Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ijekuru Chineke N’onwe Gi

    Nzo-ụkwụ obụla nke okwukwe na nrube-isi nākpọta mkpuruobi ọbụla nso n’ebe Ìhè nke ụwa dị. Nchawa ìhè Anyanwụ nke Ezi-omume nēnwukwasị ndi oru nke Chineke, nke ha kwesịkwara igosịputa ìhè Ya ndia nile. Kpakpando nile nāgwa anyị; na otu ìhè dị n’elu-igwe nke ha onwe ha sitekwara n’ebube ya nēnwụputa ìhè; otuakwa ka ndị nke Kraist nēme ka ọ pụta ìhè na ọ di otu Chineke nke nānọdụ n’oche-eze onye agwa Ya kwesiri ka e nye otuto ma ñomiekwa. Ịdị-nssọ nke agwa Ya gāpụtakwa ìhè nime ndị-ama Ya.OdU 61.1

    Site n’ezi-omume nile nke Kraist anyị nwere ohere irute ocheeze nke ike ya n’enweghi ụsọtụ. “Onye ahụ nke nāzọdogị Ọkpara nke aka Ya, kama Ọ raara Ya nye nihi anyị nile, Ọ gēsi aña ghara inyekwa ihe nile n’amara? Ka Jisọs nāsi, “Ya mere, ọ bụrụ na unu onwe unu, ọ bụ ezie na unu jọrọ njọ, ma unu nāmata inye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu nke elu-igwe gēsi ana ghara iwere karị nke uku nye ndị nāriọ Ya?” “Ọ bụrụ na unu gāriọ ihe ọbụla n’aham nke ahụ ka M’gēme.” “Riọnụ, unu gāriọtakwa, ka ọñụ unu wee zue oke.” Ndị Rom 8:32; Luk 11:13; Jọn 14:14; 16:24.OdU 61.2

    Ọ bu ohere dịrị onye ọbụla ibi ndụ nke Chineke gānabata ma gọziekwa ya. Ọbụghị ọchịchọ nke Nna ayị nke elu-igwe na anyị gānọ mgbe nile n’ọmụma-ikpe na n’ime ọchịchịrị. Ọdịghị ihe ngosị nke ezi nweda n’ala dị na ya mgbe a nēje-ije nērudakwa is ala ọbụna mgbe obi juputara n’echiche nke onwe-onye. Anyị pụrụ ijekuru Jisọs ma bụrụkwa ndị a sàchàrà wee bụrụ ndị gēgụzọro n’iru iwu ahụ n’enweghị ihere na n’wute.OdU 61.3

    Site n’aka Jisọs, ụmụ nile nke Adam dara-ada nābụ “ụmụ nke Chineke” “ihere ịkpọ ha ụmụ-nna Ya adịghị eme Ya.” Ndụ nke onye nke Kraist kwesịrị ịbụ nke okwukwe, nmeri na ọñụ nime Chineke. “Ọñụ Jihova bụ ike unu.” “Nāñụrịnụ ọñụ mgbe nile; nēkpekwanụ ekpere nēwepụghị aka; nēkelenụ ekele n’ihe nile ọbụla: nihi na nkaa bụ ihe Chineke nāchọ nime Kraist Jisọs n’ebe unu nọ.” Ndị Hibru 2:11; Nehemai 8:10; Ndị ITesalọnịka 5:16-18OdU 62.1

    Ụdị ndia bu mkpụrụ nile nke mgbanwe na odido-nsọ nke akwụkwọ-nsọ; ma-ọbụkwa nihi na ụkpụrụ ukuu nile nke eziomume nke e dozikwara nime iwu ahụ ka a kpọrọ ihefu; ya mere na adịghị ahụkwa mkpụrụ ndia mgbe nile. Nkaa kpatara na ọdịghị apụtakwa ìhè nke ọma bụ nnọyere di omimi nke ọlụ Mụọ Nsọ nke e jiri-mara ntute nile nke ndị oge ochie.OdU 62.2

    Ọ bụ site na nlekwasị-anya ka anyị nābụ ndị a gbanwere. Dịka a nēwepụ anya n’ụkpụrụ-nsọ ndia nile nke Chineke sitere na ha kpughere ụmụ-madụ izu-oke na ịdị-nsọ nke agwa Ya, ka uche nile wee bụrụkwa nke a nādọrọ nye ozizi na ncheputa nke madụ, ihe nlụpụta ya abụrụwokwa ndala-azụ nke ezi okukperechi nime nzukọ. Ọ bụ naanị mgbe e weghachiri iwu Chineke n’ezi ọnọdụ ya ka a ga-enwe ntute nke okwukwe ndị ochie na ndụ nke Chineke n’etiti ndị sị na ha bụ ndị nke Ya.OdU 62.3

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents