Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ihe Nādọrọ Akọ N’uche

    Nye ndị madụ nwere ọzụzụ na àgwà dị ọcha, eze nke alaọchichịrịa nēgosị ofufe mụo-ọjọ n’ụdị ya e doziri nke ọma n’ụzọ nile nke akọ-nuche. Nye onye ihe mara-mma n’anya nēchu-ụra, ọ nēmeghepụrụ ya ọnọdụ ihe ụtọ di iche iche nke nkọwa ha jupụtara n’ihe ịhụnanya na nmeso afọ-ọma ya. Ọ nēduru ụmụ-madụ inwe nganga n’ime amamihe nke onwe ha nke mere na ha nesite n’ime obi ha nēleda Onye ahụ nke nādị ebighi-ebi.OdU 43.1

    Ekwensu nāghọgbụ ụmụ-madụ ugbụakwa dịka ọ ghọgbụworo lv n’Iden, site n’ịkpali ọchịchọ nke ibụli onwe-onye elu. “Unu gādịkwa ka ndị bụ chi” ka ọ nēkwu, “imara ihe-ọma na ihe-ọjọ Jenesis 3:5. Ofufe mụọ-ọjọ nēzi na madụ bụ ihe okike nke ito-eto.......itokuru ichi-isi nke Chineke.” Ma ọzọkwa: “Ikpe ahụ gābụ nke ziri-ezi, nihi na ọ bụ ikpe nke onwe-onye Oche-eze ahụ dịkwa nime gi.” Ma nke ọzọ nēkwukwa sị: “Onye ọbụla nke ziriezi ma zuokwa oke bụ Kraist.”OdU 43.2

    N’ụzọ di otua Ekwensu edochiwo ọdịdị nke madụ onye nmehie n’onwe ya dịka ihe naanị bụ ihe ọtụtụ nke ikpe. Nkaa bụ iga-niru, ọbụghi ito-eto, kama ọbụ ịda-ala. Madụ adịghị mgbe ọ gādị elu karị ogo nke ya n’ịdị ọcha ma-ọbụ n’izi-ezi. Ọ bụrụ na onwe-onye bụ ogo nke ya kachasị elu a hụrụ-nma ọ dịghịkwa mgbe ọ gēru ihe ọzọ dịkarị elu. Naanị amara nke Chineke nwere ike ibụli madụ elu. A rapụ ya n’onwe ya, ọnọdụ ya aghaghị ibụ nke nāda-ala.OdU 43.3

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents