Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ekwensu Na-Agbalịsi Ike Ka Ụmụ Madụ Nọrọ N’Okpuru Ike Ya

    Site n’ozizi ụgha abụa uku ahụ nke bụ na mkpụrụ obi madụ anaghị anwụ anwụ, na kwa idebe ụbọchị Sọnde nsọ, Setan ga-eme ka ụmụ mmadụ nọrọ n’okpuru nduhie ya dị iche iche. Na mgbe nke mbụ na-atụ aka mọ ndị nwụrụ anwụ ibilite je ozi n’ime ụwa, nke abụa na ekegide aka ya na okpukperechi nke ndị Rom.OdU 82.1

    Site na ime ka ndị nwụrụ anwụ pụta je ozi, Setan na-eme ka ya onwe ya bụrụ onye na-emeziri mmadụ ihe, ma bụrụkwa onye na-agwọ ọrịa ma gosipụta ọnọdụ ofufe nke dị ọhụrụ, ma n’otu aka ahụ, ọ na-eduru igwe ụmụ mmadụ rue n’ịla n’iyi. Emerughi ihe n’oke na-akwatu ọchịchị nke echiche nke ziri ezi; ma we kpọlata ihe ụtọ nke anụ arụ, esemokwu na nkwafu ọbara we sonye ya na azụ. Ịlụ agha na-akpalite echiche na obi ụfụ nke ime obi ma naemezupụta ndị amara n’ọnya nke aghara na nkwafu ọbara. Ọ bụ ebumnobi Ekwensu ime ka mba nile banye ọnọdụ nke agha na nkwafu ọbara; n’ụzọ dị otu a, ọ na-eme ka ụmụ mmadụ ghara ịdị na njikere ichere Ụbọchị Onye Nwe Anyị ga-apụta ihe.OdU 82.2

    Setan bụụrụ onye nọrọ ọnọdụ ịmụta ihe omimi nke ihe ekere eke ma si otu a nwe ike ijiri ihe ndị a Chineke kere eke luzupụta ọlụ ndị tara akpụ rute n’ogo Chineke kwere ya imezupụta. Ọ bụ nanị Chineke na-egbochi ihe nile ekere eke inwetazu ịla n’iyi site n’aka onye ahụ na-emebi ihe. Kama ndị Kristen ezipụtawo nleda anya n’iwu nke Chineke, n’ihi nke a, Onye Nwe Anyị ga-emezupụta ihe O kwuru na Ọ ga-eme - nke bụ iwezuga nledo anya nke mkpuchi Ya site n’ebe ndị ahụ na-emebi iwu Ya nọ ma rụgidekwa ndị ọzọ ka ha da iwu Chineke. Setan nwezuru nchịkọta n’ebe ndị ahụ nọ bụ ndị Chineke rapụrụ ileta anya ọma Ya. Ekwensu ga-enye ụfọdụ mmadụ ọnọdụ nrite n’uru na ọganiru, ka o we nwe ike imejupụta ebumnobi ya; ma ọ ga-eme ka ndị ọzọ nwetazuo nsogbu, ma duru ụmụ mmadụ ikwenye na Chineke na-ata ha ahụhụ.OdU 82.3

    Na mgbe ọ na-apụta ihe dịka onye na-agwọ nnụ ọrịa, Setan ga-eme ka ọrịa na ịla n’iyi bịarute rue na mgbe obodo dị iche iche ga-abụ mkpọ mkpọ ebe. N’ime ihe mberede dị iche iche nke oke osimiri na elu ala, n’ime erem ere ọkụ na ebe dị iche iche, n’ime nbili nke oke osimiri, n’ime ifufe nke dị ọkụ, nbigbọ nke oke osimiri nakwa ala ọma jijiji na ebe dị iche iche, Setan na-eme ka ikike ya pụta ihe nke ọma. Ọ na-eme ka ubi ọka bụrụ ihe ikuku busasịrị, ma site n’ụzọ dị otu a kpalite ụnwụ na obi ịlọ mmiri n’ime obodo. O nwere ike ime ka ikuru ikuku ọnwụ a bụrụ ihe dị ire, ma a site n’otu a me ka madụ dasa n’igwe.OdU 83.1

    N’oge ahụ, onye nduhie ukwu ahụ ga-eme ka ụmụ mmadụ ghọta na ọ bụ ndị na-egezu Chineke ntị kpatara ọnọdụ dị otu a, bụ ndị ahụ ndụ nke ezi omume ha na-ama ngba nye ndị naadịghị ege ntị. Ha ga-ekwupụta na ụmụ madụ na-emehie Chineke site na-erubeghi isi nye ofufe nke ụbọchị Sọnde, na mmehie dị out a mere ka ọnwụ na mfu rute ebe nile; na-ekwusikwa ike na ihe obi ọlịlọ mmiri ndị a agaghị akwụsị rue mgbe e mere ka madụ nile bụrụ ndị na-efe ofufue n’ụbọchị Sọnde. Ha ga-ekwupụta na “ndị ahụ bụ ndị na-emebi nrube isi nye ịkpọ isi n’ala n’ụbọchị Sọnde na-egbochi mweghachi nke iru ọma nke Chineke nakwa ọganiru”.N’ụzọ dị otu a, ebubo nke dị otu a, bụ nke e boro Elaịja n’oge ochie, ga-ewerekwa ọnọdụ ọzọ na ebe ndị na-atụ egwu Chineke nọ. “Na mgbe Ahab hụrụ Elaija...Ahab sịrị ya, ọ bụkwa gị bụ onye ahụ na-enye Isrel nsogbu?” (Ndị Eze 18:17, 18).OdU 83.2

    Ndị ahụ bụ ndị na-edebezu iwu nke Sabat nke Baịbụl kwadoro, ga-ewere ọnọdụ ndị eledara anya bụrụkwa ndị a na-ebo ebubo imebisi iwu na ọnọdụ ọdịmma nke obodo, ma bụrụ ndị sitere n’ụzọ dị otu a, kpalite iwe na ọnụma nke Chineke n’ime ụwa. Ha ga-anọrọ ọnọdụ ndi a na-ebo ebubo imegide ndị ọchịchị. Ndị ọzụzụ atụrụ nzukọ dị iche iche bụ ndị gọnarịworo idebe iwu Chineke, ga-ekwupụta ebe ọ dara ụda ihe banyere ige ndị ọchịchị ụwa ntị. N’ime ụlọ nzukọ ome iwu nakwa ụlọ ikpe dị iche iche, ndị na-edebezu iwu Chineke ga-ewere ọnọdụ ndị amara ikpe. A ga-eji ụgha chọọ ebubo a na-ebo ha mma; a ga-achọpụta iri mpe tara akpụ n’ime ebumnobi ha.OdU 84.1

    Ndị a na-asọpụrụ asọpụrụ n’ime nzukọ na obodo dị iche iche ga-ejikọta aka ịkwalite mmadụ nile ịsọpụrụ ịkpọ isi na ala ụbọchị Sọnde. N’agbanyeghị na obodo Amerịka bụ ebe ọchịchị onye kwuru uche ya nọ chịm chịm, ndị ọchịchị na ụlọ nzukọ ome iwu ga-anabata nrụgide nke ndi obodo ka e mee iwu na-akwado idebe ụbọchị Sọnde nsọ. Ọnọdụ nke akọ na uche inwere onwe ya bụ nke ụmụ Chineke jiri maka ya jiri ndụ ha chụọ aja, agaghị abụkwa ihe a ga-asọpụrụ asọpụrụ ọzọ. Na ndọrọ ndọrọ uku ahụ nke na-abịa n’iru, anyị ga-ahuzu ọnọdụ nke onye amụma Jọn depụtara sị, “Dragọn ahụ we wesa nwanyị ahụ iwe, we pụa ibu agha megide mkpụrụ ya fọdụrụ, bụ ndị na-edebe ihe nile Chineke nyere n’iwu, ndị na-enwekwa ama nke Jisọs.” Nkpughe 12:17.OdU 84.2

    Ndị odibo nke Chineke, mgbe iru ha ga na-enwu mara mara, ga-eme ngwa ngwa si na otu obodo gafere obodo ọzọ, ịgbasasị oziọma nke sitere na eluigwe. Ha ga-eme ihe ịrịbama dị iche iche, ha ga-agwọ ndị ọrịa. Setan na onwe ya ga-ejirikwa ihe ịrịbama nke ihe ịtụnaya na ụgha juru n’ime ya, mekwa ka ọ bụna ọkụ si n’elu da n’anya ọra madụ (Nkpughe 13:13).N’ụzọ dị otu a, ndị nile bi n’ime ụwa ga-anọrọ ọnọdụ iguzoro site na nhọrọ ha.OdU 84.3

    Ozi ahụ ga-abụrụ ihe oke arụmarụ ụka na-adịghị ya, kama ọ ga-esite na ikike nke Mọ Nsọ Chineke. Oge arụmarụ ụka agafewo, akwụkwọ mgbasa ozi dị iche iche alụsiwo ọlụ ha, ma na ọtụtụ madụ nọọrọ ọnọdụ anatazughi eziokwu. Ugbu a, ọra madụ ahụzuwo eziokwu. Eriri na ụdọ nke ezi na ụlọ ma ọ bụ nke nzukọ enweghịkwa ikike ijigide ezi ụmụ Chineke gawa n’iru. N’agbanyeghị ikike otu dị iche iche nke ejiri emegide eziokwu, ihe karịrị na ọnụ ọgụgụ mesiri were ọnọdụ n’akụkụ Onye Nwe Anyị. OdU 85.1

    Ndị ahụ bụ ndị na-akwanyere iwu Chineke ugwu ka a gaele anya ịkpata ọgba aghara na nkwafu ọbara nke jupụtara n’elu ụwa ma wetara ha ahụhụ. Ikike ahụ nke so, ịdọ aka na ntị nke a gaemejupụta ndị na-emebi iwu na iwe na ọnụma tinyere na Setan gaakpalite mọ nke mkpọrọmasị na mkpagbu megide ndị nile nabatara ozi ahụ.OdU 85.2

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents