Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ụbọchị Onye Nwe Anyị

    Onye amụma Aịsaịa sịrị: “N’ ụbọchị ahụ, mmadụ ga-etufu ihe efu ya niile, nke ọla ọcha nke o meere onwe ya iji we kpọ isi ala nye ya, ọ ga-etufu ha nye anụ mole na ụsụ; ka o we ba n’oghere niile nke oke nkume niile dị elu, ịpụ n’iru oke egwu Jehova, n’ịpụ n’ịma mma nke mbili elu Ya, mgbe o biliri ime ka ụwa ma jijiji nke uku. Aịsaịa 2:20, 21. Ndị niile tufuru ihe niile ha nwere n’ihi Kraịst ka echekwara. N’iru ndị ụwa na n’iru ọnwụ, ha egosipụtawo nsọpụrụ ha nwere nye Onye ahụ nwụrụ anwụ n’ihi ha. Iru ha jọrọ njọ, ma ugbu a, ọ na-egbukwa mara mara. Ha naabụ abụ mmeri: “Chineke bụụrụ anyị ebe ngbaba na ike, O mewo ka achọta Ya dị ka Onye inye aka nke uku na nkpagbu niile. N’ihi nke a, anyi agaghị atụ egwu mgbe ụwa na-agbanwe, ma ọ bụ mgbe a na-ewezuga ugwu niile n’ọnọdụ ha gaa n’etiti oke osimiri; mgbe mmiri ya na-agba aghara na-asụkwa ụfụfụ, mgbe ugwu niile na-eme mpkatụ site na mbili elu ya”. Abụ Ọma 46:1-3.OdU 90.2

    Dika okwu ndị nsọ na-eru Chineke ntị, ebube nke ihe dị n’eluigwe na-asọpụta n’ọnụ ụzọ ama ghere oghe dịka mmiri. Mgbe ahụ a ga-ahụ aka si n’eluigwe ji mbadamba nkume abụọ apịakọtara ọnụ. Iwu ahụ dị nsọ, ezi omume nke Chineke nke e ji egbe eluigwe na oke ire ọkụ we nye na Sinaị, dịka ihe nduzi nke ndụ a, ka ekpughere nye mmadụ dị ka ụkpụrụ a ga-eji kpee ikpe. Aka a wee meghe mbadamba okwute abụọ ahụ, e wee hụ iwu iri ahụ nke yiri ihe e ji ihe dika mkpịsị ọkụ were dee. Okwu a doro anya nke uku na onye ọ bụla pụrụ ịgụ ya. Akọ n’uche nke mmadụ we bụrụ ihe akpalitere, ọchịchịrị nke sitere n’obi kwere na chi ndị ọzọ na abụghị Chineke ka ewezugara. Iwu iri nke Chineke, na ike na ebube ya ka emere ka ọ pụta ihe nye mmadụ dum ndị bi n’elu ụwa. OdU 90.3

    Ọ bụghị ihe a pụrụ ịkọwa bụ ọnọdụ ndị zọrọ iwu Chineke ụkwụ ga-anọ. Chineke nyere ha iwu Ya, bụ ihe ha gaara eji We tulee akparamagwa ha we kọta ọrụrụ ha mgbe ohere nke nchegharị na mgbanwe ka dị. Kama nke a, n’ihi inweta iru ọma nke ụwa, ha wezugara n’akụkụ ha ụkpụrụ nke Chineke ma kụziekwara ndị ọzọ ka ha jehie. Ha gbalịrị ịrụgide ụmụ Chineke ka ha merụọkwa ụbọchị izu ike Ya. Ugbu a, iwu ahụ nke ha gbara ụkwụ, ka eji we kpee ha ikpe. Ha hụkwara na ha enwekwaghị ngọpụ. Ha ahọrọwo onye ha ga-efe ma kpọọ isi ala nye. “Mgbe ahụ ka unu ga-alọghachi, we chọpụta ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye ajọ omume, n’etiti ndi na-efe Chineke na ndị na anaghị efe ya” Malakaị 3:18. OdU 91.1

    Mgbe oge gasịrị, ha we chọpụta na Ụbọchị izu ike Chineke bụ akara Chineke dị ndụ. Mgbe oge gasịkwara, ha we hụ na ha naatọ ntọala ụlọ ha n’elu aja. Ha nọrị na-aluso Chineke ọgụ. Ụfọdị ndị nkuzi nke okwu Chineke na-edu ụmụ mmadụ ba n’ahụhụ ebighi ebi, ebe ha na-eche na ha na-edu ha ị garu Paradaịz ahụ. Ọ bụ nanị n’ụbọchị ikpeazụ ka elu ụwa dum ga-amata oke ọlụ nke dịịrị ndị edowere n’ọkwa dị nsọ na oke ihe egwu nke na-esochi ekwesighị ntụkwasị obi ha.Ọ bụ nanị na ndụ ebighi ebi ka anyị pụrụ ịghọta ọ bụladị ọnwụ nke otu mpụrụobi nke onye ajọ omume. Ihe dị oke egwu ga-abụ ịla n’iyi nke onye ahụ nke Chineke ga-asị, si n’iru m pụa, gị ajọ oru.OdU 91.2

    Anụrụ olu Chineke ka Ọ na-ekwu ụbọchị na awa Jisọs gaabịa. Isrel nke Chineke guzoro na-aña ntị, iru ha jupụtara n’ebube Ya. Ngwa ngwa, ewe hụ na ọwụwa anyanwụ, ihe ojii dị nta n’eluigwe ojii. Nke a bụ igwe ojii kpuchiri Onye Nzọpụta. Na emeghị mkpatụ ọ bụla, ndị nke Chineke we na-ele anya ka Ọ naabịaru nso, tutu ruo mgbe ọ ghọrọ igwe ojii ọcha dị uku, dịka ọkụ na-ere ere, n’elu ya bụ eke na ogwurugwu nke ọgbụgba ndụ. Ma ugbu a, ọ bụghịkwa “mmadụ na-eru uju”, Jisọs na-aga dịka Onye mmeri. Ndị mmụọ ozi nke a na-apụghị ịgụta ọnụ, sokwa Ya, “puku iri, ụzọ puku iri, nakwa ọtụtụ puku a na-apụghị ịgụta ọnụ.” Anya niile ga-ahụ Ọkpara na-enye ndụ. Okpu eze ebube dị na egedege iru Ya. Igbu mara mara Ya dịka nke anwụ. “O nwekwara aha edekwasịworo n’elu uwe Ya na n’elu apataụkwụ Ya, EZE kachasị NDỊ EZE nile” Nkpughe 19:16.OdU 92.1

    Eze ndi Eze ewe si n’igwe ojii rịdata, were ọkụ na-ere ere kpuchie onwe Ya. Ụwa we mee mkpatụ n’iru Ya. Gburugburu Ya ka ifufe na-efesikwa ike nke uku. Ọ na-akpọ elyigwe nke dị n’elu oku, na-akpọkwa ụwa, ka o we kpee ndị Ya ikpe” Abụ Ọma 50: 3, 4.OdU 92.2

    “Ndị eze nke ụwa, na ndị amadị, na ndị isi ọchị agha, na ndị ọgaranya, na ndị dị ike, na oru ọ bụla, na onye ọ bụla nweere onwe ya, we zobe onwe ya n’ìme ọgba na n’ime oke nkume nke ugwu; ha na-asịkwa ugwu na oke nkume ahụ, Dakwasịnụ anyị, zopu anyi n’iru Onye ahụ nke nanọkwasị n’oche eze ahụ, zopukwa anyị n’iwe nke Nwa Atụrụ ahụ, n’ihi na oke ụbọchị nke iwe ha abịawo; onye pụkwara iguzo?” Nkpughe 6:15-17.OdU 92.3

    Ime ihe ọchị akwụsiwo. Emechiwo okwu ụgha. O nweghị ihe ọzọ a ga-anụ ma ọ bụghị ikpe ekpere na iri uju. Ndị ọjọọ naarịọ ka ugwu dakwasị ha karịa ịhụ iru Onye ahụ ha jụrụ ajụ. Ha matara na ọ bụna onye nwụrụ anwụ ga-anụ olu ahụ. Ọtụtụ oge ka olu ahụ ji nwayọ na-akpọ ka ha chegharịa. Oge ụfọdụ a na-anụ olu ahụ site na ndị enyi, nwanne, nakwa Onye Mgbapụta. Olu ndị a na-echeta ịdọ aka na ntị elefuru anya na ọkpụkpọ oku ajụrụ ịza.OdU 92.4

    Ndị a bụ ndị kwara Kraịst emu mgbe a na-eme Ya ihe ihere. O we sị, “site n’ugbu a, unu ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka Ọ na-anọdụ n’aka nri nke ike, na-abịakwa n’eluigwe ojii nile nke eluigwe.” Matiu 26:64. Ugbu a, ha na-ahụ Ya n’ebube Ya; tutu rue mgbe ha ga-ahụ Ya ka Ọ nọdụ n’aka nke ike. Ndị ahụ bụ ndị kwara Ya emo ka ume nke ikwu okwu na-adịkwaghị n’ime ọzọ. A hụkwara Herọd nke mpako jupụtara n’ime, nke kwakwara ị bụ eze Kraịst emo, we nye ndị agha iwu ka ha kpuwe Ya okpu eze nke ịkwa emo. Ha ga-achọkwa ịgbapụ n’iru Ya. Ndị kpọrọ Ya ntu n’aka na ụkwụ ji egwu na ịkwa ụta hụ apa ndị ahụ.OdU 93.1

    N’ụzọ doro anya, ndị nchụ aja na ndị eze chetara ihe nile mere na Kalvarị, mgbe Ekwensu mejupụtara obi ha, ha we sị: “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, Ọ pụghị ịzọpụta onwe Ya” Matiu 27:42. Olu ha we dasie sị, “Kpọgide Ya n’obe!” Nke a gazuru Jerusalem nile, ha we na-asịkwa, “Ọ bụ Ọkpara Chineke!” Ha we chọ ịgbapụ n’iru Eze ndi Eze.OdU 93.2

    Na ndụ ndị nile jụrụ eziokwu nke a, o nwere oge mọ ha gaagwa ha okwu, mgbe akọnuche ha ga-ewelite ndụ iru abụọ ha, mgbe obi ha na-akwakwa mmakwara na-enweghị isi. Gịnị ka nke a bụ ma ewere ya tụnyere ịkwa ụta nke ụbọchị ahụ. N’ime ịtụ egwu ha, ha nụrụ olu ndị nsọ ka ọ na-asị, “Lee Chineke anyị ka nke a bụ, anyị elewo anya Ya, ka anyị tegharịa egwu ọñụ, ñụrịkwa na nzọpụta Ya.” Aịsaịa 25:9.OdU 93.3

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents