Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents

Olileanya Dị Ukuu

 - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Amara Nke Sitere Na Kraịst

    Kraịst na-akụnye iro n’ime mmadụ megide Ekwensu. A sị na amara nke a, nke na-eweta nchegharị adịghị, mmadụ gaara anọgide bụrụ oru nke Ekwensu, onye nọ na njikere ime ọchịchọ ya mgbe nile. Ma ụkpụrụ ọhụụ ahụ, n’ime obi, na-eweta obubu agha; ike ahụ nke Kraịst na-enye na-eme ka mmadụ nwee ike iguzogide onye aka ike ahụ. Ịkpọ mmehie asị kama ịhụ ya n’anya bụ ngosipụta nke mkpụrụ nanị si n’eluigwe bịa. OdU 10.3

    Iro ahụ nke dị n’etiti Kraịst na Ekwensu bụ ihe e gosipụtara n’ụzọ were anya n’otu ụwa si nabata Jisọs. Ịdị ọcha na ịdị nsọ nke Kraịst kpaliri iro nke ndị na-amaghị Chineke megide Ya. Nye ndị mpako na ndị anụ arụ na-achị, ịju onwe onye nke Kraịst bụụrụ ihe na-atụ ha mmehie ha n’anya mgbe nile. Ekwensu na ndị mọ ọjọọ na ndị ajọ mmadụ we jikọta aka megide ọkaka Onye ndu nke eziokwu ahụ. Otu ịkpọ asị ahụ ka e ji na-emegide ndị na-eso ụzọ Kraịst. Onye ọ bụla nke na-emeri ọnwụnwa ga-akpali ọnụma nke Ekwensu. Kraịst na Ekwensu apụghị inwe otu olu. “A gaesogbukwa ndị nịle ndị na-achọ ịdị ndụ n’ụzọ ịsọpụrụ Chineke n’ime Jisọs” (2 Tim 3:12).OdU 10.4

    Ndị na-ejere Ekwensu ozi na-achọ iduhie ndị na-eso ụzọ Kraịst na iji aghụghọ mee ka ha si n’ofufe ha na-enye Ya wezuga onwe ha. Ha na-achịgharị ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ iji mezue ebumnobi ha. Otu mmụọ ahụ nke gburu Kraịst bụkwa ya naakpali ndị ajọ omume ịla ndị na-eso ụzọ Ya n’iyi. Ihe ndị a nile ka obubu amụma mbụ ahụ gbara ama ya na-asị: “iro ka m ga-etinye n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya”.OdU 11.1

    Gịnị mere Ekwensu anaghị ezute nguzogide siri ike? Ọ bụ n’ihi na ndị agha nke Kraịst nwere nanị ihe njikọta dịkarịsịrị nta n’agbata ha na Kraịst. Mmehie adịghị asọ ha oyi dika ọ sọrọ Onye Nwe ha. Ha adịghị eji mkpebi siri ike ezute mmehie. Ha bụ ndị kpuru isi banyere agwa nke onye isi ochịchịrị. Igwe mmadụ amataghị na onye iro ha bụ onye isi agha uku nke na-ebu agha megide Kraịst Ọ buna ndị ozi na ndị na-agbasa ozi ọma naeleghara ihe ndị na-egosi ọlụ ya anya. Ọ dị ka ha ejikwaghị ịdị adị nke Ekwensu kpọrọ ihe ọ bụla.OdU 11.2

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents