Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Aghọm Nke Nọ N’ime Ikwesi Olu Ike Megide Ọkpụkpọ Oku Nke Oziọma

    Mmebi nke obodo Jerusalem bụ ịdọ aka na ntị dara ụda nye ndị nile bụ ndị na-enupu isi n’arịrịọ nke obi ebere Chineke. Amụma nke Onye Nwe Anyị Jisọs buru banyere ịla n’iyi nke obodo Jerusalem ga-enwe nmezupụta ọzọ. N’ime ihe ọjọọ chere Jerusalem iru, anyị na-ahụta ịla n’iyi nke chere ụwa nile iru site na ịjụ ịnabata obi ebere nke Chineke ma zọgidekwa iwu Ya ụkwụ. Akụkọ ụwa jupụtara n’ihe ndị gbara ọchịchịrị bụ ndị na-atụ aka obi ọlịlọ mmiri nke ụmụ mmadụ. Nlụpụta dị ilu dị iche iche pụtara ihe site na mgbe ụmụ mmadụ jụrụ ịnabata ịnọgide n’okpuru ọchịchị nke Chineke. Ma n’ime oge ndị nọ n’iru, Baịbụl naegosipụta iru uju na ịla n’iyi dakasịrị elu karịa. N’oge aga ewezuga nchedo na nchekwa nke Mọ Nsọ Chineke, mgbe ahụ ọ dịghị ihe ga-egbochi mkpọrọmasị na oke ọnụma nke madụ na Ekwensu, ụwa nile ga-ahuzu nlụpụta nke ọchịchị nke Ekwensu, ụzọ ha na-ahụtụghị ya n’oge ndị gara aga.OdU 80.4

    N’oge ahụ, dịka n’oge emebiri Jerusalem, a gazọpụta ndị kwenyere na Chineke (Lee anya na akwụkwọ Aịsaịa 4:3; Matiu 24:31). Kraịst ga-abịa nke ugboro abụọ ịchịkota ndị nile kwere ekwe nye onwe Ya. “Mgbe ahụ ka ebo nile nke ụwa ga-etikwa aka n’obi, ha ga-ahụkwa Nwa Nke Madụ ka Ọ na-abịa n’eluigwe ojii nile nke eluigwe, na ike na oke ebube. Ọ ga-ewerekwa opi uku zipụ ndị mọ ọzi Ya, ha ga-emekwa ka ndị nke Ya arọpụtara si n’ifufe anọ zukọ, site n’otu nsọtụ rue nsọtụ ọzọ” (Matiu 24:30,31).OdU 81.1

    Ka ụmụ mmadụ kpachara anya ileghara okwu Kraịst anya. Dịka Ọ dọrọ ndị na-eso ụzọ Ya aka na ntị banyere ọdịda nke Jerusalem, bụ ihe nyeere ha aka ịgbanarị ịla n’iyi nke Jerusalem, otu a ka Ọ na-adọ madụ nile aka na ntị banyere ịla n’iyi nke chere ụwa nile iru. Madụ nile ndị nọ na njikere nwere ike ịgbanarị ọnụma nke na-abịa, “Ihe ịrịbama dị iche iche ga-adịkwa n’anyanwụ, na ọnwa, na kpakpando; na elu ụwa ka nkpagbu nke mba dị iche iche ga-adịkwa (Luk 21:25) Lee kwa Matiu 24:29; Mak 13: 24-26, Nkpughe 6:12-17. “Nechenụ nche, bụ okwu ịdọ aka na ntị nke Kraịst (Mak 13:35). Ndị ahụ debere ịdọ aka na ntị ahụ, agaghị eme ka ha nọrọ n’itiri nke ọchịchịrị.OdU 81.2

    Ụwa nile, n’oge dị ugbu a, adịghị na njikere ịnabata ozi ịdọ aka na ntị nke a dịka ndị Ju jụrụ ịnabata ya n’oge nke ha banyere ọdịda nke Jerusalem. N’oge ọ bụla a na-eme ka ọ pụta ihe, ụbọchị Onye Nwe Anyị ga-abịakwasị ụwa nile dịka ihe mberede na ịma na ọnya. Site n’oge ha na-ahazi ọnọdụ nke ndụ a, mgbe ụmụ madụ ga-emikpu n’ime orire ahịa na azụmahịa, n’ime nkwari na ihe ụtọ, n’ime nrite uru nke ego, mgbe ndị ndu n’ime nzukọ na-eto ọganiru nke ụwa, ma me ka ụmụ madụ nọ ọnọdụ nke ịdanye n’ura nke ime mọ, n’oge ahụ, dịka onye ori nke etiti abalị na-abata ma zuru ihe ndị ọ chọrọ, otu a ka ịla n’iyi ga-abịakwasị nye ndị njakịrị na ndị na-amataghị Chineke, “ma ha agaghị agbanarị ọnọdụ dị otu a” (Lee 1 Tesalonaịka 5:2-5).OdU 81.3

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents