Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Mbilite N’ọnwụ Nye Ndụ Ebigh-Ebi

    Mgbe Ọ nējikere ịrapụ ndị nēso ụzọ Ya, Jisọs a gwaghị ha na ha gābịakute Ya n’oge nēteghị anya: “A nam-aga idoziri unu ebe,” Ka O kwuru “Ma ọ bụrụ na Mụ agaa idoziri unu ebe, a gajem ịbia ọzọ, M’gānarakwa unu nye Ownem” Jọn 14:2, 3. Pọl gakwara n’iru nāgwa anyi na “Onyenwe-anyị onwe Ya gārịdata site n’eluigwe n’ewere oke ịkpọ-òkù na olu nke onye-isi ndị mụọ-ozi, na olu-òpì nke Chineke: ma ndị nwụrụ-anwụ nime Kraist gēbuzọ bilie, ma mgbe ahụkwa anyị ndị dị ndụ fọdụkwara ka a gējidekọ anyị na ha n’igwe-oji, izute Onyenwe-anyị n’elu: ma otuakwa ka anyị na Onyenwe-anyị gānọ mgbe nile.” Owee nātụkwasịkwa: ma “Kasiritenụ onwe-unu obi n’okwu ndịa” Ndị ITesalọnika 4:16-18. N’ọbịbia nke Onyenwe-anyị, mgbachị ọnụ-ili nile gētiwa ma ndị nile nwụrụ nime Kraist ka a gākpọlite nye ndụ-ebighi-ebi.OdU 38.2

    Madụ nile ka a gēkpekwa ikpe dịka ihe e dere n’akwkwọ si dị ma nyekwa ụgwọ-ọlụ dịka ọlụ nile ha dịworo. Ikpe nkaa abụghị nke a nēkpe n’ọnwụ madụ. O debewo otu ụbọchị nke ọ gēji wee kpee ụwa ikpe nime ezi-omme. “Lee Onyenwe-anyị nābia Ya na nnụkuru-nnụ ndị nsọ Ya, ikpe madụ nile ikpe.” Ọlụndị-ozi 17:31; Jud 14, 15.OdU 38.3

    Ma ọ bụrụ na ndị nwụrụ-anwụ a nọroworị nēnwe añụrị n’eluigwe ma-ọbụkwa nāsụ-ude nime ogwurugwu-ọkụ ala mụọ nereere, ọ bụkwa nkpa gịnị ọzọ dị ikpe ikpe n’ọdị n’iru? Okwu Chineke ka uche onye ọbụla pụrụ ịghọta. Kama olee uche zuru oke pụrụ ịhụta amamihe ọbụla ma-ọbụ ikpe ziri-ezi ọbụla nime nchepụta nke ogea. Onye ezi-omume ọ gānata ezi-ama ahụ “I OdU 39.1

    mere nke-ọma gị ezi-oru kwesiri ntụkwasi-obi,......... baa nọñụ nke Onyenwe gi,” mgbe ha dịworị mbụ nēbị ndụ ọñụ n’iru-ọma Ya ogologo oge nile gara aga? Ka ọ bu na a gākpọpụtakwa ndị ajọ-omume site na ntaramahụhụ ha nọwọri nime ya ogologo oge ka ha bia narakwa mkpegbu ọzọ site n’aka onye ọkíkpe ka ọ sị ha “Sinụ n’irum pụa, unu ndị a bụrụ-ọnụ, ba n’ọkụ ebighi-ebi”? Matiu 25:21, 41.OdU 39.2

    Nchepụta nke mkpụrụ-obi anwụghị-anwụ bụkwaara otu nime ozizi ụgha ndịa nke Rom gbazitere site n’ọnọdụ nke ikpere-arụsị. Martin Luther gụkọrọ ya n’ọnọdụ akụkọ nnabè nēnweghị isi-naọdụ nke sokwa mejupụta mkpumkpu ure-ure nke omen’ala ofufe Rom. Ọ bụ ozizi nke akwụkwọ-nsọ na ndj nwụrụ-anwụ nārarụ-ura ruekwa oge mbilite n’ọnwụ ahụ.OdU 39.3

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents