere na-enye ya aghaghị ịdabere na nghọta ha na Chineke bụ onye ikpe ziri ezi. Ndị bi n’eluigwe na n’ụwa ndị ọzọ, ebe ha na-apụghị ịghọta na mgbe ahụ ihe ga-abụ ihe nlụpụta nke mmehie, ha agaghịrị aghọtakwa ikpe ziri ezi na obi ebere nke Chineke n’ịla Ekwensu n’iyi. A sị na a napụrụ ya ndụ n’otu ntabi anya ahụ, ha gaara efe Chineke site n’ụjọ kama ife ya n’ịhụnanya. Nhuku nke onye nduhie ahụ bụ ihe a na-agaghịrị ebibi, ọ bụkwa mmụọ nke nnupu isi ka a na-agaghịrị ala n’iyi kpam kpam. N’ihi ọdịmma nke ụwa niile rue ebighi ebi, Ekwensu aghaghị iwepụtazu ụkpụrụ ya n’ozuzu oke, ka ebubo ya ndịa o nwere megide ọchịchị Chineke pụtazuo ihe ihe ha bụ, ka ihe niile e kere eke huzuo ha.OdU 6.2

    Nnupu isi nke Ekwensu ga-abụrụ ụwa niile ihe ama banyere ihe nlụpụta dị egwu nke mmehie. Ọchịchị ya ga-egosi mkpụrụ nke iwezuga ịchị isi nke Chineke. Akụkọ nke ihe nwale dị egwu nke nnupu isi a ga-abụ ihe mgbochi ga-adịgide nye ndị nsọ niile na-akọ n’uche ha igbochi ha ịba na mmehie na ụgwọ ọlụ ya.OdU 6.3

    Mgbe e kwupụtara na a ga-achụpụ onye aghụghọ a na ndị niile na-adọnyere ya ukwu pụa n’obodo ọñụ ahụ, onye isi nnupu isi a ñụrụ iyi ịnọgidesi ike na nlelị nke iwu Chineke. O wee kwụlue iwu Chineke dịka ihe na-egbochi nnwere onwe onye, ma kwupụta ebumnobi ya inweta nwezuga nke iwu ahụ; na ọ bụrụ na ewezuga ihe a na-eke ha agbụ, na ụsụụ niile nke eluigwe ga-aba na ndụ nke ebuliri elu.OdU 6.4

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents